Ọgbakọ Zuru ọha
Ozi Nkọwa
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2022


Ozi Nkọwa

Anyị na-akwanyere ụmụada nke Chineke ugwu na nzukọ nke a pụrụiche site n’ịlekwasị anya na nchegbu ha niile ma nke otù ha niile.

Ụmụnne m ndị nwanyị ọma, dị ka anyị n’ebido nzukọ a pụrụiche nke Ndị Inyom nke ọgbakọ zuruọha, obi dị m ụtọ inye ozi nkọwa nke a sitere n’aka Ndiisi Mbụ.

Ọgbakọ anyị niile nke Satọde nwere agụgụala metụtara ebumnobi dị iche iche na igwe mmadụ dị iche iche. Na mgbede nke a, anyị na-agbakwụnye nime agụgụala ahụ dị ka anyị n’ebido n’ebumnobi ọhụrụ na usoro maka ọdịnịhu a na-ahụ anya. Oziọma nke Jizọs Kraịst anaghị agbanwe agbanwe. Ozizi nke oziọma anaghị agbanwe agbanwe. Ọgbụgba ndụ anyị nke onwe anaghị agbanwe agbanwe. Mana kemgbe ọtụtụ afọ, nzụkọ ndị anyị n’enwe iji kwupụta ozi niile anyị na-agbanwe ma n’eziokwu ọ ga na-agbanwe ruo afọ ndị n’abịa abịa.

Maka ugbua, nzukọ nke mgbede nke a bụ otu nzukọ nke ọgbakọ zuruọha, ọ bụghị otu nzukọ nke otu otù ọbụla. Dị ka agba ọgbakọ zuru ọha ọbụla, nhazi ya, ndị ga-ekwu okwu, ma egwu niile ka ndị otù Ndịisi Mbụ na-ahọpụta.

Anyị agwawo Onyeisi Jean B. Bingham, Onyeisi Zuru ọha nke Otù Enyemaka, ka o duo nzukọ nke a. N’ọdịnihu, nzukọ mgbede Satọde nwere ike inwe onye odudu ya dị ka otu onye nime ndị Ọrụ Zuru ụwa nke Nzukọ nsọ, dị ka ndị otù Ndịisi Zuru Ọha nke Otù Enyemaka, Ndị Iyom Nta, ma Praịmarị, nke Otù Ndịisi Mbụ ga-ahọpụta.

N’abali a, nzukọ Mgbede Satọde nke ọgbakọ zuruọha nke a ga-elekwasị anya na nchegbu niile nke ụmụnwanyị Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazụ a. Nke a ga-agụnye ozizi nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a, iwu niile nke Nzukọ nsọ nke metụtara ụmụnwanyị karịsịa, na oke na ọrụ niile na ọrụ nke otù niile nke gụnyere ụmụnwanyị ma ụmụada nke Nzukọ nsọ. Na-agbanyeghi na ọgbakọ nke a ka na-agbasa gburugburu ọha niile nke ụwa dị ka otu esi mee nzukọ niile nke ọgbakọ zuruọha, ndị na-ege ntị akpọkuru ịnọ n’Ogige Ọgbakọ maka nzukọ nke a bụ ụmụnwanyị ma ụmụada gbara afọ 12 ma ọ bụ karịa. Anyị gụnyekwara ụfọdụ ndụ ndu ọkwa nchụaja ndị n’ahụ maka otù niile sonyere na ebe a.

Ihe anyị n’ebido ebe a bụ maka ihe mpụta nye akụrụngwa niile nke mkparịta nke nọ ugbua nye ndị ndu na ndị otù Nzụkọ zụrụ ụwa nke Onyenwe anyị. Ozizi nke oziọma nke Jizọs Kraist bụ maka onye niile, nke a bụ ebumnobi anyị nke mbụ na otu mgbasa ozi siri ruo. Anyị na-akwanyere ụmụada nke Chineke ugwu na nzukọ nke a pụrụiche site n’ịlekwasị anya na nchegbu ha niile ma nke otù ha niile.

Anyị nwere obi ekele na teknụzụ nke mgbasa ozi n’enye ndị ndu Nzukọ nsọ ike iji nye ozuzu rijuru afọ site n’izute ndị ha kwesịrị izute n’ebe ha na-arụ ọrụ. Anyị na-anabatakwa eziokwu nke a, na ohere niile eji eme njem ugbua na-abawanye. Nke ahụ n’ekwe ka anyị nwee ike ziga ndị ndu Nzukọ nsọ niile iduzi ọzụzụ ndu ihu n’ihu dị mkpa n’ebe a na-arụ ọrụ.

Nke a bụ ọrụ nke Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. Anyị bụ ndị oru Ya, na-anata odudu site n’aka Mmụọ Nsọ Ya. Anyị na-awụkwasị ngọzị niile nke Onyenwe anyị niisi ndị ndu niile nke otù niile ndịa ma niisi ndị inyom na ụmụ agbọghọ niile dị nkwesị ntụkwasị obi ndị n’ejere Onyenwe anyị ozi nime otù niile ndịa ma nime ndụ nke ha onwe ha. N’aha Jizọs Kraịst, amen

Bipụta