Ọgbakọ Zuru ọha
Mee Ihe Kachasị Mkpa
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2022


Mee Ihe Kachasị Mkpa

Mgbe anyị na-atụkwasị ndụ anyị n’elu Jizọs Kraist, a ga-eji ume nke ime mmụọ, afọ ojuju, na ọńụ gọzie anyị.

Mgbe na-adịghị anya, otu ezigbo enyi nwetara mmetụta ịga leta otu nwanyị na ngalaba ukwu ya. Ọ kpọchiri ntị na mmetụta ahụ niihi na ọ matụghị onye ọ bụ—ọ baghị uru nnọọ. Mana ebe echiche ahụ nọ na-abịara ya, o kpebiri ime ihe na mkpake nke mmụọ ahụ. Niihi na o bularịị ụzọ na-enwe ahụ oyi site na nleta ahụ ọ chọrọ ime, o kpebiri na iwegara nwanne nwanyị ahụ ihe ga-enye aka belata obi ịlọ mmiri ya. N’ezie o nweghị ike ịga gbara aka! Ya mere ọ zụtara otu iko ice cream, ma gawa ibido ihe o chere ga-abụ nleta gbara gharịị.

Ọ kụrụ aka n’elu mgbo onyeinyom ahụ, ma mgbe na-adịghị anya nwanne nwanyị ahụ zara. Enyi m nyere ya ice cream ahụ dị niime akpa akwụkwọ na-acha aja aja, ma ịkpa nkata malitere. O weghị ọtụtụ oge maka enyi m ịmata ihe mere nleta ahụ ji mkpa. Mgbe ha nọdụkọtara ọdụ niihu obu, onyeinyom ahụ kpughere igwe aka mgba niile ọ na-ezute. Mgbe otu awa nke ikwu okwu n’ihu eluigwe ọkọchị dị ńara ńara gasịrị, enyi m hụtara na ice cream ahụ na-agbaze site na akpa akwụkwọ ahụ na-acha aja aja.

O tipụrụ, “O wutere m nke ukwuu na ice cream gị gbazere!”

Onyeinyom ahụ zaghachiri n’obi ụtọ, “Ọ dị MMA! Ahụ m anaghị anabata mmiri ara ehi!”

Niime nrọ, Onyenwe anyị gwara onye amụma Lihaị, Ngọzi na-adịrị gị Lihaị, niihi ihe ndị i meworo.”1

Ị bụ onye na-eso ụzọ Jizọs Kraist chọrọ ihe ndị ọzọ karịrị naanị ịtụanya ma ọ bụ ikwere. Ọ bụ ihe chọrọ mbọ, ime njem, na ime mkpebi. Ọ chọrọ na anyị ga-eme ihe, ị bụ “ndị na-eme ihe e kwuru, na-abụghị naanị ndị na-anụ anụ.”2

Niihe banyere ice cream ahụ, olee ihe kachasị mkpa? Ọ bụ ice cream ahụ? Ka ọ bụ na enyi m mere nnọọ ihe?

E nwere m otu nhụmiihe dị mma mụ na otu onyeinyom nta m hụrụ naanya onye jụrụ otu ajụjụ si nnọọ n’obi: Nwanne nwanyị Craven, olee otu isi ama na ihe ọbụla gbasara Nzukọ nsọ ahụ bụ eziokwu? Niihi na enweghị mmetụta m na-enwe.”

Tupu awụba n’otu azịza, ebu m ụzọ jụọ ya ụfọdụ ajụjụ. “Gwa m ihe gbasara ọmụmụ akwụkwọ nsọ nke onwe gị.”

Ọ zara, “Anaghị m agụ akwụkwọ nsọ.”

A jụrụ m, kedụ maka gị na ezi na ụlọ gị? Unu na-amụkọta Bịanụ, Soro M ọnụ?”

Ọ sịrị, “Mba.”

A jụrụ m ihe gbasara ekpere ya niile: “Kedụ ka o si emetụta gị mgbe i kpere ekpere?”

Azịza ya: “A naghị m ekpe ekpere.”

Nzaghachi m nye ya bụ ihe dị mfe, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịma ihe ọbụla, ị ga-enwe ihe ị ga-eme.”

Nke ahụ ọ bụghị eziokwu niihe ọbụla anyị chọrọ ịmụ ma ọ bụ ịmata? A kpọkuru m enyim ọhụrụ ka ọ malite ime ozi ọma nke Jizọs Kraist: ikpe ekpere, ịmụ ihe, ijere ndị ọzọ ozi, na inwe ntụkwasị obi niime Onyenwe anyị Ntọgharị agaghị abịa mgbe enweghị ihe a na-eme. Ọ na-abịa site nʼike nke Mmụọ Nsọ dị ka anyị na-akpachara anya agba mbọ ịmata site nʼịjụ, ịchọ, na ịkụ aka nʼụzọ. Ọ na-abịa site na-ime ihe.3

Niime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, Onyenwe anyị mgbe na mgbe na-asị, “O nweghị ihe o mere.”4 Ọ na-eme ka m tụgharịa uche na ọ bụrụ na ụfọdụ ihe e nweghị ihe o mere, ma ọ bụ metụ ihe ntakịrị, a ga-enwerịrị ihe ndị nke na-akachasị emetụta. Na mbọ anyị ime otu ihe ma ọ bụ ihe ọbụla, anyị nwere ike jụọ onwe anyị, “Gịnị kachasị mkpa?”

Ndị mkpọsa ozi ọtụtụ mgbe nʼeji okwu eji ama ọkwa ụdị dị ka “Oke mkpa” ma ọ bụ “Garịrị Enwe” nʼolileanya nke ịrata anyị ikwere na ngwa ahịa ha na-ere dị mkpa maka ańụrị anyị ma ọ bụ ọdịmma anyị. Mana ihe ha na-ere n’ezie ọ dị oke mkpa? Anyị n’ezie ọ ga-enwerịrị ya? O nwere n’ezie ihe o mere?

N’ebe a bụ ụfọdụ echiche a ga-atụle. Olee ihe Kachasị Mkpa?

  • “Ndị mmasị” ole ka anyị na-enweta na soshal midịa ndị a na-ezipụ? Ma ọ bụ olee ogo ịhụnaanya e nwere n’ebe anyị nọ ma kpọ anyị ihe site n’aka Nna anyị nke Eluigwe?

  • Iyi akwa ndị kachasị na-ewu ewu ugbu a? Ma ọ bụ igosị nkwanye ugwu maka ahụ anyị site n’iji ejiji ruo n’oke?

  • Ịchọpụta azịza niile site na ime nchọcha na intanet? Ma ọ bụ ịnata azịza niile si n’aka Chineke site na Mmụọ Nsọ?

  • A chọkwuru ndị ọzọ? Ma ọ bụ inwe afọ ojuju n’ihe nke enyeworo anyị?

Onyeisi Russell M. Nelson na-akuzi:

“Site na Mmụọ Nsọ nọ dị ka onye na-eso gị aga, inwere ike ịhụta site na omenaala omume ọsọ ọsọ nke na-etidawo ụzọ anyị si ebikọ ọnụ n’okpuru iwu. Unu nwere ike ị dị gara gara karịa ka ndudugandu ndị gara aga dịworo. …

Hiwe ọkọlọtọ maka ndị fọdụrụ n’ụwa!”5

Ọ na-ewe ịgba mbọ ịnọgide lekwasị anya niihe dị oke mkpa n’ezie maka ọńụ na-adịgide. O nweghị ihe ga-amasị Setan karịa anyị idogheri ejiri mara niile dị ebighị ebi anyị, na-eduba anyị n’ịla oge kachasị dị mkpa, akaraka niile, ma ọ bụ ume nke ime mmụọ n’iyi, niihe ndị na-adịghị mkpa. Ana m akpọku onye ọbụla niime anyị iji ekpere tulee ihe ndị ahụ na-emegheri anyị anya site na-ime ihe kachasị mkpa.

Onye nkuzi ogo nke atọ nke ọkpara anyị kuziiri ndị klass ya sị “na-achịnụ ụbụrụ isi unu.” Ọ bụụrụ ihe ncheta nye ụmụ akwụkwọ ya na-eto eto na ha ji ike inwe njikwata echiche ha ma nwere ike ya mere inwe njikwata ihe ha na-eme. Ana m e chetara onwe m “ịchị ụbụrụ isi m” mgbe m hụtara onwe m ị na-akpafu chuwe ihu na-ihe ndị na-adịchaghị mkpa.

Nwa akwụkwọ nọ ncogo kọleji dị elu na nso nso a gwara m na ọ bụrụwo ihe na-ewu ewu n’etiti ụfọdụ ndị ntoroọbịa nke Nzukọ nsọ ịgbachi nkịtị na iwu nsọ niile site na-atụmatụ a haziri nke ichegharị ma emesịa. “Ọ dị nnọọ ka akwa dị ka ihe ịrụba ama nke nkwanye ugwu,” Ọ bụ ihe a gwara m. Nke a haghị ime, Onyenwe anyị ga-aganiihu ịgbaghara ndị ahụ ji obi dị umeala na-echegharị “na-ezi ebum n’uche.”6 Kama Aja mgbaghara mmehie obi ebere nke Onye Nzọpụta bụ ihe agaghị eji eme ihe n’ụdị ụzọ ịkwa emu dị otu ahụ. Anyị maara maka ilu gbasara otu atụrụ furu efu. Ọ bụ ya, onye ọzụzụ atụrụ ga-ahapụ atụrụ 99 ndị ọzọ ịchọta otu nke kpafuru akpafu. Mana i nwere ike iche n’obi gị ọńụ nke ndị ahụ họọrọ ị bụ 99 na-ewetara Ezigbo Onye ọzụzụ atụrụ ahụ? Ndị nke nọkọtara ọnụ ma na-enyere onye na ibe ya aka bie ndụ ọgbụgba ndụ ha? I nwere ike ịhụta n’uche gị ihe ụwa ma ọ bụ ụlọ akwụkwọ gị ma ọ bụ ọrụ gị ma ọ bụ ebe obibi gị ga-adị ka ya ma ọ bụrụ na inwe nrube isi bụụrụ ihe ama ama ime? Ọ bụghị maka ime ndụ n’ozuzu oke ya—ọ bụ gbasara ịchọta ọńụ ebe anyị na-eme oke ike anyị kachasị ibi ndụ ọgbụgba ndụ niile anyị meworo anyị na Onyenwe anyị.

Ebe ndị ụwa na-ekwupụta karịa n’obi abụọ gbasara Chineke ma nsogbu dị iche iche a na-abawanye, nke a bụ oge anyị garịrị akachasị nọrọ onye amụma nso. Dị ka onye nkwuchite ọnụ nke Onyenwe anyị, anyị nwere ike tụkwasị obi na ihe ọ na-arịọsi ike, enye na ndụmọdụ, ma na-arịọ ka anyị mee bụ ihe ndị kachasị mkpa

Na-agbanyeghị na o nwere ike ọ gaghị adị mfe, a na-enwerịrị ụzọ esi eme ihe ziri ezi. Ebe m na-agwa otu otu ndị enyi okwu n’ụlọ akwụkwọ, obi otu onyeinyom nta dara mba mgbe nkata ahụ ghọrọ nke ịkatọ ọkọlọtọ niile nke Nzukọ nsọ. Ọ matara na ya enweghị ike agba nkịtị—e nwere ihe ọ ga-eme. Na nkwanye ugwu, o kwuru okwu banyere ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe na otu iwu nsọ niile O hiwere ji bụrụ maka ịgọzi na ichekwa ụmụ Ya. Ọ gaara aka ịdịrị ya mfe ịhapụ ime ihe ọbụla. Mana olee ihe kachasị mkpa? Ịgwakọta gị na igwe mmadụ ahụ? Ka ọ bụ iguzoro iche dị ka onye ama Chineke na “oge niile, na n’ihe niile, nakwa na-ebe niile”?7

Ọ bụrụ na Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraist na-aga ịpụta site na nzizo, anyị garịrị apụta na nzizo. Dị ka ndịinyom na-edebe ọgbụgba ndụ, anyị ahaghịinye ihe nke ihe ozi ọma anyị n’elu ụwa niile site na-ịganiihu ma guzoro iche. Anyị na-emekọta nke a ọnụ dị ka ụmụada nke Chineke—ike nke ndịinyom dị nde 8.2 gbara afọ 11 ma gawazie, ndị ọrụ ha bụ kpọmkwem otu ihe ahụ. Anyị na-ekpokọta Israei dị ka anyị na-eso eme ihe n’ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu: na-agbasi mbọ ike ibi ndụ ozi ọma nke Jizọs Kraist, na-elekọta ndị ọzọ nọ na mkpa, na-akpọku mmadụ niile ịnata ozi ọma ahụ, na ijikọta ezi na ụlọ niile ọnụ maka ebighị ebi.8 Ozi ọma nke Jisọs Kraịst bụ ozi ọma nke ịrụ ọrụ na ozi ọma nke ọńụ! Ka anyị hapụ igbuda ike anyị ime ihe ndị ahụ kachasị dị mkpa. Oke anyị ketere si na chi na-enye anyị mgbam ume na ntụkwasị obi iji mee ma bụrụ ihe niile Nna nke Eluigwe hụrụ anyị naanya maara na anyị nwere ike ịbụ.

Isiokwu ndị ntoroọbịa nke afọ nke a bụ ihe sitere na Ilu 3:5–6:

“Tụkwasị obi n’Onyenwe anyị jiri obi gị niile; ma adaberekwala na nghọta nke onwe gị.

“N’ụzọ gị niile kwupụta ya, ma ọ ga-eduzi ụzọ gị.”

Isi ihe na-egosi ntụkwasị obi niime Onyenwe anyị bụ ịganiihu, ikwere na Ọ ga-edu aanyị ọbụna mgbe anyị na-enweghị azịza niile.

Ụmụnne ndị nwanyị, ọ bụghị gbasara ice cream ahụ. Ma ọ bụghị gbasara ime karịa. Ọ bụ gbasara ime ihe dị mkpa. Ọ bụ ị na-etinye ozizi nke Kraịst niime ndụ anyị dị ka anyị na-agbasi mbọ ike ịdịkwu ka Ya karịa.

Ka anyị na-emekwu ihe ịnọgidesi ike n’ụzọ ọgbụgba ndụ, otu ahụ ka okwukwe anyị niime Jizọs Kraist ga-esi eto karịa. Ka okwukwe anyị na-eto karịa, ka anyị ga-achọkarị ichegharị. Ma ka anyị na-echegharị karịa, otu ahụ ka anyị ga-emesị ike karịa mmekọrịta ọgbụgba ndụ anyị na Chineke. Mmekọrịta nke ọgbụgba ndụ ahụ na-adọta anyị ịga na tempụl niihi na idobe ọgbụgba ndụ niile nke tempụl bụ otu anyị si anagide ruo ọgwụgwụ.

Mgbe anyị na-atụkwasị ndụ n’elu Jizọs Kraist, a ga-edu anyị ime ihe kachasị mkpa. Ma a ga-agọzi anyị jiri ume nke ime mmụọ, afọ ojuju, na ọńụ! N’aha Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. 1 Nifaị 2:1; nkwusi ike ka agbakwunyere.

  2. Jemis 1:22

  3. Lee Alma 5:45–46; Russell M. Nelson, “Ịdọba Ike nke Jizọs Kraist niime Ndụ Anyị,” Liahona, Me 2017, 39–42.

  4. Lee Ozizi na Ọgbụgbandụ niile27:2; 80:3.

  5. Russell M. Nelson, “Olileanya nke Izrel” (worldwide youth devotional, June 3, 2018), HopeofIsrael.ChurchofJesusChrist.org.

  6. Moroni 6:8

  7. Mozaya 18:9; lee kwa “Isiokwu Ndịinyom Nta,” ChurchofJesusChrist.org

  8. Lee Akwụkwọ ntụzi aka Zuru ọha: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a,, 1.2, ChurchofJesusChrist.org.

Bipụta