Mmerịkọta Anyị na Chineke
Na-agbanyeghị ihe nhụmiihe niile anyị nwere na anụ arụ, anyị nwere ike tụkwasị Chineke obi ma nwee ọńụ nime Ya.
Dịka Job nime Agba Ochie, na oge nke nhụjuanya ụfọdụ nwere ike iche na Chineke ahapụla ha. N’ihi na anyị mara na Chineke nwere ike igbochi mọbụ ịwepụ nhụsianya ọbụla, enwere ike ịnwa anyị imee mkpesa ma ọbụrụ na O meghị ya, ikekwa na ajụ ajụjụ, “Ọ bụrụ na Chineke enyeghị enyemaka m na ekpe ekpere maka ya, kedu ka m ga esi nwee okwukwe na Ya?” N’otu oge nime ọnwụnwa ya niile siri ike, Job onye ezi omume sịrị:
“Mgbe ahụ mara na Chineke emejọla m ma siwokwara m ọnyá Ya gburu gburu.
”Ọ bụ ezie na m na ebe akwa, ‘E mejọwo m!’ A dịghị aza m; ọ bụ ezie na m na akpọ maka enyem aka, ikpe ziri ezi adịghị.”1
Na nzaghachi Ya nye Job, Chineke jụrụ, “Ị ga ama m ikpe ka i wee bụrụ onye ezi omume?”2 Ma ọ bụ na okwu ụzọ ọzọ, “Ị ga etinyekwa m n’ajọọ omume? Ị ga ama m ikpe ka i wee bụrụ onye ziri ezi?”3 Jehovah jiri ike chetara Job maka Ya pụrụ ịme ihe niile na ịma ihe niile, ma Job na ị kasị ịdị umeala n’obi kwere na o nweghị ihe ọbụla gara nso nye ọmụma ihe, ike, na ezi omume nke Chineke ma e nweghị ike iguzo n’ikpe ikpe nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile:
“A mara m na ị nwere ike ime ihe niile,” o kwuru, ”ma na-enweghị echiche enwere ike zoro gị.
“… E kwuru m na aghọtaghị m; ihe niile dịkarịrị m ebube, nke m amataghị. …
“Ya mere A na m akpọ onwe m asị, ma chegharịa na uzuzu na ntụ.”4
Na ikpeazụ, Job nwere ohere ịhụ Onyenwe anyị, ma “Onyenwe anyị gọziri ikpeazụ Job karịa mmalite ya.”5
Ọ bụụrụ anyị ihe nzuzu n’ezie na anya anụ ahụ anyị na-anaghị ahụ ihe dị anya iji chee ikpe Chineke ikpe, iche, na-ọmụmatụ, “obi adịghị m mma, ya mere ọ ga abụrịrị na Chineke na eme ihe ọjọọ.” Nye anyị, ụmụ Ya na anwụ anwụ nime ụwa dara ada, ndị maara ntakịrị nke ihe gara aga, ihe dị ugbu a, na ọdịnihu, Ọ na-ama ọkwa, “Ihe niile na apụta ihé n’iru m, nihi na amaara m ha niile.”6 Jekọb ji amamihe adọ aka na ntị: “Achọla ka unu nye Onyenwe anyị ndụmọdụ, kama chọọ ịnata ndụmọdụ n’aka ya. N’ihi na lee, unu onwe unu matara na Ọ na-enye ndụmọdụ na amamihe, na n’ikpe ziri ezi, na na n’oke ebere, n’ebe ọrụ ya niile dị.”7
Ụfọdụ na aghọtahie nkwa niile nke Chineke na ọpụtara na irubere Ya isi na amịpụta nsonaazụ akọwapụtara na nhazi oge. Ha nwere ike iche, “Ọ bụrụ na m ji ịdị uchu jee ozi mgbasa oziọma n’uju, Chineke ga eji alụm di na nwunye obi ụtọ na ụmụ gọzie m” mọbụ “Ọ bụrụ na m hapụ ịrụ ọrụ ụlọakwụkwọ na Ụbọchị Izu ike, Chineke ga eji ezigbo akara dị mma gọzie m,” mọbụ “Ọ bụrụ na m kwuọ otu ụzọ na ụzọ iri, Chineke ga agọzi m nye m ọrụ ahụ m na achọ.” Ọ bụrụ na ndụ adapụtaghị kpọmkwem otu a mọbụ dị ka usoro ihe omume a tụrụ anya ya si dị, ha nwere ike chee na Chineke rafuru ha. Mana ihe niile adịchaghị otu ahụ na ihe akụ na ụba Chineke. Anyị ekwesịghị iche echiche banyere atụmatụ nke Chineke dị ka igwe na ere ahịa gbasara ụwa ebe anyị (1) na ahọrọ ngọzi a chọrọ, (2) tinye ego achọrọ nke ezi ọrụ niile, na (3) a na ebunye ahịa ahụ atụrụ ozugbo.8
Chineke n’ezie ga-emezu ọgbụgba ndụ na nkwa ya niile nye onye ọbụla nime anyị. Anyị ekwesịghị ichegbu onwe anyị banyere nke ahụ.9 Ike aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst—onye gbadara na okpuru ihe niile ma mesịa wee rigoro n’elu10 na onye nwere ike niile n’eluigwe na n’ụwa11—na-ahụ na Chineke nwere ike ma ga-emezu nkwa Ya niile. Ọ dị mkpa na anyị na-asọpụrụ ma na-erubere iwu nsọ Ya niile isi, kama ọbụghị ngọzi niile gbadoro ụkwụ na irube isi nye iwu12 ka a na akpụzi, emebere, ma nye oge dịka atụmanya anyị siri dị. Anyị na eme ike anyị mana anyị ga ahapụrịrị Ya njikwa nke ngọzi niile, ma nke anụ ahụ ma nke ime mmụọ.
Onyeisi Brigham Young kọwara na okwukwe ya esighị n’ụfọdụ ihe si na ya pụta mọbụ ngọzi niile kama na ịgba ama nke na mmekọrịta ya na Jizọs Kraịst. O kwuru: “A naghị etinye okwukwe m nelu ọrụ nke Onyenweanyị na-arụ n’agwaetiti niile ahụ nke oke osimiri, n’elu ị kpọta ndị mmadụ ebe a, … ọ bụghị kwa amara ọ na-enye ndị nka mọbụ ndị ọzọ, ọbụghị ma agọziri anyị mọbụ na agọzighị anyị, mana okwukwe m ka edobere n’elu Onyenweanyị Jịzọs Kraịst, na ọmụma ihe m nataworo n’aka ya13
Nchegharị na nrube isi anyị, ije-ozi anyị na aja anyị niile bara uru. Anyị chọrọ iso na ndị ahụ Ether kọwara dịka “na anọgide n’ezi ọrụ niile oge niile.”14 Mana ọ bụghị nke ukwuu n’ihi na ụfọdụ talị edowere nime akwụkwọ nkọwapụta niile nke alaeze eluigwe. Ihe ndị a bara uru nihi na ha na etinye anyị n’ọrụ nke Chineke ma bụrụ ụzọ nke anyị na Ya na-eji emekọ ihe nime mgbanwe nke onwe anyị site na ịbụ mmadụ eke ghọọ onye nsọ.15 Ihe Nna anyị nke Eluigwe na enye anyị bụ Onwe Ya na Ọkpara Ya, mmekọrịta chiri anya na nke na adịgide adịgide na Ya site na amara na ogbugbo nke Jizọs Kraịst, Onye Mgbapụta anyị.
Anyị bụ ụmụ nke Chineke, ewepụrụ iche maka anwụghị anwụ na ndụ ebighị-ebi. Akaraka anyị bụ ịbụ ndị nketa Ya niile, “ndị ha na Kraịst ga ekekọta oke.”16 Nna anyị dị njikere idu onye ọ bụla nime anyị nụzọ ọgbụgba ndụ Ya na nzọụkwụ niile e mere maka mkpa anyị n’otu n’otu ma ahaziri ya na atụmatụ Ya maka obi ụtọ anyị na Ya ma emesịa. Anyị nwere ike ịtụ anya ntụkwasị obi na okwukwe na eto eto nebe Nna na Ọkpara ahụ, mmetụta ịhụnanya Ha na abawanye, na nkasi obi na nduzi nke Mmụọ Nsọ na adigide.
Ọbụla otua, ụzọ nke a enweghị ike ịdịrị onye ọbụla nime anyị mfe. Enwere nnukwu nnụcha a chọrọ maka ya ịdị mfe. Jizọs kwuru:
“Abụ m ezi osisi vine, ma Nna m bụ onye ọrụ ubi.
“Alaka ọbụla dị nime m nke na amịghị mkpụrụ [Nna ahụ] na ewepụ: ma alaka ọ bụla nke na amị mkpụrụ, ọ na eme ka ọ dị ọcha, ka o wee mịtakwuo mkpụrụ.”17
Usoro nke Chineke duziri ime ka uche nwee ọsịsa na nsachapụ, nụzọ dị mkpa, na agbawa ma na egbu mgbu mgbe ụfọdụ. Na icheta okwu Pọl, anyị na “ Kraịst bụ ndị nketa oke; ọ bụrụ kwa na anyị na ya na ata ahụhụka e wee nyekọta kwa anyị otuto.”18
Ya mere, n’etiti ọkụ nke onye nnụcha a, kama iweso Chineke iwe, biakwute Chineke nso. Kpọkuo Nna n’aha nke Ọkpara ahụ. Soro Ha na ejegharị nime Mmụọ, kwa ụbọchị . Hapụ Ha ka oge na-aga ka ha gosi gị ntụkwasị obi Ha nye gị. Bia mara Ha n’ezie ma mara onwe gị n’ezie.19 Ka Chineke merie.20 Onye Nzọpụta na amasi anyị obi ike:
“Gee ntị nye ya onye bụ onye-nkwuchita ọnụ n’ebe Nna nọ, onye na-arịọtara unu n’ihhu ya—
“Na asi: Nna, lee ahụhụ niile na onwu nke onye ahụ na emeghị njọ ọbụla, onye nke ihe ya na amasi; lee obara Ọkpara gị nke awusara, obara nke onye ahụ ị mere ka eji nye gị otịto;
Ya mere, Nna, gbaghara umunne m ndị nwoke ndị a [na ụmụnne m nwanyị] ndị kwere n’aha m, ka ha wee bịakwute m ma nweta ndụ mgbe niile na-adịgide.21
Tulee ụfọdụ ịma-atụ niile nke ndị nwoke na nwanyị nwere okwukwe ndị tụkwasịrị Chineke obi, obi siri ike na ngọzụ Ya niile ekwere na nkwa ga-abịakwasị ha na ndụ mọbụ n’ọnwụ. Okwukwe ha dabere na ọbụghị ihe Chineke mere mọbụ emeghị na otu ọnọdụ mọbụ oge kama na ịmata Ya dịka Nna ha nwere obi ebere na Jizọs Kraịst dịka onye mgbapụta ha kwesịrị ntụkwasị obi.
Mgbe onye nchụaja Ijipt nke Elkanah na achọ ịchụ Abraham naja, ọ kpọkuru Chineke ka Ọ zọpụta ya ma Chineke mere ya.22 Abraham biri ndụ ma bụrụ nna nke ndị kwesịrị ntụkwasị obi site na mkpụrụ ya ka agbụrụ niile nke ụwa onye e sitere na mkpụrụ ya gọzie ezinaụlọ niile nke ụwa.23 Na mbụ, n’elu otu ebe ịchụájá nke a, onye nchụájá ahụkwa jiri ụmụ agbọghọ atọ ndị na amaghị nwoke chụọ aja ndị “nihi ezigbo omume ha … enweghị ike ịkpọ isi ala ife chi niile nke osisi mọbụ nke nkume.”24 Ha nwụrụ n’ebe ahụ dịka ndị nwụrụ na okwukwe.
Josef nke oge ochie, e rere ka ohu mgbe ọ bụ nwa okorobịa site n’aka ụmụnne ya nwoke, nime mkpagbu ya kpọkuo Chineke. Nwayọ nwayọ, o welitere isi nụlọ onyenwe ya nime Ijipt kama mgbe ahụ ka ewepụrụ ọganihu ndị a nihi ebubo ụgha nke nwunye Potiphar. Josef gara eche, “Ya bụ ụlọ mkpọrọ bụ ihe m ketara maka idobe iwu nke ịdị ọcha,” Kama ọ gara nihu na-atụgharị gakwuru Chineke ma nwee ọganihu ọbụna nụlọ mkpọrọ. Josef nwetara ndakpọ olileanya ọzọ mgbe onye mkpọrọ o mere enyi, agbanyeghị nkwa okwere Josef, chefuru ihe niile gbasara ya mgbe eweghachiri ya na ọnọdụ ya nime obi nke Pharaoh. Ka a na-eme, dịka unu mara, Onyenweanyị tinyere aka tinye Josef na ọnọdụ ntụkwasị obi na ike kasị elu sotara Pharaoh, na-enyere Josef aka ịzọpụta ụlọ nke Izrel. Nezie Josef inwere ike gbaa akaebe “na ihe niile na arụkọ ọrụ iwetara ndị hụrụ Chineke n’anya ezi ihe.”25
Abinadi bu n’obi ịrụzu ọrụ Chineke ya. “E zichawo m ozi m,” ọ sịrị, “ma mgbe ahụ ọ dịghị kwa mkpa [ihe ga-eme m], ma ọbụrụ na a zọpụtawo m.”26 Ọ gbanarịghị ọnwụ onye nwụrụ niihi okwukwe, ma n’ezie a zọpụtara ya n’alaeze nke Chineke, ma otu onye chegharịrị dị oké ọnụ ahịa, Alma, gbanwere usoro agụgụala nke ndị Nifaị dugara ruo ọbịbịa nke Kraịst.
A napụtara Alma na Amulek nụlọ mkpọrọ na Ammonihah na aziza nye arịrịọ ha, ma e gburu ndị na akpagbu ha.27 Na mbụ, otu osila dị, ndị mkpagbu a kwa atụbawo ndị inyom na ụmụaka ha ndị kwere ekwe nime ọkụ na ere ere. Alma, na-ahụ ọnọdụ ahụ jọgburu onwe ya na nhụju anya, ka a manyere site na mmụọ ka ọ ghara iji ike nke Chineke “ị zọpụta ha site n’ire ọkụ ahụ,”28 ka anabata ha n’elu nye Chineke n’otuto.29
Onye amụma Josef Smit tara ahụhụ n’ụlọ mkpọrọ na Liberty, Missouri, enweghị ike inyere Ndị nsọ aka ka a napụrụ ihe ha n’ike ma chụpụ ha site n’ebe obibi ha nime oké oyi nke winta. “O Chineke, o lee ebe i nọ?” Josef bere ákwá. “Ruo ole mgbe ka aga edebe aka gị ?”30 Na nzaghachị, Onyenweanyị kwere nkwa: “Ihe isi-ike gị na nsogbu niile ga abụ maka nwa oge nta; ma mgbe ahụ, ọ bụrụ na ị nagide ya nke ọma, Chineke ga ebuli gị elu. … Ị dịbeghị ugbụ a ka Job.”31
N’ikpeazụ, Josef nwere ike maa ọkwa dị ka Job, “Na-agbanyeghị na [Chineke] gburu m, mana m ga-atụkwasị Ya obi.”32
Okenye Brook P. Hales kọrọ akụkọ nke Nwanne nwanyị Patricia Parkinson onye amụrụ na ahụ ụzọ nke ọma mana ka ọ na erula afọ 11 kpuo ísí.
Okenye Hales kọrọ: “A maarala m Pat kemgbe ọtụtụ afọ ma gwa ya n’oge adịbeghị anya na enwere m mmasị na ọ na enwe olileanya na obi ọma mgbe niile. Ọ zara, “Ọ dị mma, i sobeghị m nọrọ n’ụlọ, ị nọọ la? E nwere m oge m niile. E nweela m oké ịda mbá n’obi, ma akwawokwa m akwa nke ukwuu. Otu osila dị, ọ gbakwụnyere, Site na mgbe m bidoro i kpu isi, ọ dị ịtụnanya, mana a mara m na Nna nke Eluigwe na Onye nzọpụta nọnyeere ezinaụlọ m na mụ. … Nye ndị na ajụ m ma iwe ọ na ewe m nihi ahụghị ụzọ m, ana m aza, ‘O lee onye m ga ewesa iwe? Nna nke Eluigwe nọ na nke a mụ na ya; ọ bụghị naanị m kwụ. Ọ nọnyeere m oge niile .’”33
N’ikpeazụ, ọ bụ ngọzi nke mmekọrịta chiri anya na nke na adịgide adịgide nke gị na Nna na Ọkpara ahụ ka anyị chọrọ. Ọ na eme ihe niile dị iche ma na akwụ ụgwọ ya ruo mgbe ebighi ebi. Anyị na Pọl ga agba ama “na ahụhụ niile nke oge dị ugbua [na anụ ahụ] ekwesịghị ihe eji atụnyere ebube ahụ bụ nke a gaje ikpughe niime anyị.”34 A na m agba ama na na-agbanyeghị ihe nhụmiihe anyị nwere na anụ ahụ ga-apụta, anyị nwere ike tụkwasị Chineke obi ma nwee ọńụ nime Ya.
“Tụkwasị obi na Onyenwe anyị jiri obi gị niile; ma adaberekwala na nghọta nke onwe.
”N’ime ụzọ gị niile kwupụta Ya, ma ọ ga-atụziri gị aka n’ụzọ gị niile.”35
N’aha nke Jizọs Kraịst, amen.