Nkuzi niile n’ebe Olulu mmiri
Anyị nwere ike tụgharịa ruo Onye Nzọpụta anyị maka ume na ọgwụgwọ nke ga-enye anyị ike iji mee ihe niile nke e zitere anyị ebe a ime.
Ụdị ọńụ ọ bụ mụ na onye ọbụla n’ime unu ịgbakọta na nzukọ nke Ụmụnwanyị nke ọgbakọ zuruọha nke a.
Etolitere m na ọdịda anyanwụ nke New York ma a gara m obere ngalaba nta nke Nzukọ nsọ ihe ruru maịlụ 20 (32 km) site n’ebe obibi m. Dị ka m nọdụrụ ọdụ na klas Ụlọakwụkwọ Sọnde n’okpuru ụlọ ụlọ ụka ochie akwụrụ ụgwọ biri naanị mụ na enyi m Patti Jo, enweghị mgbe m chere nnọọ ịbụ akụkụ nke nwanne nwanyị gburugburu ụwa nke ijeri ụmụnwanyị.
Afọ ise gara aga di m, Bruce, bịara daa ọrịa siri ike mgbe anyị naara eje ozi anyị na Ndị nsọ nyefechasịrị n’ime Mpaghara Ọwụwa anyanwụ Europe. Anyị lọghachịrị n’ebe obibi, ma ọ nwụrụ naanị izu ụka ole ma ole gasịrị. Ndụ m gbanwere na ntabianya. A naara m eru uju ma nwee mmetụta adịghị ike ma egwu bara m n’ahụ. Arịọrọ m Onyenwe anyị iduzi ụzọ m: “Gịnị ka Ị ga-achọ ka m mee?”
Izu ụka ole ma ole gafere, a naara m ele meelụ m mgbe otu obere foto dị na katalọgụ bara m n’anya. Dị ka m lere anya nso, a bịara m mata na ọ bụ ngosipụta nke omee nka nke nwanyị Samerịa ya na Jizọs n’ebe olulu mmiri ahụ. N’oge ahụ Mmụọ gwara m okwu dị mfe nghọta: “Nke ahụ bụ ihe i kwesịrị ime.” Nna nke Eluigwe dị ụhụnaanya nọọrọ na-akpọku m ịbịakwute Onye Nzọpụta ma mụta.
Ọ ga-amasị m ikesara unu nkuzi atọ ndị m na-amụ dị ka m na-aganiihu na-ańụ site na olulu mmiri Ya nke “mmiri nke ndụ.”1
Nke mbụ: Ọnọdụ Anyị Gara aga na nke Ugbua Anaghị Ekpebi Ọdịniihu Anyị
Ụmụnne nwanyị, ama m na ọtụtụ n’ime unu n’enwe mmetụta dị ka m nwere, ejighi n’aka otu esi ezute aka mgba na nfunahụ siri ike—nfunahụ n’ihi ndụ gị anaghị apụta ihé n’ụzọ i chekubere maka, kpewo ekpere maka, ma tụọ atụmatụ maka.
N’agbanyeghị ọnọdụ anyị, ndụ anyị dị nsọ ma nwee mpụtara na nzube. Onye ọbụla n’ime anyị bụ nwaada nke Chineke ahụrụ n’anya, a mụrụ nwere chi n’ime mkpụrụ obi anyị.
Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, site n’aja mgbaghara mmehie Ya, mere ya adị ire ịsacha ma gwọọ anyị, n’enye anyị ike imejupụta ebumnobi anyị n’elu ụwa n’agbanyeghị mkpebi niile nke ndị ezi na ụlọ, ọnọdụ ọlụlụ anyị, ahụike nke anụ ahụ na nke uche, ma ọ bụ ọnọdụ ọbụla ọzọ.
Tulee nwanyị ahụ nọ n’ebe olulu mmiri. Gịnị ka ndụ ya dị ka? Jizọs ghọtara na o nwewo ndị di ise ma nwoke ahụ ya na ya bi n’oge ahụ alụghị alụ. Ma, n’agbanyeghị ihe isi ike niile nke ndụ ya, otu n’ime nkwupụta ọha niile nke mbụ nke Onye Nzọpụta na Ọ bụ Mezaya bụ maka ya. Ọ kwuru, “Mụ onwe n’ekwuru gị a bụ m ya.”2
Ọ bịara bụrụ onye akaebe siri ike, na-ekwupụtara ndị ahụ nọ n’ime obodo ya na Jizọs bụ Kraịst ahụ. “Ma ọtụtụ ndị Samrịa nke obodo anhụ kwenyere na ya n’ihi okwu nke nwanyị ahụ.”3
Ọnọdụ ya niile gara aga na nke ugbua abụghị ihe kpebiri ọdịniihu ya. Dị ka ya, anyị nwere ike họrọ ịtụgharị ruo Onye Nzọpụta anyị taa maka ume na ọgwụgwọ nke ga-enye anyị ike imejupụta ihe niile nke e zitere anyị ebe a ime.
Nke Abụọ: Ike Ahụ Dị nime Anyị
N’ime amaokwu a maara ama dị nime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, Onyenwe anyị na-agba ụmụnwanyị na ụmụnwoke ume ịnọ “n’oke agụụ n’ịchụso ihe ọma, ma mee ọtụtụ ihe site n’ọchịchọ nke onwe, ma na-eweta na mmezu nnukwu ezi omume; n’ihi na ike ahụ dị nime ha.”4
Ụmụnne nwanyị, ike ahụ dị n’ime anyị iwete na mmezu ọtụtụ ezi omume!
Onyeisi Russell M. Nelson gbara ama, “Nwanyị niile na nwoke niile onye n’eme ọgbụgba ndụ ya na Chineke ma debe ọgbụgba ndụ ndị ahụ niile, na onye n’esoro eme emume nsọ niile nke ọkwa nchụaja na ntozu oke, nwere ohere ọma ruo ike nke Chineke.”5
A bịawo m mata na dị ka anyị na-agbalị inye ọgbụgba ndụ niile dị nsọ nke e mere na baptizim na n’ime tempụl dị nsọ nkwanye ugwu, Onyenwe anyị ga-agọzi anyị “site n’ike nke ọgwụgwọ Ya n’agba ume” ya na “echiche ime mmụọ na mkpate mmụọ nke [anyị] na-enwetụbeghị mbụ.”6
Nke Atọ: “Site N’ihe Nta niile Ka Oke Ihe S’i Apụta.”7
N’okwuchukwu n’elu ugwu, Jizọs kuziri ndị na-eso ụzọ Ya, “Unu bụ nnu nke ụwa”8 ma “Unu bụ ihé nke ụwa.”9 Emesịa Ọ tụnyere uto nke alaeze eluigwe na ihe na-eko achịcha, “nke otu nwanyị weere, ma zoo na-atụ ụzọ nri atọ, ruo mgbe ha niile dum koro.”10
-
Nnu
-
Ihe na-eko achịcha
-
Ìhè
Ọbụna na nwa obere ihe, nke ọbụla na-emetụta ihe niile gbara ya gburugburu. Onye Nzọpụta na-akpọku anyị iji ike Ya dị ka ị bụ nnu, koro eko, na na-adịghị arọ.
Nnu
Ọ na-atụ n’anya otu ịdị iche nfesa nke nnu na-eme n’ime ụtọ nke ihe anyị na-eri. Ma n’agbanyeghị nnu bụ otu n’ime ngwa nri kachasi n’idi mfe ma ọ dịghị ọnụ.
N’akwukwọ nke Ndị Eze 2, anyị na-agụ maka “nwa odibo nta,”11 onye nke ndị Siria dọkpụụrụ ma bụrụzie nwa odibo nye nwunye Naaman, onyeisi agha nke ndị agha Siria. Ọ dịịrị dị ka nnu; ọ dịịrị nta, n’adịghị mkpa nye ụmụ ụwa, ma ndụ ya dị ka nwa ohu na mba ofesi n’ezie abụghị ihe o chekubeere onwe ya.
Kosiladị, o kwuru ahịrịokwu abụọ n’ike nke Chineke, na-agbara nwunye Naaman ama: “Ma asị na Onyenwe m Chineke nọ n’ihu onye amụma nke nọ na Samerịa! n’ihi na ọ ga-esi na ọrịa ekpenta ya napụta ya.”12
Okwu ya niile nke okwukwe ka a gwara Naaman, onye jiri okwu ya mee ihe, nke kwere ya inwete ọgwụgwọ ma na anụ ahụ ma na ime mmụọ.
Mgbe ụfọdụ anyị n’elekwasị anya na ụmụ odibo ndị mere Naaman ekwere isa ahụ n’osimiri Jodan, dị ka Onye amụma Elisha tụziri, mana Naaman agaraghị anọ n’ọnụ ụzọ Elisha ma enweghị “nwa odibo nta.”
I nwere ike ịdị nta ma ọbụ nwee mmetụta nke enweghị uru ị bara, mana i nwere ike bụrụ dị ka nnu n’ime ezi na ụlọ gị, n’ụlọakwụkwọ, na n’ime obodo gị.
Ihe na-eko achịcha
Iriwo achịcha n’enweghị ihe na eko achịcha n’ime ya? Kedu otu i ga-esi akọwa ya? O buru ibu? Ọ dị aro? O siri ike? Naanị nwaobere ihe na-eko achịcha, achịcha ekolie, na-agbasawanye ịdị mfe ma dị nro.
Mgbe anyị na-akpọku ike Chineke n’ime ndụ anyị, anyị na-edochi “mmụọ nke ịdị arọ”13 site n’echiche mmụọ kpatere nke na-ebuli ndị ọzọ ma mepụta ohere ka obi niile nwete ọgwụgwọ.
Na nso nso a otu enyi m dinara na-akwa n’ụtụtụ Ekeresimesi, nke mwute meriri. Ụmụ ya rịọrọ ya ka o bilie, kosiladị, mgbu nke ịgba alụkwaghịm cheere ya jupụtara ya n’obi. N’idinara na-akwa na-ebe ákwá, wụpụtasịrị mkpụrụ obi ya n’ekpere nye Nna ya nke Eluigwe, na-agwa Ya maka enweghị olileanya ya.
Dị ka o mechiri ekpere ya, Mmụọ ahụ takaara ya na Chineke maara mgbu ya. O jupụtara na ọmịiko Ya maka ya. Nhumiihe nke a dị nsọ kwadoro mmetụta ya niile ma nye ya olileanya na ọ naghị eru uju naanị ya. Ọ bilitere, gaa n’ezi, ma soro ụmụ ya wuo snoman, were ọchị na ọńụ dochie idi arọ nke ụtụtụ ahụ.
Ìhè
Ìhè ole ka ọ ga-ewe iji gafee ọchịchịrị nke dị n’ime ọnụ ụlọ ahụ. Nwa obere ìhè. Ma ụzarị ọkụ ahụ dị n’ebe gbara ọchịchịrị nwere ike pụta site n’ike Chineke dị n’ime gị.
Ọbụnadị na i nwere ike chee na naanị gị nọ dị ka oké ifufe niile nke ndụ n’efegharị, i nwere ike na-enwu ìhè n’ọchịchịrị nke nghọtaghe, mgbagwoju anya, na ekweghị ekwe. Ìhè nke okwukwe gị n’ime Kraịst nwere ike guzosie ike ma sie ike, na-edu ndị ahụ gbara gị gburugburu na nchekwa na udo.
Ụmụnne nwanyị, e nwere ike gbanwee obi niile ma agọzie ndụ dum dị ka anyị na-enye otu ntụtụ nnu, otu ngaji ihe n’eko achịcha, na otu ụzarị ọkụ.
Ana m agba ama na Onye Nzọpụta bụ nnu dị n’ime ndụ anyị, na-akpọku anyị idetụ ọńụ na ịhụnaanya Ya ọnụ.14 Ọ bụ Ya onye bụ ihe n’eko achịcha mgbe ndụ anyị siri ike, n’ewetere anyị olileanya15 ma na-ebuli ibu arọ anyị16 site n’ike Ya n’enweghị atụ na n’ịhụnaanya Ya na-agbapụta.17 Ọ bụ ìhè anyị,18 n’enye ìhè n’ụzọ anyị ji alaghachi n’ebe obibi.
Ekpere bụ na anyị nwere ike bịarute Onye Nzọpụta, dị ka nwanyị nọ n’ebe olulu mmiri, ma nụọ mmiri nke ndụ Ya. Isoro ndị dị iche iche nke Samerịa, anyị nwere ike kwupụta, “Ugbua anyị kweere, … n’ihi na anyị anụwo Ya n’onwe anyị, ma mata na nkea n’ezie bụ Kraịst ahụ, Onye Nzọpụta nke ụwa.”19 Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen