N’ihi na Chineke Hụrụ Anyị N’anya Nke Ukwuu
Chineke hụrụ anyị nanya nke ukwuu mere O ji zita Ọkpara Ọ Mụrụ Nanị Ya—ọbụghị ikpe anyị ikpe, kama ịzọpụta anyị.
“N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”(Jọn 3:16). Oge mbụ M nụrụ amaokwu nke a, A nọghị m na ụlọ ụka mọbụ nime nnọkọ mgbede ezinaụlọ. A nọ m na ele mmemme egwuregwu na televishịọn. Agbenyeghị steshịọn ọbụla m lere, ma agbanyeghị egwuregwu nke ọbụ, opekata mpe otu onye jiri ihe gosiri “Jọn 3:16.”
A mụtagwala m ịhụ nanya amaokwu 17: “Maka Chineke ezitaghị Ọkpara ya nime ụwa ka ọma ụwa ikpe; kama na site na ya ụwa ga enwe nzọpụta.”
Chineke zitere Jizọs Kraịst, nanị Ọkpara Ya nime anụ ahụ, ka ọtọgbọ ndụ Ya maka onye ọbụla nime anyị. Nke a ka omere maka Ọ hụrụ anyị nanya ma mee otu atụmatụ ka onye ọbụla nime anyị laghachi n’ebe obibi Ya.
Kama nke a abụghị otu blanket, jide ha niile, ụdị atụmatụ nke ndị enwetara na ndị enwetaghị. Ọ dịrị onye, emepụtara site n’aka Nna nke Eluigwe hụrụ anyị nanya, onye maara obi anyị niile, aha anyị niile, na ihe Ọ chọrọ ka anyị mee. Gịnị mere anyị ji kwere nke a? Maka na akuziri anyị ya nime akwụkwọ nsọ niile.
Moses nụrụ ugboro ugboro ka Nna nke Eluigwe kwuru okwu niile ahụ “Moses, nwa m nwoke” (lee Moses 1:6; lee kwa verses 7, 40). Abraham matara na ya bụ nwa nke Chineke, a họpụtara maka ozi ya ọbụna tupu a mụọ ya (lee Abraham 3:12, 23). Site n’aka nke Chineke, edobere Esther na ọnọdụ nke dị elu ịzọpụta ndị ya (lee Esta 4). Ma Chineke tụkwasịrị otu nwa nwanyị obi, onye odibo, ka ọ gbaa ama maka onye amụma dị ndụ ka enwee ike gwọọ Naaman (lee 2Ndị Eze 5:1-15).
A hụrụ m nwoke ọma ahụ nanya n’ụdị pụrụ iche, onye dị mkpụ mkpụ, onye rigoro osisi ịhụ Jizọs. Onye nzọpụta maara na ọ nọ na ebe ahụ, kwụsị, lelie anya elu na alaka niile, ma kwuo okwu ndị a: “Zacchaeus, … rịdata ala” (Luk 10:5). Ma anyị enweghị ike ichefu nwa nwoke gbara afọ 14 onye banyere nime uzo nke osisi ma mata otu nke onwe atụmatụ ahụ dị n’ezie: “[Josef,] nke a bụ Ọkpara M Hụrụ N’anya. Nụrụ olu Ya!” (Joseph Smith—Agụgụala 1:17).
Ụmụnne nwoke na nwanyị, ọbụ anyị ka atụmatụ nke Nna nke Eluigwe lekwasịrị anya ma bụrụ ihe kpatara ozi nke Onye nzọpụta anyị. Onye ọbụla nime anyị, otu na otu, bụ ọrụ Ha na ebube Ha.
Na anya m, onweghị akwụkwọ nke akwụkwọ nsọ na akọwa nke a na ụzọ doro anya karịa ọmụmụ m nke Agba Ochie ahụ. Si na isiokwu ruo isiokwu anyị na achọpụta ịmaatụ niile otú Nna nke Eluigwe na Jehovah si metụta mmekọrịta chiri anya nime ndụ anyị niile.
Anyị na amụ banyere Josef na oge na adịbeghị anya, ọkpara Jekọb hụrụ naanya. Malite na oge ọ bụ nwata, Josef nwere ihu ọma Onyenweanyị nke ukwuu, ma o nwetara ọnwụnwa dị ukwuu naka niile ụmụnne ya nwoke. Izu ụka abụọ gara aga, ometụrụ ọtụtụ nime anyị na ahụ otú Josef jiri gbaghara ụmụnne ya nwoke. Nime Bia, Soro M anyị gụrụ: “Na ọtụtụ ụzọ, ndụ nke Josef dị ka nke Jisọs Kraịst. Agbanyeghị na mmehie anyị niile tara Ya ahụhụ dị ukwuu, Onye nzọpụta ahụ na enye mgbaghara, na anapụta anyị niile na ọnọdụ dị njọ ukwuu karịrị ụnwụ. Ma anyị kwesịrị ịnata mgbaghara mọbụ nyee ya— na oge ụfọdụ anyị niile kwesịrị ime ha abụọ—ihe ịmaatụ nke Josef na atụrụ anyị aka nebe Onye nzọpụta nọ, ezi isi iyi nke ọgwụgwọ na ime n’udo.”1
Nkuzi na amasị m na akụkọ ahụ sitere n’aka nwanne nwoke Josef bụ Judah, onye ketara oke na atụmatụ onwe nke Chineke maka Josef. Mgbe ụmụnne ya raara Josef nye, Judah gwara ha ka ha ghara igbu Josef kama ire ya ka ọ bụrụ ohù (lee Jenesis 37:26-27).
Ka ọtụtụ afọ gachara, Judah na ụmụnne ya nwoke kwesịrị ịkpọrọ nwanne ha nke nwoke kachasị nta, Benjamin, ga Ijipt. Na mbụ nna ha jụrụ. Kama Judah kwere Jekob nkwa—ọ ga akpọlata Benjamin n’ụlọ.
Na Ijipt, e tinyere nkwa nke Judah na mnwale. E boro nwa okorobịa Benjamin ebubo n’ụzọ na ezighị ezi maka mpụ. Judah, na imezu nkwa ya, kwere ka a tụọ ya mkpọrọ n’ọnọdụ Benjamin. “Maka,” o kwuru, “o lee ka m ga esi rigoro na ebe nna m nọ, ma nwa okoro ahụ esoghị m?” (lee Jenesis 44;33–34). Judah kpebisiri ike imezu nkwa ya wee kpọghachi Benjamin n’udo. Ọ dịtụla mgbe ị na eche banyere ndị ọzọ ka Judah si chee gbasara Benjamin?
Ọ bụna ọbụghị otú a ka ndị nne na nna si ele ụmụ ha ? Otú ndị mgbasa oziọma si ele ndị ha na ejere ozi? Otú ndị ndụ Praịmarị na ndị ntorobịa si ele ndị ha na akuziri ma hụ ha nanya?
Agbanyeghị onye ịbụ mọbụ ọnọdụ gị niile, otu onye na enwe mmetụta dị otú a maka gị. Otu onye chọrọ iso gị laghachikwuru Nna nke Eluigwe.
Enwere m ekele maka ndị na adịghị ada mba na anyị, ndị nọgidere na awụpụ mkpụrụ obi ha n’ekpere maka anyị, na ndị na aga n’ihu na akụzi ma na enyere anyị aka iru eru ịlaghachi na ebe obibi nke Nna anyị nke Eluigwe.
Na oge na adịbeghị anya otu ezigbo enyi nọrọ ụbọchị 233 n’ụlọ ọgwụ ya na COVID-19. Na oge ahụ, nna ya nwụrụ anwụ bịara leta ya, onye rịọrọ ka e ziga ozi nye ụmụ ụmụ ya. Ọbụna site na ofe ákwá mgbochi ahụ, ezigbo nna nna nke a chọrọ inyere ụmụ ụmụ ya aka ịlaghachi ebe obibi eluigwe ha.
Na abawanye, ndị na eso ụzọ Kraịst na echeta ndị “Benjamin” nime ndụ ha niile. Na ofe ụwa ha anụla okù nke onye amụma dị ndụ nke Chineke, Onye-isi Russell M. Nelson. Ndịikom nta na ndịiyom nta na-eje ozi nime batalịọn ndị ntorobịa nke Onyenweanyị. Ndị mmadụ n’otu n’otu na ezinaụlọ niile na agba mbọ na mmụọ nke ije ozi nleta—ịhụnanya, ịkekọrịta, na ịkpọ ndị enyi na ndị agbata obi ka ha bịakwute Kraịst. Ndị ntorobịa na ndị toro eto na echeta na agba mbọ ịdobe ọgbụgba ndụ ha niile—na ejupụta nime tempụl niile nke Chineke, na achọta aha niile nke ndị ezinaụlọ niile nwụrụ anwụ, ma na anata emume nsọ niile n’aha ha.
Gịnị mere atụmatụ Nna nke Eluigwe haziri maka anyị na agụnye iji nyere ndị ọzọ aka ịlaghachikwute Ya? Nihi na otu a ka anyị ji adịrị ka Jizọs Kraịst. Na ịkpeazụ, akụkọ Judah na Benjamin na akụziri anyị gbasara ájá Onye nzọpụta ahụ chụrụ maka anyị. Site na ájá mgbaghara mmehie Ya, O nyere ndụ Ya ka o dula anyị ụlọ. Mkpụrụ okwu nile nke Judah kwupụtara ịhụnanya nke Onye nzọpụta: “o lee ka m ga esi rigoro na ebe nna m nọ, ma [gị] esoghị m?” Dịka ndị mkpọkọta Israel, ndị ahụ nwekwara ike ịbụ okwu anyị.
Agba Ochie jupụtara na ọrụ ebube niile obi ebere niile bụ ihe ngosi nke atụmatụ Nna nke Eluigwe. Nime 2 Ndị Eze 4, okwu ahụ “ọ dara na ụbọchị” ka ekwuru ugboro atọ iji emesi ike na ihe omume dị mkpa na eme dị ka oge Chineke si dị, ma ọ dịghị nkọwa dị ntakịrị karịa ya.
Enyi ọhụrụ m Pọl gbara ama nke eziokwu nke a. Pọl tolitara n’ụlọ a na akparị mmadụ mgbe ụfọdụ ma na adịghị anabata okpukpechi mgbe niile. Mgbe ọ na aga akwụkwọ na ọdụ ndị agha na Germany, ọ hụrụ ụmụnne nwanyị abụọ yiri ka ha nwere ihè mmụọ. Ịjụ ihe mere ha ji dị iche wetaara azịza nke bụ ha na bụ ndị otù Nzukọ-nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndi-nsọ Ụbọchi Ikpeazụ a.
N’oge na adịghị anya Pọl malitere izute ndị mgbasa oziọma ma a kpọkwara ya okù ịbịa nzukọ-nsọ. Sọnde na esote, ka o siri na bọs pụta, ọ hụrụ ndị ikom abụọ yi uwe ọcha na taị. Ọ jụrụ ma ha bụ ndị okenye nke Nzukọ-nsọ ahụ. Ha zara ee, ya mere Pọl sooro ha.
N’oge ozi ahụ, otu onye nkwusa oziọma tụrụ aka n’ebe ndị mmadụ nọ ma kpọọ ha ka ha gbaa akaebe. Na ngwụcha nke akaebe ọbụla, onye na akụ drọm nyere ụda ekele ma ndị mmadụ wee tie, “Amen.”
Mgbe onye nkwusa tụrụ Pọl aka, o guzoro ma kwuo, “A ma m na Josef Smit bụụrụ onye amụma ma na Akwụkwọ nke Mọmọn bụ eziokwu.” Enweghị ekele drọm mọbụ amens. Paul mechara chọpụta na ya gawara nzukọ-nsọ okwesighị ịga. N’oge na adịghị anya, Pọl gara ebe kwesịrị ekwesị ma mee baptizim.
Na ụbọchị emere Pọl baptism, onye otu na-ọmaghị gwara ya, “Ị zọpụtara ndụ m.” Izu ụka ole na ole gara aga, nwoke nke a kpebirila ị chọta nzukọ-nsọ ọzọ ma gaa okpere ebe enwere ọtụtụ ịgbaa na ọtụtụ amen. Mgbe nwoke ahụ nụrụ ọgbụgba ama nke Pọl banyere Josef Smit na Akwụkwọ nke Mọmọn, ọ matara na Chineke maara ya, mata ịgba mbọ ya niile, ma nwee atụmatụ maka ya. Maka Pọl na nwoke ahụ, “ọ dara na otu ụbọchị,” n’ezie!
Anyị makwara na Nna nke Eluigwe nwere atụmatụ onwe nke obi ụtọ maka onye ọbụla nime anyị. Nihi na Chineke zitara Ọkpara Ya Ọ hụrụ Nanya maka anyị, ọrụ ebube niile ahụ anyị chọrọ ga “[ada] na ụbọchị [ahụ]” dị mkpa ka atụmatụ Ya mezuo.
A na m agba ama na afọ nke a anyị nwere ike ịmụta karịa gbasara atụmatụ nke Chineke maka anyị nime Agba Ochie. Akwụkwọ nsọ ahụ na akuzi ọrụ nke ndị amụma nime oge niile amaghị ama na aka nke Chineke nime ụwa nke ọgba aghara na ekweghị ekwe dị. Ọ bụ kwa gbasara ndị kwere ekwe na obi umeala ndị jiri okwukwe lekwasị anya na ọbịbịa nke Onye nzọpụta anyị, dịka anyị na elekwasị anya nye ma kwado maka Nke Abụọ Ọbịbịa Ya—nlọghachi Ya dị ebube nke eburu n’amụma. mgbe gboo.
Tutu ụbọchị ahụ, anyị apụghị ịhụ jiri anya nkịtị anyị atụmatụ nke Chineke maka ihe niile gbasara ndụ anyị (lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 58:3). Mana anyị nwere ike cheta ọzịza nke Nifaị mgbe ọhụrụ ihe ekweghị ya nghọta: ka ọ maghị ihe ihe niile pụtara, ọ mara na Chineke hụrụ ụmụ Ya nanya (lee 1 Nifaị 11:17.).
Nke a bụ aka ebe m na ụtụtụ ọma Sabbath nke a. Ka anyị depụta ya na obi anyị niile ma kwere ka o were udo, olile anya, na ọńụ jupụta mkpụrụ obi anyị: Chineke hụrụ anyị nanya nke ukwuu mere O ji zita Ọkpara Ọ Mụrụ Nanị Ya—ọbụghị ikpe anyị ikpe, kama ịzọpụta anyị. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen