Ọgbakọ Zuru ọha
“Mgbe Ahụ Ka M Ga-eme Ihe ndị Na-adịghị Ike Dịrị Ike”
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2022


11:59

“Mgbe Ahụ Ka M Ga-eme Ihe ndị Na-adịghị Ike Dịrị Ike”

Dịka anyị na-eweda onwe anyị ala ma nwee okwukwe na Jizọs Kraịst, amara nke Kraịst na aja mgbaghara mmehie Ya na-enweghị ngwụcha na-eme ka anyị gbanwee.

Onyeisi Thomas S. Monson otu oge kọrọ akụkọ nke onye nlekọta ndị mkpọrọ Clinton Duffy. “Nʼime afọ niile nke 1940 na 1950, [Onye nlekọta ndị mkpọrọ Duffy] bụ onye amaara nke ọma maka mgbalị ya niile nye mgbanwe ndị ikom nọ nime ụlọ mkpọrọ ya. Otu onye nkatọ kwuru, ‘I kwesịrị ịma na agụ anaghị agbanwe ntụpọ ha niile!ʼ

“Onye nlekọta ndị mkpọrọ Duffy zara, ‘Ị kwesịrị ịma na mụ na agụ anaghị arụkọ. Mụ na ndị mmadụ na arụkọ, ma ndị mmadụ na-agbanwe ụbọchị ọbụla.’”1

Otu ụgha nke Setan kachasị bụ na ndị ikom na ndị iyom enweghị ike agbanwe. Ụgha nke a ka a na-akọ ma na-akọgharị na ọtụtụ ụzọ niile dị iche iche dị ka ụwa na-ekwu na anyị enweghị ike agbanwe—mọbụ nke ka njọ, na anyị ekwesịghị ịgbanwe. A kuziiri anyị na ọnọdụ anyị niile na-akọwa anyị. Anyị kwesiri “ị nabata onye anyị bụ nʼezie,” ụwa na ekwu, “ma bụrụ eziokwu nye onwe anyị nʼezie.”

Anyị Nwere ike Ịgbanwe

Ebe ọ dị mma nʼezie ịbụ ezi mmadụ, anyị kwesịrị ịbụ ezi mmadụ nye ezi, onwe anyị dịka ụmụ ndịikom na ụmụ ndịinyom nke Chineke jiri ọdịdị dị nsọ na akara aka ịdị ka Ya.2 Ọ bụrụ na ebumnobi anyị bụ ịbụ eziokwu nye ọdịdị dị nsọ na akara aka, mgbe ahụ anyị niile kwesịrị ịgbanwe. Okwu nke akwụkwọ nsọ maka mgbanwe bụ nchegharị. “Ọtụtụ ndị mmadụ,” Onyeisi Russell M. Nelson na-akuzi, ”weere nchegharị dị ka ntarama ahụhụ—ihe ekwesịrị ize eze ma ọbụla naanị n’ọnọdụ dị oke mkpa. … Mgbe Jizọs gwara mụ na gị ka anyị ‘chegharịa,’ Ọ na-akpọ anyị okú ka anyị gbanwee.”3

Ọnọdụ niile nke Chineke

Ndị mebere ngwa ọrụ kọmputa na-eji nkwupụta ọnọdụ niile agwa kọmpụta ihe ọ ga-eme. A na-akpọ ihe ndị a mgbe ụfọdụ ka ọ bụrụ mgbe ahụ mkwupụta niile. Dị ka na, ọbụrụ na x bụ eziokwu, mgbe ahụkwa y.

Onyenweanyị na-arụkwa ọrụ site na ọnọdụ niile: ọnọdụ niile nke okwukwe, ọnọdu nile nke eziomume, ọnọdu nile nke nchegharị. E nwere ọtụtụ ihe ịmaatụ nke okwu ọnọdụ niile sitere na Chineke dị ka:

Ọbụrụ na ị debe iwu nsọ m niile ma nọgide ruo ọgwụgwụ [mgbe ahụ] ị ga-enwe ndụ ebighi ebi, nke bụ onyinye nke kachasị ukwuu n’onyinye niile nke Chineke.”4

Mọbụ “ọbụrụ na unu ga-eji ezigbo obi, jiri ezigbo ebumnobi, na-enwe okwukwe nʼime Kraịst, [mgbe ahụ] ọ ga-egosipụta eziokwu maka ya nye unu, site nʼike nke Mmụọ Nsọ.”5

Ọbụna ịhụnaanya nke Chineke, ọ bụ nʼezie na-enweghị ngwụcha na zuru oke, dịkwa na okpuru ọnọdụ niile.6 Maka ọmụmaatụ:

Ọbụrụ na ị dobe iwu nsọ m niile, [mgbe ahụ] ị ga-anọgide nʼịhụnaanya m, ọbụna dị ka M debeworo iwu nsọ nke Nna m, ma nọgide nʼịhụnaanya ya.”7

Okenye D. Todd Christofferson kọwakwuru eziokwu ozi ọma a mgbe ọ kuziri: “Ụfọdụ agaghị ekwu, Onye nzọpụta hụrụ m nʼanya dị ka m dị,’ ma nke ahụ bụ eziokwu. Mana Ọ nweghị ike ịkpọrọ onye ọbụla nʼime anyị banye na alaeze Ya dị ka anyị dị, ʼnʼihi na ọ dịghị ihe rụrụ arụ nwere ike ibi ebe ahụ, mọbụ ibi nʼihu yaʼ[Moses 6:57]. A ghaghị ibu ụzọ dozie mmehie anyị.”8

Ihe ndị Na-adịghị Ike Nwere Ike Dịrị Ike

Ngọzi nke ịnata ike nke Chineke iji nyere anyị aka ịgbanwe bụkwa nke a kwadoro. Onye nzọpụta, na-ekwu okwu site nʼọnụ onye amụma Moronaị dị nʼime Akwụkwọ nke Mọmọn, kuziri: “Ọbụrụ na ndị mmadụ bịakwute m aga m egosị ha adịghị ike ha niile. Ana m enye ndị mmadụ adịghị ike ka ha wee dị umeala, ma amara m zuru oke maka ndị mmadụ niile nke dị umeala nʼihu m; n’ihi na ọbụrụ na ha dị umeala nʼihu m, ma nwee okwukwe na m, mgbe ahụ ka m ga-eme ihe ndị na-adịghị ike ka ha dịrị ike nye ha.”9

Na ilerukwu anya nʼihe Onyenwe anyị na-akuziri anyị ebe a, anyị hụrụ na O bu ụzọ kwuo na Ọ na-enye ndị nwoke na nwanyị adịghị ike, otu otu, nke bụ akụkụ nke ahụmihe nke anụ ahụ anyị dị ka ndị dara ada mọbụ ndị anụ ahụ. Anyị aghọwo ndị ikom na ndị inyom okike nʼihi Ọdịda nke Adam. Mana site na Aja Mgbahara Mmehie nke Jizọs Karịst, anyị nwere ike imeri adịghị ike anyị niile mọbụ ọdịdị okike anyị niile.

O wee mgbe ahụ sị na amara Ya zuru oke ma ọbụrụ na anyị ga-eweda onwe anyị ala ma nwee okwukwe na Ya, mgbe ahụ Ọ “ga-eme ihe niile [karịrị otu] adịghị ike dị ike nye [anyị].” Nʼikwu ya nʼụzọ ọzọ, dị ka anyị na-ebu ụzọ gbanwee ọdịdị anyị dara ada, adịghị ike anyị niile, mgbe ahụ anyị ga-enwe ike ịgbanwe agwa anyị, adịghị ike anyị niile.

Ihe ndị achọrọ nke Mgbanwe

Ka anyị nyochaa ihe ndị a chọrọ ka anyị gbanwee dị ka ụkpụrụ nke Onyenwe anyị sịrị dị:

Nke mbụ, anyị ga-ewedarịrị onwe anyị ala. Ọnọdụ nke Onyenwe anyị maka mgbanwe bụ ịdị umeala nʼobi. “Ọbụrụ na ha dị umeala nʼihu m,”10 O kwuru. Ihe megidere nke ịdị umeala bụ mpako. Mpako na dị mgbe anyị chere na anyị maara karịa—Mgbe ihe anyị chere mọbụ mmetụta anyị na-ebute ụzọ karịa ihe Chineke chere mọbụ mmetụtara.

Eze Benjamin kuziri na “n’ihi na mmadụ nke ụdị okike bụ onye iro Chineke, … ma ga-abụ, ruo mgbe niile na mgbe niile, ma ọbụghị ma o … wepụrụ ịbụ mmadụ nke anụ ahụ ma ghọọ onye nsọ site n’aja mgbaghara mmehie nke Kraịst Onyenwe anyị, ma dịrị ka nwata, na-adanye, dị nwayọ, [ma] nwe obi umeala.”11

Iji nwee ike ịgbanwe, anyị kwesịrị iyipụ mmadụ nkịtị ma dịrị umeala nʼobi ma na-edo onwe anyị nʼokpuru. Anyị ga adịrịrị umeala nʼobi iji soro onye amụma dị ndụ. Ịdị umeala nʼobi zuru oke ime ma dobe ọgbụgba ndụ niile nke tempụl. Ịdị umeala nʼobi zuru oke ichegharị kwa ụbọchị. Anyị ga-adịrịrị umeala nʼobi zuru oke ịchọ ịgbanwe, ị “inyefe Chineke obi anyị niile.”12

Nke abụọ, anyị ga-enwerịrị okwukwe nʼime Jizọs Kraist. Ọzọ, okwu niile nke Onye nzọpụta: “ọbụrụ na ha dị umeala nʼihu m, ma nwee okwukwe na m,”13 Ọ ga enye anyị ike imeri adịghị ike anyị niile. Ịdị obi umeala, tinyere okwukwe na Jizọs Kraịst, ga-ekwe ka anyị nweta ike nke Amara Ya nʼuju na ngọzi niile dị nʼihi Aja mgbaghara mmehie Ya.

Onyeisi Nelson kuziri na “ezigbo nchegharị n’ebido n’inwe okwukwe na Jizọs Kraist nwere ike iji sachapụ, gwọ ma gba anyị ume. … Ọ bụ okwukwe anyị na-agbahe ike nke Chineke nʼime ndụ anyị niile.”14

Nke atọ, site na amara Ya O nwere ike mee ihe niile nke n’esighị ike sie ike. Ọbụrụ na anyị eweda onwe anyị ala ma nwee okwukwe na Jizọs Kraịst, mgbe ahụ amara Ya ga-eme ka anyị gbanwee. Nʼikwu ya nʼụzọ ọzọ, Ọ ga-enye anyị ike ịgbanwe. Nke a ga-ekwe omume nʼihi na, dị ka O kwuru, “amara m zuru ezu nye mmadụ niile.”15 Amara mgbam ume Ya nʼenye ike na-enye anyị ike imeri ihe mgbochi niile, aka mgba niile, na adịghị ike niile dị ka anyị na-achọ ịgbanwe.

Adịghị ike anyị niile kachasị ukwuu nwere ike bụrụ ihe ndị kacha ike nye anyị. Anyị nwere ike gbanwee ma “ghọọ ndị e kere ọhụrụ.”16 Ihe ndị na-adịghị Ike nwere ike “ịdị ike nye [anyị].”17

Onye nzọpụta rụpụtara Aja mgbghara mmehie Ya na-enweghị ngwụcha na ebighi ebi ka anyị nwee ike ịgbanwe nʼezie, chegharịa, ma wee dị mma karịa. Anyị nwere ike bụrụ ndị amụrụ ọzọ. Anyị nwere ike imeri agwa niile, ihe mmara ahụ niile, ma ọbụna ọchịchọ ime ihe ọjọọ,”18 Dị ka ụmụ ndịikom na ụmụ ndịiyom nke Nna nke Eluigwe hụrụ anyị nʼanya, anyị nwere ike nʼime anyị ịgbanwe.

Ihe ịmaatụ niile nke Mgbanwe

Akwụkwọ nsọ jupụtara na ọtụtụ ọmụmaatụ nke ndị nwoke na ndị nwanyị ndị gbanwere.

Saul, onye Farisii na onye na-akpagbu nzukọ nsọ nke Kraịst iisimbụ,19 ghọrọ Pọl, Onye ozi nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.

Alma bụụrụ onye nchụaja nʼụlọ ikpe nke ajọọ Eze Noa. Ọ nụrụ okwu niile nke Abinadi, chegharịa kpam kpam ma ghọọ otu nʼime nnukwu ndị mgbasa ozi ọma nke Akwụkwọ nke Mọmọn.

Nwa ya nwoke Alma tinyere oge ntoroọbịa ya na-achọ ibibi Nzukọ nsọ. Ọ bụ otu nʼime “ndị mmehie kachasị njọ”20 ruo mgbe ọ gbanwere obi ya ma ghọọ onye mgbasa ozi ọma dị ike nʼaka nke ya.

A nabatara Moses ka ọ bụrụ onye ezi na ụlọ nke Fero ma zụlịte ya dị ka nwaeze Ijipt. Mana mgbe ọ bịara ghọta onye ọ bụ nʼezie ma wee mụta maka ọdịniihu ya dị nsọ, ọ gbanwere ma ghọọ nnukwu onye amụma na-enye iwu nke Agba Ochie.21

Nna nna nwunye m James B. Keysor na-amasị m mgbe niile site na nnukwu mgbanwe nke obi ya.22 A mụrụ site na ndị Nsọ Ụbọchị Ikpeazụ kwesịrị ntụkwasị obi sụrụ ụzọ nʼime ndagwurugwu Salt Lake na afọ 1906, nne ya nwụrụ mgbe ọ dị obere ma ọ gbasiri mbọ ike nʼoge ntoroọbịa ya. Afọ niile nke afọ iri na ụma ya na ndị nke okenye ya ka o biri nʼabụghị n’ime Nzukọ nsọ, nʼoge ahu ọ malitere agwa ọjọọ dị iche iche. Nʼagbanyeghị, o zutere ma lụọ otu nwanyị nwere okwukwe, ma ha zụọ ụmụ ise ọnụ.

Nime afọ 1943, na esochi afọ ndị siri ike nke Oke Ịdamba Nʼobi na nʼoge Agha Ụwa II, Bud, dị ka ndị enyi na ezinaụlọ si akpọ ya, hapụrụ Utah ma ga Los Angeles, California, ị chọta ọrụ. Nʼoge a ọ pụrụ nʼụlọ, o binyere nwanne ya nwanyị na di ya, onye na-eje ozi dị ka Bishọp ngalaba ukwu ha.

Site nʼịhụnanya nke nwanne ya nwanyị na ọgọ ya nwoke, ọ malitere ịtụte mmasị ya na Nzukọ nsọ ma bidokwa ịgụ Akwụkwọ nke Mọmọn kwa abalị tupu ya ehiwe ụra.

Otu abalị, ka ọ na-agụ nʼime Alma isi nke 34,o metụrụ ya nʼobi ka ọ na-agụ okwu ndị a:

“Ee, ọ ga-adị m mma na unu ga-abịarute ma ghara imesi kwa obi unu ike ọzọ. …

“N’ihi na lee, ndụ nke a bụ oge ahụ dịrị ndị mmadụ ịkwadobe ijekwuru Chineke; ee, lee ụbọchị nke ndụ nke a bụ ụbọchị dịrị ndị mmadụ iji rụọ ọrụ ha niile.”23

Ka ọ na-agụ amaokwu ndị a, mmetụta dị ike bịakwasịrị ya ma ọ mara na ọ ghaghị ịgbanwe, chegharịa, ma ọ maara ihe ọ ga emerịrị. O si nʼakwa ya bilie ma sekpụrụ ala ma bido ikpe ekpere, na-arịọ Onyenwe anyị ka ọ gbaghara ya ma nye ya ike ọ chọrọ iji mee mgbanwe na ndụ ya. A zara ekpere ya, ma site nʼoge ahụ gaanihu, o leghị anya nʼazụ. Bud garaniihu jee ozi nʼime Nzukọ nsọ ma nọgide na ịkwesị ntụkwasị obi, Onye nsọ Ụbọchị Ikpeazụ ruo ọgwụgwụ nke ndụ ya. Ọ gbanwere nʼụzọ ọbụla. Uche ya, obi ya, omume ya niile, ọdịdị ya gbanwere.

Ụmụnne ndị nwoke na nwanyị, akara aka na ebumnobi dị nsọ anyị bụ ịmecha dị ka Nna anyị nke Eluigwe na Onye-nzọpụta, Jizọs Kraịst. Anyị na-eme nke a dị ka anyị na-agbanwe mọbụ chegharịa. Anyị na-anata onyinyo nke Onye Nzọpụta ahụ nʼime mbara ihu [anyị].”24 Anyị na-adị ọhụrụ, dị ọcha, dị iche iche, ma anyị na-anọgide na-arụ ọrụ na ya kwa ụbọchị. Mgbe ụfọdụ o nwere ike ịdị ka nzọụkwụ abụọ nʼihu na otu nzọụkwụ nʼazụ, mana anyị na-aga nʼihu na okwukwe.

Ma dịka anyị na-eweda onwe anyị ala ma nwee okwukwe na Jizọs Kraịst, amara nke Kraịst na aja mgbaghara mmehie Ya na-enweghị ngwụcha na-eme ka anyị gbanwee.

A na m agba ama na agba akaebe na Jizọs Kraịst bụ nʼezie Onye Nzọpụta na Onye mgbapụta anyị. Amara Ya nʼezie zuru ezu. Ana m ama ọkwa na “Ọ bụ ụzọ ahụ, eziokwu ahụ, na ndụ ahụ,”25 N’aha nke Jizọs Kraịst, amen.