Ọgbakọ Zuru ọha
Ikuziiri Ụmụntakịrị na Ndị Ntoroọbịa Ndabere N’onwe
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2022


10:11

Ikuziri Ụmụntakịrị na Ndị Ntoroọbịa Ndabere N’onwe

Ka anyị soro Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, na ozi ọma Ya site n’ịdabere n’onwe oge ndụ anyị niile ma n’ikuziri ụmụ anyị na ndị ntoroọbịa anyị nkea.

Aga m ekwu banyere ndabere n’onwe na otu enwere ike isi kuziere ya ụmụntakịrị na ndị ntoroọbịa. Ndabere n’onwe ka enwere ike hụta dị ka ịbụ isiokwu maka ndị okenye. Abịawo m mata na ndị okenye nwere ike nọtazie n’ụzọ chere ihu na ndabere n’onwe mgbe akuziwooro ha ozi ọma nke Jizọs Kraịst ma bịa tinye ozizi na ụkpụrụ ya niile n’ọrụ kemgbe oge nwata ha na dị ka ntoroọbịa n’ebe obibi.

Ngosipụta kachasị mma bụ otu nnukwu ọmụmaatụ nke mere eme. Wilfried Vanie, ụmụnne ya asaa, na nne ya sonyere Nzukọ nsọ na Abidjan, Ivory Coast, mgbe ọ dị afọ isii. E mere ya baptizim nafọ asatọ. Nna ya, onyeisi n’arọpụta ihe n’ezi na ụlọ, nwụrụ mgbe Wilfried dị afọ iri na otu.

Agbanyeghị ọnọdụ ezi na ụlọ wutere ya, Wilfried kpebiri ịganiihu na ụlọakwụkwọ, site na mgbam ume nke nne ya na nkwado nke Nzukọ nsọ. Ọ gụchara ụlọakwụkwọ sekọndịrị ma jee ozi mishọn n’uju na Mishọn Ghana Cape Coast, ebe ọ mụrụ Bekee. Mgbe mishọn ya gwụsịrị, ọ garanihu na mahadum ma nwete diplọma nke ndekọ ego na ego. N’agbanyeghị na ọ rara ahụ inwete ọrụ na mpaghara nkea, ọ chọtara ọrụ na ụlọ ọrụ tourism na hospitality.

Ọ malitere dị ka onye na ekesa mmanya n’ime họteelụ five-star, mana mmasị ya imelite kwanyere ya ịmụta karịa tutu ruo ya a bụrụ onye nnabata na-asụ asụsụ abụọ. Mgbe emepere họteelụ ọhụrụ, e nyere ya ọrụ dị ka onye nnyocha anyasị. Emesịa, ọ banyere BYU-Pathway Worldwide ma ọ na-agụ inwete asambodo na njikwa hospitality na tourism na họteelụ. Ọchịchọ ya bụ ịbụrụ onye nchikwa nke nnukwu họtelu otu ụbọchị. Wilfried nwere ike ịrọpụta ihe maka nwunye ebighị ebi ya na ụmụ abụọ, nakwa na ịnyere nne ya na ụmụnne ya aka. Ugbua ọ n’eje ozi n’ime Nzukọ nsọ dị ka onye otu nke kansụl dị elu nke stek.

Ndabere n’onwe ka akọwara dị ka “ike ahụ, mkpebi, na mgbalị ịrọpụta mkpa ime mmụọ na nke anụ ahụ niile nke ndụ maka onwe na nke ezinaụlọ.”1 Ị na-agbalịsi ike ịdabere n’onwe bụ otu akụkụ ọrụ anyị n’okporo ụzọ nke ọgbụgba ndụ nke n’edu anyị laghachịkwuru Nna nke Eluigwe nakwa Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst. Ọ ga-agba okwukwe anyị n’ime Jizọs Kraịst ume ma jigide ya n’ọṅụ site na ọgbụgba ndụ niile na emume nsọ niile nke nzọpụta na mbuli elu. Ndabere n’onwe bụ otu ozizi nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst, ọbụghị atụmatụ. Ọ bụ usoro nke na-anọgide oge ndụ niile, ma ọ bụghị otu mmemme.

Anyị na-adabere n’onwe oge ndụ anyị niile site n’itolite na ume nke ime mmụọ, imelite ahụike nke anụ ahụ na mmetụta uche anyị, na-achụso agụmakwụkwọ anyị na ọrụ anyị, na ịdị njikere n’anụ ahụ.2 Ọ bụ na-enwere ike imecha ọrụ a n’oge ndụ anyị? Mba, ọ bụ usoro oge ndụ niile nke mmụta ihe, uto, na ọrụ. Ọ dịghị agwụagwụ; ọ bụ usoro kwa ụbọchi na-aga n’ihu.

Olee otu anyị nwere ike isi kuziere ụmụ anyị na ndị ntoroọbịa anyị ozizi na ụkpụrụ niile nke ndabere n’onwe? Otu ụzọ dị mkpa bụ itinye kwa mgbe kwa mgbe ụkpụrụ niile nke Atụmatụ nke Ụmụntakịrị na ndị Ntoroọbịa. Ndị nne na nna na ụmụntakịrị na-amụ ozi ọma nke Jizọs Kraịst, sonye na ije ozi na ihe omume niile, ma rụkọta ọrụ ọnụ na mpaghara anọ nke ntolite nke onwe nke pụrụ iche maka nwata ọbụla. Ọ bụghịkwa otu ụdị atụmatụ ahụ ahọpụtara maka onye niile.

Akwụkwọ ntuziaka nke Ụmụntakịrị n’ekwu: “Mgbe Jizọs bụụrụ ọgbọ gị, Ọ mụtara ihe ma too. Ị na-amụkwa ma n’etọ. Akwụkwọ nsọ kwuru sị: “Jizọs mụbara na-amamiihe ma n’ogo, na-aga kwa n’amara n’ebe Chineke na mmadụ nọ’ (Luk 2:52).”3 Akwụkwọ nsọ na-ahụta uto na mmụta ihe n’akụkụ ime mmụọ, amara n’ebe Chineke nọ; akụkụ mmekọrịta n’etiti mmadụ, amara n’ebe mmadụ nọ; n’akụkụ anụ ahụ, ogo; na n’akụkụ ọgụgụ isi, amamiihe. Akụkụ ntolite ndịa tụnyeere anyị, niile na-agbanyeghị afọ ole anyị gbara. Mgbe ole ka anyị ga-akuziri ha? N’ime Ditoronomi 6:6-7 anyị na-agụ:

“Ma okwu ndịa, nke mụ onwe m n’enye gị n’iwu taa, ga-anọ n’ime obi gị:

“Ma ị ga-ejisi ike kuziere ha ụmụ gị, ma ga-ekwu maka ha mgbe ị nọdụ ala n’ime ụlọ gị, na mgbe ị na-aga ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.”

Anyị na-akuzi ihe ndịa nye ụmụntakịrị site n’ọmụmaatụ dị mma, site n’ịrụ ọrụ ma na ejere ha ozi, na-amụ akwụkwọ nsọ, ma n’esoro nkuzi niile nke Jizọs Kraịst dị ka akuziri site n’aka ndị amụma.

Ekwuwo m na n’ime atụmatụ nke Ụmụntakịrị na ndị Ntoroọbịa, ụmụntakịrị na-ahọrọ ebumnobi dị iche iche n’ime nke ọbụla n’akụkụ ntolite anọ ahụ. Ọ dị mkpa na ha mepụtara ebumnobi nke onwe ha n’akụkụ nke ọbụla. Ndị nne na nna na ndị ndu nwere ike ikuzi, dụọ ndụmọdụ, na nye nkwado.

N’ịmatụ, nwa nwa anyị nwanyị Miranda nwere oke mkpali ito n’ime mmụọ site n’isoro na klas seminarị isi ụtụtụ kwa ụbọchị. Ọ bịara nwee mmasị site n’ịnụta okwu ndị dị mma n’aka ụmụakwụkwọ seminarị ndị ọzọ dị n’ime ngalaba ukwu ya. Ọ bụghị nne ya ga-akpọte ya maka klas. N’onwe ya, ọ na-eteta ma banye na ọgbakọ vidio n’oge akara aka nke 6:20 nke ụtụtụ n’ihi na ọ nwetawo agwa dị mma nke n’enyere ya aka ime otu ahụ. Ndị nne na nna m gwara m na nsọ nsọ a na Miranda ugbua n’ekwuzi karịa mgbe ọ bịara ileta ha, dị ka o toliteworo n’obisike nke onwe. Ndịa bụ ihe mmụta maka ndụ na uto nwere ihe mpụta ahụrụ anya.

Ndị nne na nna, ndị nne na nna nke ukwu, ndị ndu, na ndị enyi n’enye aka na uto na ntolite nke ụmụntakịrị. Ndị ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị jiri obi ha niile n’eje ozi nlekọta, ha na ndị ndu ọkwa nchụaja na ndị ndu otù dị na ngalaba ukwu, n’ewete nkwado. “Ezi na Ụlọ Ahụ: Ọkwa Amara nye Ụwa” na-asị: “Site na nchepụta si na chi, ndị nna ga-achị isi n’ezi na ụlọ ha n’ihunaanya na ezi omume ma ọ dịịrị ha inweta ihe niile dị mkpa nke ndụ na nchekwa maka ezi na ụlọ ha. Ndị nne nwere ọrụ mbụ dịịrị ha maka nzulite nke ụmụ ha. N’ime ọrụ niile ndị a dị nsọ, ndị nna na ndị nne nwere ọrụ inyeritara aka otu onye na ibe ya dị ka ndị mmekọta ihe dị ahata aha. … Ndị ezi na ụlọ nne ma ọ bụ nna kwesịrị inye aka mgbe e nwere mkpa ya.”4 Ahịrị nke ikpeazụ ahụ n’ekwu maka ndị nne na nna nke ukwuu, n’etiti ndị ọzọ.

Dị ka anyị n’eje ozi n’ime Ọdịda anyanwụ Afrịka, nwunye m, Nuria, arụwo ọrụ dị iriba ama ilekọta nye na ịnọgide na mmekọ ya na ndị ezi na ụlọ na ụmụ ụmụ anyị n’ofe oke osimiri. Ọ na-eme nke a site n’ụzọ teknụzu. Ọ na-agụrụ ụmụ ụmụ anyị ndị obere. Ọ na-akuziri ụmụ ụmụ anyị ndị nwanyị toliterenụ isiokwu ndị nke akụkọ nke ezi na ụlọ anyị, sayensị, agụgụala nke Puerto Rico, Ndepụta nke Okwukwe, na ozi ọma nke Jizọs Kraịst. Ntọanya n’ụbọchị ugbua anaghị ebelata njiko mmekọ, nsonyere, na ije ozi nlekọta nye na ikuziri ndudugandu n’etolite etolite nke ezi na ụlọ anyị. Ana m esokwa Nuria mgbe m nwere ike ikuziri ọmarịcha ụmụ ụmụ anyị, ịhụ ha n’anya, ma imebi ha ma ime ha achịa ọchị.

I kwesịrị ịhụta myirịta sitere n’ike mmụọ nsọ n’etiti atụmatụ Ụmụntakịrị na ndị Ntoroọbịa na iwulite ndabere n’onwe. Akụkụ anọ niile nke ntopụta n’ime nke ọbụla yiri onwe ha nnọọ. Ume ime mmụọ n’ime ndabere n’onwe metụtara na ime mmụọ dị n’ime atụmatụ Ụmụntakịrị na ndị Ntoroọbịa. Ahụike anụ ahụ na mmetụta uche nke ndabere n’onwe jikọrọ n’akụkụ niile nke anụ ahụ na nke mmekọrịta n’etiti mmadụ n’ime Ụmụntakịrị na ndị Ntoroọbịa. Agụmakwụkwọ, ọrụ, na njikere nke anụ ahụ nime ndabere n’onwe yiri akụkụ ọgụgụ isi dị n’ime atụmatụ Ụmụntakịrị na ndị Ntoroọbịa.

Na mmechi, ka anyị soro Onye Nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, na ozi ọma Ya site n’ịdabere n’onwe oge ndụ anyị niile, ma n’ikuziri ụmụ anyị na ndị ntoroọbịa anyị nkea. Anyị nwere ike imetazicha nke a site na

  1. ịbụrụ ọmụmaatụ dị mma nke ije ozi nye ndị ọzọ.

  2. ibi ndụ na ikuzi ozizi na ụkpụrụ niile nke ndabere n’onwe, ma

  3. irube isi nye iwu nsọ iji wulite ndabere n’onwe dị ka akụkụ nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst.

Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 104:15–16 na-ekwu:

“Ọ bụ nzube m ị rọpụta ihe maka ndị nsọ m, n’ihi na ihe niile bụ nke m.

“Mana ọ dị mkpa ka e mee ya n’ụzọ nke m; ma lee nke a bụ ụzọ ahụ bụ nke mụ onwe m, Onyenwe, maworo ọkwa iji rọpụtara ndị nsọ m, na ndị ogbenye bụrụ ndị ebuliri elu, nke bụ na ndị ọgaranya ka ewedara ala.”

Nke a bụ Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst. Ozi ọma ya na-agọzi ezi na ụlọ niile dị n’elu ụwa na gburugburu ebighị ebi niile. Ọ na-edu anyị na ndụ anyị dị ka anyị n’agbalị ịbụ ezi na ụlọ dị ebighị ebi. Ama m na nke a bụ eziokwu. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Hụba-ama

  1. Akwụkwọ ntụzi aka Izugbe: Ije ozi na Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchi ikpeazu a, 22.0, ChurchofJesusChrist.org.

  2. Lee General Handbook, 22.1.

  3. Ntolite nke Onwe: Akwụkwọ odudu nke Ụmụntakịrị (2019), 4.

  4. Ezị-na-ụlọ Ahụ: Ọkwa amara nye Ụwa,” ChurchofJesusChrist.org.