Ọgbakọ Zuru ọha
Welite Obi Gị Elu Ma Ṅụrịa Ọñụ
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2022


11:27

Welite Obi Gị Elu Ma Ṅụrịa Ọñụ

A mụrụ anyị n’oge nke a maka ebumnuche dị nsọ, mkpọkọta nke Izrel.

Mgbe ọ na n’ekwuru Thomas B. Marsh okwu, onye ọhụrụ chegharịrị echegharị, Onyenwe anyị kwuru nkea n’iji gbaa ume, “Welite obi gị-elu ma n̄ụrịa n’ihi na awa nke mgbasa ozi-ọma gị abiawo” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 31:3).

Ekwenyere m na ọkpụkpọ okù nke a nwere ike ịbụ ihe mkpali mmụọ maka ndị otù Nzukọ nsọ niile. Na-agbanyeghị ihe niile, anyị niile n’otu n’otu anatawo site n’aka Nna nke Eluigwe ozi nke mkpọkọta Israel na ala ndị dị ndụ ma ndị nwụrụ anwụ.

“Mkpọkọta ahụ,” Onye Isi Nelson ekwuwọ na “ọ bụ ihe kachasị dị mkpa n’eme n’elu ụwa taa.” Enweghi ihe ọzọ eji atụnyere ịdị ukwuu ya, enweghị ihe ọzọ eji atụnyere ịdị mkpa ya, enweghị ihe ọzọ eji atụnyere ebube ya.”1

N’ezie, enwere ọtụtụ ọrụ tozuru oke nke dị n’ụwa. Ọ kweghi omume na a aga-akpọcha ha niile aha. Mana ọ bụ na ị gaghị achọ isonye nime otu ọrụ nke dị ukwuu nọ gị nso na ebe ntinye uche gị g’ebute ihe dị iche n’uzọ dị ukwuu? Mkpọkọta ahụ n’emere anyị niile ihe dị ebighi ebi dị iche. Ndị mmadụ nke afọ ọbụla nwere ike ịsonye nime ọrụ nke a na-agbanyeghị ọnọdụ niile ha na ebe ha bi. Enweghi ọrụ ọzọ nime ụwa nke a nke karịrị ịnabata onye niile karịa nke a.

Mgbe ọ n’ekwuru naanị ndị ntorobịa okwu, Ọnyeisi Nelson kwuru na “Nna anyị nke Eluigwe edokwawo ọtụtụ ndị mmụọ Ya a maara ama—enwere ike, m nwere ike ikwu, ndị ọrụ Ya ndị kachasị mma—maka oge nke ikpeazụ nke a. Ndị mmụọ ndịa amaara ama—ndị ọrụ ndị ahụ kachasị mma, ndị dike ndị ahụ—bụ unu!”2

Ee, unu bụ ndị akwadoro ịpụta tupu oge nke ndụ nke a ma amụọ unu ugbua ka unu sonye nime ọrụ ukwu nke mkpọkọta Izrel n’ala dị ndụ ma ndị nwụrụ anwụ n’ụbọchị ikpeazụ ndịa (lee Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 138:53–56).

Kedụ ihe kpatara ọrụ nke a jiri dị oke mkpa? Nihi “uru nke mkpụrụ-obi niile bara dị ukwuu n’anya nke Chineke” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:10). Ma nihi “onye ọbụla kwere na [Jizọs Kraịst], ma e mee ya baptism, onye ahụ ka aga azọpụta; ma … ga-eketa alaeze nke Chineke” (3 Nefi 11:33). Ọzọkwa, “ihe nile Nna [ahụ] nwere ka a ga-enye” ndị ahụ natara emume nsọ Ya niile ma debe ọgbụgba ndụ niile Ya ((Ozizi na Ọgbụgba-ndụ nile 84:38). Na mgbakwụnye, “ndị ọrụ dị ole ma ole” (Luk 10:2).

Naanị nime Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndi-nsọ Ụbọchi-ikpeazu a k’anyị ga-ahụta ike ahụ, ikike ahụ, ma ụzọ esi enye ndị ọzọ ụdị ngọzị ahụ, ma ha dị ndụ mọbụ ha anwụwo.

Dị ka Onyeisi Nelson kwuru: “Oge ọbụla i mere ihe ọbụla nke n’enyere ọnye ọbụla aka—ma n’ọnwụ ma na ndụ—zọpụ otu nzọm ụkwụ ruo na-ime ọgbụgba ndụ ha na Chineke ma ha ịnata emume niile dị mkpa nke baptizim na tempụl, ị n’enye aka ịkpokọta Izrel. Otu a ka o jiri dịrị mfe.”3

Ebe enwere ọtụtụ ụzọ iji nyee aka na mkpọkọta Izrel, ọ ga-amasịm ikwu maka otu nime ha: ije ozi dị ka onye mgbasa oziọma nke uju ya. Maka ọtụtụ nime unu, nke a ga-apụta ị bụ onye mgbasa ọziọma n’akụzi nkuzi. Maka ọtụtụ ndị ọzọ, nke a pụtara ị bụ onye mgbasa ọziọma n’eje ozi. Mana ụwa nke a n’agbalịsị ike ịmegharị ndị ntorobịa anya site na oke n’ọrụ nke a kachasị dị nsọ site n’ijiri ụjọ na ndụ enweghi obisike.

Ụfọdụ ihe mmegheri anya ndị ọzọ nwere ike ị bụ nhụmihe nke ọrịa mkpochapụ, ị hapụ ezigbo ọrụ, ị gbadowe agụmakwụkwọ, mọbụ ị nwe otu onye ị nwere mmasị na ya. Onye ọbụla g’enwe ụdị ịma ka nke dịịrị ya. Ụdị mmegheri anya ahụ nwere ike ibido kpọm kwem n’oge ahụ a n’achọ ibido jewe ozi nke Onyewe anyị, ma nhọrọ niile nke gaara adị mfe ịme mgbe ahụ anaghị adịzi mfe ịhọrọ n’oge ahụ.

A matawom site na nhumihe ụdị nchegbu obi nke ụdị nwata dị otu a. Mgbe m na-akwado ije mishọn nke m, ụfọdụ ike m n’atụghị anya ha gbara mbọ ịme ka m daa mba. Otu bụ onye dọkịnta eze nke m. Mgbe ọ matara na nzute mụ na ya bụ nihi ka m bụrụ onye mgbasa oziọma, ọ gbara mbọ ị kwagide m ka m ghara ije ozi. Enweghi m mgbe ọ metụrụ m n’obi na dọkịnta eze m enweghi mmasị banyere Nzukọ nsọ ahụ.

Ịkwụsitụ agụmakwụkwọ m bụkwa ihe rara ahụ. Mgbe m rịọrịọ maka ị nyem ezumike ruru afọ abụọ site na ọmụmụ mahadụm, a gwara m na ọ gaghị ekwe omume. A ga m echefu ọnọdụ m na mahadum ahụ mọbụrụ na alọtaghịm n’otu afọ. Na Brazil, nke a bụ ihe ejiri kpọrọ ihe nihi na naanị ihe eji anabata mmadụ nime atụmatụ mahadụm bụ site na ule nke siri ezigbo ike ma nwee ezi ịma aka.

Mgbe arịọsiri ha ike, ha ejiri obi n’esighị ike kwuo na ọ bụrụ na alọtaghịm mgbe otu afọ gara, m nwere ike tinye akwụkwọ ka ahapụ m nanị nịhi ihe pụrụ ezigbo iche. Enwere ike nabata ya mọbụkwanụ enweghi ike. Egwu tụrụ m mgbe m chere maka ịlegharị ule nnabata ahụ nke siri ezigbo ike mgbe m ga-ahapụtụ ọmụmụ ihe m afọ abụọ.

Ọzọkwa enwere otu nwa agbọghọbịa m nwere mmasị na ya. Ọtụtụ ndị enyi m nwekwara mmasị na ya. Echere m nime obi m, “ọbụrụ na m jee mgbasa oziọma, nke a nwere ike ị pụ m n’aka.”

Mana Onyenwe anyị Jizọs Kraịst bụ nnukwu mkpali mmụọ nye m ka m ghara ịtụ egwu maka ọdịnihu dị ka m na-agbalị ịji obi m niile jere Ya ozi.

Ya onwe ya nwekwara ozi nke ọ ga-emejupụta. N’okwu nke ya onwe ya, Ọ kọwaara, “Nihi esi m n’igwe gbada, ọbụghị ịmee uche nke mụ onwem, kama uche nke onye ahụ zitere m” (Jọn 6:38). Ma mgbasa ozi Ya ọ dịịrị mfe? Mba n’ezie. Ntaram ahụhụ Ya, nke bụ akụkụ dị mkpa banyere mgbasa oziọma Ya, nke mere Ya, “ọbụna Chineke, onye kachasị ihe niile, ịma jijiji n’ihi mgbu, ma gbaa ọbara site na ntakịrị oghere ọbụla, ma taa ahụhụ ma arụ ma na mmụọ—ma chọọ ka [Ya] ghara ịn̄ụ n’iko ilu, ma sụlaa—

“N’agbanyeghị nke ahụ, otuto dịrị Nna, na [Ọ] so keta ma mesịa nkwadobe [Ya] niile nye ụmụ nke mmadụ.” (Ozizi na Ọgbụgbandụ niile 19:18–19)

Ịje ozi mgbasa oziọma nke uju ya nwere ike yie ihe rara anyị ahụ. Ikekwe ọ ga-ewe n’anyị ga-ahapụ ihe ndị dịịrị anyị mkpa nwantịtị oge. Onyenwe anyị maara nke a n’ezie, ma Ọ ga-anọ anyị n’akụkụ mgbe niile.

N’ezie, nime ozi ha nye ndị mgbasa oziọma dị nime akwụkwọ Kwusaa Ọzị Ọma m, Ndịisi Mbụ kwere nkwa na, “Onyenwe anyị ga-akwụghachi ụgwọ ma gọzie unu n’ụzọ bara ụba dị ka unu jiri obi umela ma ekpere n’ejere Ya ozi.”4 Ọ bụ eziokwu na ụmụ niile nke Chineke ka a na-agọzị n’otu ụzọ mọbụ nke ọzọ, mana enwere ihe dị iche dị n’etiti ịnata ngọzi na ịnata ngọzị bara ụba nime ije ozi Ya.

Cheta ịma aka niile nke m chere na m zutere tupu mgbasa oziọma nke m? Dọkịnta eze m? Achọtaram onye ọzọ. Mahadum m? Ha nabatara arịrịọ m. Chetakwa nwa agbọghọ ahụ? Ọ lụrụ otu n’ime ndi ezi enyi m.

Mana Chineke n’ezie gọziri m n’ụzọ bara ụba. Ma a mụtara m na ngọzị niile nke Onyenwe anyị nwere ike ị bịa n’ọtụtụ ụzọ dị iche site na otu anyị siri chee. Mgbe ihe niile mesịrị, echiche ya niile abụghị ụdị echiche niile nke anyị (lee Aịzaya 55:8–9).

Nime ọtụtụ ngọzị niile bara ụba nke Ọ nyeworo m nihi ịjere Ya ozi dị ka onye mgbasa oziọma nke uju ya bụ nnukwu okwukwe na Jizọs Kraịst ma Aja Mgbaghara mmehie Ya, tinyekwara mmata ihe nke sikwuru ike ma ịgba ama maka nkụzi Ya nille, nke mere na ọ dịghịrị m mfe ka “ikuku ozizi ọbụla” bụgharịa m (Ndị Efesọs 4:14). Ụjọ ịkụzi nkụzi m pụrụ m n’ahụ. Ume m n’enwe ijiri olileanya zute ịma aka niile bịara bawanyee. Site n’ikiri ndị mmadụ ma ezinụlọ niile ndị m zutere mọbụ kuziere dị ka onye mgbasa oziọma, A mụtara m na nkụzi niile nke Chineke bụcha eziokwu mgbe Ọ kwuru na mmehie anaghị enwete ezi añụrị ma na nrube isi nye iwu nsọ niile nke Chineke n’enyere anyị aka ime nke ọma ma na anụ ahụ ma nime mmuọ (lee Mosaia 2:41; Alma 41:10). Ma amụtara n’onwe m na Chineke bụ Chineke nke ọrụ-ebube nile (lee Mọmọn 9).

Ihe niile ndịa socha nye aka nime nkwado m maka ibi ndu dimkpa, tinyekwara ọlụlụ na ị bụ nne na nna, ije ozi nke Nzukọ nsọ, ma otu m si ebi ndụ ọkachamara na nke ime obodo.

Mgbe mgbasa oziọma m gasịrị, eritere m uru site na mbawanye ume iji gosipụta onwe m dika onye dị ntụkwasị obi n’eso Jizọs Kraịst ma Nzukọ nsọ Ya nime ọnọdụ niile ma nye mmadụ niile, tụmadị ịkesaa oziọma mụ na otu nwanyị mara mma onye bụziri nwanyị nwere eziagwa, nwee akọ n’uche, ọnye añụrị, onye nsiso ebighi ebi m hụrụ naanya, anyanwụ nke ndụ m.

Ee, Chineke agọziwo m n’ụzọ bara ụba, karịa otu m siri wee chee, dị ka Ọ ga-esi meere ndị ahụ niile ndị g’ejị “obi umela ma ekpere jere Ya ozi.” Enwere m obi ekele ebighi ebi maka Chineke nihi ịdịmma Ya.

Mgbasa oziọma nke m hazigharịrị ndụ m kpam kpam. A mụtara m na ọ bụ ihe bara uru ịtụkwasị obi na Chineke, ịtụkwasị obi na amamiihe Ya na ebere na nkwa Ya niile. Mgbe emesịrị ihe niile, Ọ bụ Nna anyị, ma n’enweghi obi abụọ ọbụla, Ọ chọrọ k’anyị nwete nke ahụ kachasị mma.

Ndị ntorobịa ọma gburugburu ụwa, e jim otu ụdị mkpoku ahụ nke ọnye amụma anyị, Onyeisi Nelson, jiri kpọọ unu niile “ka unu banye nime ọtù agha ntorobịa nke Onyenwe anyị maka ị nye aka kpọkọta Izrel.” Onyeisi Nelson kwuru:

“Enweghi ihe karịrị nke a n’idi mkpa. N’ezie enweghi mọlị.

“Mkpọkọta nke a kwesịrị ị bụ ihe niile nye gị. Nke a bụ ozi ahụ kpatara ejiri zite gị n’elu ụwa.”5

A mụrụ anyị n’oge nke a maka ebumnuche dị nsọ, mkpọkọta nke Izrel. Mgbe anyị jere ozi dị ka ndị mgbasa oziọma nke uju ya, a ga-ama anyị aka mgbe ụfọdụ, mana Onyenwe anyị N’onwe Ya bụ nnukwu onye ịma atụ na onye ndu anyị n’oge ọnọdụ niile dị otu ahụ. Ọ ghọtara ihe bụ mgbasa ọziọma nke rara ahụ. Site n’enyem aka Ya, anyị nwere ike mee ihe ndị siri ike. Ọ ga-anọ anyị n’akụkụ (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 84:88), ma Ọ ga-agọzi anyị nke ukwuu dị ka anyị ji obi umeala n’ejere Ya ozi.

Maka ihe mkpata ndịa, ọ tụghị m n’anya na Onyenwe anyị gwara Thomas B. Marsh nakwa anyị niile, “Welite obi gị-elu ma n̄ụrịa n’ihi na awa nke mgbasa ozi ọma gị abiawo” N’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. Russell M. Nelson, “Olile anya nke Izrel” worldwide youth devotional, June 3, 2018), HopeofIsrael.

  2. Russell M. Nelson, “Olileanya nke Izrel.”

  3. Russell M. Nelson, “Olileanya nke Izrel.”

  4. Kwusaa Oziọ,a m: Ihe Ndu Maka Ozi Mgbasa Oziọma (2019), v.

  5. Russell M. Nelson, “Olileanya nke Izrel.”