Onye ọbụla N’ime anyị Nwere otu Akụkọ
Biko bia chọta ezinaụlọ gị, ndudugandu gị niile, ma kpọlata ha n’ebe obibi.
Ndị enyi, ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, anyị niile nwere otu akụkọ. Dị ka anyị na-achọta akụkọ anyị, anyị na ejikọta, anyị n’esonye, anyị na-abụ.
Aha m bụ Gerrit Walter Gong. Gerrit bụ aha ndị Dutch, Walter (aha nna m) bụ aha ndị America, ma Gong n’ezie bụ aha ndị China.
Ndị ọkachamara na-eme atụmatụ na ndị mmadụ dị ijeri 70–110 ebiela n’elu ụwa. Eleghị anya naanị otu ka akpọworo Gerrit Walter Gong.
Onye ọbụla n’ime anyị nwere otu Akụkọ. A hụrụ m “mmiri ozuzo n’ihu m [na] ifufe dị ka ọ na-akufe” n’anya.”1 Mụ na nnụnnụ penguin niile nke Antarctica n’eje ije otu ha si eje ije. Ana m enye ndị enweghị nne na nna n’ime Guatemala, ụmụaka okporo ama nime Cambodia, ndị nwanyị Maasa n’ime Mara Afrika foto nke mbụ ha nke onwe ha.
Ana m eche na ụlọ ọgwụ dị ka a na amụ ụmụ anyị—otu ugboro enyere m dọkinta aka.
A tụkwasịrị m Chineke obi. E kwere m “[anyị] dịrị, ka [anyị] wee nwee ọńụ,”2 na enwere oge na mgbe nye ihe ọbụla na okpuru eluigwe.3
Ị mara akụkọ gị? Ihe aha gị pụtara? Ọnụ ọgụgụ ụwa toro site na ijeri mmadụ 1.1 n’ime afọ 1820 ruo ihe ruru ka ijeri 7.8 n’ime 2020.4 Afọ 1820 ahụ chọrọ ịdị ka ntụgharị uche n’ime agụgụala. Ọtụtụ a mụrụ mgbe afọ 1820 gachara nwere ebe nchekwa dị ndụ na ndekọ niile iji mata ọtụtụ ndudugandu ezinaụlọ. I nwere ike icheta otu ihe pụrụ iche, nke dị ụtọ gị na nne na nna nnukwu ma ọ bụ onye otu ezinaụlọ ọzọ?
Agbanyeghị ọgụgụ niile nke ndị mmadụ biworo n’elu ụwa, ama ole ọ bụ, enwere ike ịgụta ya ọnụ, otu onye n’otu oge. Mụ na Gị, onye ọbụla dị mkpa.
Ma biko tulee nke a: ọbụrụ na ma ọbụ anyị amaghị ha, ọ bụ nne na nna mụrụ onye ọbụla n’ime anyị. Ma nne ọbụla na nna ọbụla ka otu nne na otu nna mụrụ.5 Site na ịmụ ụmụ ma ọbụ ma ekutere ekute, n’ikpeazụ anyị niile nwee njikọta n’ime ezinaụlọ nke Chineke na nime ezinaụlọ nke mmadụ.
Nna nna nna m nke 30, Dragon Gong nke Mbụ, a mụrụ na 837 AD bidoro ezinụlọ obodo anyị n’ime ndịda China. Oge mbụ M gara na obodo Gong, ndị mmadụ sịrị, “Wenhan huilaile” (“Gerrit a lọtala”).
Na akụkụ nke nne m, osisi agbụrụ ezinaụlọ anyị tinyere puku kwụrụ puku ọtụtụ aha nke ezinaụlọ anyị, na ndị karịrị akarị a ga achọpụta.6 Anyị niile nwere ezinaụlọ ndị ọzọ anyị na ha ga ejikọ. Ọ bụrụ na ichere na nwanne nwanyị nnanna gị emezuola agbụrụ ezinaụlọ gị, biko chọọ ndị kọzịni gị ma ndị kọzịn niile ndị kọzịn gị. Jikọta aha niile nke ezinụlọ gị ndị ibu n’isi ya na ijeri 10 aha ndị enwere ike ịchọta nke Family Search nwere ugbua n’ime mkpokọta ntanetị nke ha, nakwa ijeri 1.3 ndị mmadụ n’ime Osisi Ezinaụlọ ya.7
Gwaa ndị enyi mọbụ ezinaụlọ ka ha see osisi dị ndụ. Dị ka Onyeisi Russell M. Nelson na akuzi, osisi niile dị ndụ n’enwe mgbọrọgwụ na alaka niile.8 Ma ị bụ onye mbụ ma ọbụ onye iri ndudugandu amama, jikọta ụnyahụ maka echi. Jikọta mgbọrọgwụ niile na alaka niile n’ime osisi ezinaụlọ gị dị ndụ.9
Ajụjụ ahụ, “Ebee ka i si?” jụọ agbụrụ, ebe amụrụ gị, na obodo nna ma ọbụ ala nna. Na gburugburu ụwa, percent 25 anyị n’achọpụta ala nna anyị na China, percent 23 na India, percent 17 na Asia Pacific ndị ọzọ, percent 18 na Europe, percent 10 na Afrịka, percent 7 na ndị America.10
Ajụjụ ahụ “Ebee ka i si?” na akpọku anyị ịchọpụta njirimara si na chi anyị na nzube ime mmụọ na ndụ.
Onye ọbụla n’ime anyị nwere otu Akụkọ.
Otu ezinaụlọ M maara jikọtara ndudugandu ezinaụlọ ise mgbe ha gara na ebe obibi ha ochie n’ime Winnipeg, Canada. Ebe ahụ nna nna ahụ gwara ụmụ ụmụ ya ndị nwoke gbasara ụbọchị ndị mgbasa oziọma abụọ (ọ kpọrọ ha ndị mụọ ozi si na eluigwe) wetara oziọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere, wee gbanwee ezinaụlọ ha ruo mgbe niile.
Otu nne M mara kpọrọ ụmụ ya na ndị kọzịnị ha ka ha jụọ nne nnenne ha gbasara nhụmihe ya niile mgbe ọbụ nwanta. Njem nlegharị anya niile nke nne nne nne na nkuzi niile nke ndụ ya ugbua bụ akwụkwọ ezinaụlọ dị oké ọnụ ahia jikọtara ndudugandu niile.
Otu nwa nwoke M maara na achịkọta “akwụkwọ akụkọ Nna.” Ọtụtụ afọ gara aga, ụgbọ ala kụrụ ma gbuo nna ya. Ugbua, ị mata nna ya, nwa okorobịa a nwere obi ike na echekwa ihe ncheta nwata na akụkọ niile site n’aka ezinaụlọ na ndị enyi.
Mgbe ajụrụ ebe ihe nkọwa sị apụta na ndụ, ọtụtụ mmadụ n’ekwu na ezinaụlọ nke mbụ.11 Nke a tinyere ezinaụlọ dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ. N’ezie, mgbe anyị nwụrụ, anyị anaghị akwụsị ịdị adị. Anyị nọgidere na adị ndụ na akụkụ nke ọzọ nke ákwá mgbochi ahụ.
Ha ka dị ndụ, ndị nna anyi ochie kwesịrị ka echeta ha.12 Anyị na echeta ihe nketa anyị site na agụgụala niile nke ekwuru ekwu, ndekọ niile agbụrụ na akụkọ niile ezinaụlọ, ncheta niile ma ọbụ ebe niile nke ncheta, na mmemme niile na foto, nri, ma ọbụ ihe ndị na echetara anyị ndị anyị hụrụ n’anya.
Chee echiche maka ebe i bi—ọ bụ na ọdịghị ebube ka obodo na ogbe unu ji echeta ma sọpụrụ ndị nnanna, ezinaụlọ, ndị ọzọ jere ozi ma chụọ aja? Na ịma atụ, na ncheta owuwe ihe ubi autumn n’ime South Molton, Devonshire, England, Nwanne nwanyị Gong na Mụ nwere obi ụtọ ị chọta obere nzukọ nsọ na ogbe ebe ndudugandu niile nke ndị ezinaụlọ Bawden anyị biiri. Anyị na asọpụrụ ndị nna nna anyị site na imepe eluigwe niile site na ọrụ tempụl na agụgụala ezinaụlọ13 ma ị bụrụ ihe jikọtara14 n’ime ụdọ igwe nke ndudugandu niile anyị.15
n’ime oge a nke “A họọrọ m onwe m,” obodo na-erite uru mgbe ndudugandu niile na ejikọta ọnụ na ụzọ niile bara uru. Anyị chọrọ mgbọrọgwụ niile inweta nku niile—ezigbo mmekọrịta niile, ije ozi bara uru, ndụ nke karịrị ihe a n’ahu na soshial midia n’adịghị anọgide.
Ịchọta anyị na ndị nna nna nwere ike gbanwe ndụ anyị n’ụzọ niile anyị n’atụghi anya. Site na mnwale ma mmeri ha niile, anyị na erita okwukwe na ume.16 Site na ịhụnanya na ịchụ aja ha niile, anyị na amụta ịgbaghara ma gaa n’ihu. Ụmụ anyị na adị ike. Anyị na enweta nchekwa na ike. Njikọta anyị na ndị nna nna na-abawanye mmekọrịta, ekele, ọrụ ebubu niile nke ezinaụlọ. Ụdị njikọta ndị a nwere ike weta enyem aka site na akụkụ nke ọzọ nke ákwá mgbochi ahụ.
dị ka ọńụ si abata n’ime ezinaụlọ niile, otu a ka iru uju. O nweghị onye zuru oke, onweghị kwa ezinaụlọ ọbụla. Mgbe ndị kwesịrị ịhụ anyị nanya, lekọta, ma chekwa anyị emeghị otu ahụ, ọ neme ka ahapụwo anyị, mee anyị ihere ma wute anyị. Ezinaụlọ nwere ike bụrụ okpokoro ihe n’adịghị n’ime. Agbanyeghị, ejiri enyem aka nke eluigwe, anyị nwere ike ịghọta ezinaụlọ anyị ma mee udo onye ọbụla na ibe ya.17
Mgbe ụfọdụ, itinye uchu nke n’adịghị ada ada n’ime mmekọrịta kwụrụ chim nke ezinaụlọ na enyere anyị aka imezupụta ihe ndị siri ike. Na oge ụfọdụ, ogbe na abụ ezinaụlọ. Otu nwa nwanyị onye ezinaụlọ ya nwere nsogbu na agagharị ugboro ugboro chọtara otu Nzukọ nsọ ezinaụlọ dị ịhụnaanya ebe ọbụla ọnọ iji lekọta ma nye onwe ya ọnọdụ. Ihe nketa ma ụkpụrụ ezinaụlọ na emetụta kama ha anaghị eme anyị.
Chineke chọrọ ka ezinaụlọ anyị niile nwee obi ụtọ ma ruo mgbe niile. Ebighi ebi n’ete anya ma ọbụrụ na anyị mewe onwe anyị obi ọjọọ. Obi ụtọ dị nke nke ọbụrụ na mmekọrịta anyị hụrụ nanya kwụsị na ndụ a. Site na ọgbụgba-ndụ niile dị nsọ, Jizọs Kraịst na-enye ịhụnanya Ya, ike, na amara Ya iji gbanwe anyị18 ma gwọọ mmekọrịta anyị niile. Ije ozi nke tempụl maka ndị anyị hụrụ nanya n’eme ka aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta anyị dị ire maka ha na anyị. Nihi edowo anyị nsọ, anyị nwere ike ịlaghachi n’ihu nke Chineke dị ka ezinaụlọ niile ejikọtara ọnụ ebighi ebi.19
Akụkọ ọbụla nke anyị bụ otu njem ka n’aga n’ihu, dị ka anyị na achọpụta, mepụta, ma bụrụ ma nwee kwa ịhe ndị ga-ekwe omume karịa echiche anyị.
Onye amụma Josef Smit kwuru, ”Ọ ga-adịịrị ndị ụfọdụ ka ọ bụ ozizi siri ike ka anyị na-ekwu maka ya—ike nke na-edekọta akụkọ ma-ọbụ kechie n’ụwa na kechie n’elu-igwe.”20 Mmekọrịta ahụ anyị mere n’ebe a nwere ike ịdị na ebube ebighị ebi n’ebe ahụ.21 N’ezie, “anyị ma [ndị otù ezinaụlọ anyị] anọghi ya agaghị etozu-oke; ma-ọbụ ha nwere-ike ma anyị anọghị bụrụ ndị e mere ka ha zuo-oke,” nke a bụ, n’ime “otu njikọta zuru ezu ma tozuo oke.”22
Gịnị ka anyị nwere ike ime ugbua?
Nke mbụ, chegodi na oyiyi gi ka egosịrị ihu na azụ na etiti enyo abụọ nke ebigh ebi. n’ime otu ụzọ, hụta onwe gị dị ka ada, nwa nwa, nnukwu nwa nwa; n’akụkụ nke ọzọ, mụmụọrọ onwe gị ọnụ ọchị dị ka nwanne nne, nne, nne nne. Otu oge n’esi aga ngwa ngwa! Na oge ọbụla na ọrụ, mara onye gị na ya nọ. Kpokọta foto ha niile na akụkọ niile; mee ka ihe ncheta ha niile dịrị irè. Dekọọ aha ha niile, nhumihe niile, ụbọchị niile dị mkpa. Ha bụ ezinaụlọ unu—ezinaụlọ unu nwere na ezinaụlọ unu chọrọ.
Dị ka unu na-eje ozi tempụl maka ndị otù ezinaụlọ, mmụọ nke Elijah, “ihe ngosi nke Mmụọ Nsọ na agba ama maka ọdịdị dị nsọ nke ezinaụlọ,”23 ga ejikọta obi niile nke ndị nna, ndị nne unu, na ụmụaka ọnụ na ịhụnanya.24
Nke abụọ, ka njem nke akụkọ ezinaụlọ bụrụ ihe akpachapụrụ anya na nke ejiri obi ọcha mee. Kpọọ nne nne gị. Lee anya miri emi n’ime anya nke nwa ọhụrụ ahụ Wepụta oge—chọpụta ebighi ebi—na oge ọbụla nke njem gị. Mụta ma jiri ekele na eziokwu kweta ihe nketa ezinaụlọ gị. Mee emume ma bụrụ onye echiche ọma ma, ebe ọ dị mkpa, jiri obi umeala mee ihe niile kwere omume ka ịghara ịfefe ihe ọjọọ. Ka ihe ọma niile malite na gị.
Nke atọ, gaa na FamilySearch.org. Budata mobile apps dị ebe ahụ. Ha bụ na efu ma n’enye obi ụtọ. Chọpụta, jikọọ, sonye. Lee otu gị na ndị mmadụ nọ n’otu ọnụ ụlọ si nwe njikọ, ọ dịkwanụ mfe ma na akwụghachi ụgwọ ịgbakwunye aha niile nye osisi ezinaụlọ gị dị ndụ, ịchọta ma gozie mgbọrọgwụ gị na alaka gị niile.
Nke anọ,nyee aka jikọta ezinaụlọ niile ebighebi. Cheta igwe mmadụ nke eluigwe. Enwere ọtụtụ ndị ọzọ na akụkụ nke ọzọ nke ákwá mgbochi ahụ karịa n’akụkụ a. Dị ka tempụl ndị ọzọ na abịaru anyị nso, biko nye ndị ahụ na-echee maka emume nsọ niile tempụl ohere ị nabata ha.
Nkwa ahụ na Ịsta na mgbe ọbụla bụ na, nime na site na Jizọs Kraịst, anyị nwere ike bụrụ akụkọ kacha mma ma ezinaụlọ anyị nwere ike inwe obiụtọ ruo mgbe ebighebi. Nime ndudugandu niile nke anyị, Jizọs Kraịst na-agwọ ndị obi ha tiwara etiwa, na anapụta ndị a dọọrọ n’agha, tọhapụ ndị e merụrụ ahụ.25 Ọgbụgba ndụ isonye Chineke na onye ọbụla n’ime anyị26 gunyere ịmara na mmụọ na ahụ anyị ga-ejikọta ọzọ na mbilite n’onwụ ma mmekọrịta anyị kacha dị oke ọnụ ahịa nwere ike ịga n’ihu gafere ọnwụ na njupụta nke oke ọñụ.27
Onye ọbụla n’ime anyị nwere otu Akụkọ. Bia chọpụta nke gị. Bia chọta olu gị, abụ gị, udo gị nime Ya. Nke a bụ kpọmkwem nzube Chineke maka ikee eluigwe na ụwa ma hụ na ha dị mma.28
Too atụmatụ Chineke nke obi ọma, Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst, mweghachi na-aganiihu n’ozi ọma Ya na Nzukọ nsọ. Biko bia chọta ezinaụlọ gị, ndudugandu gị niile, ma kpọlata ha n’ụlọ Site na aha edoro nsọ na nke di nsọ nke Jịzọs Kraịst, amen