Ọgbakọ Zuru ọha
Mgbanwe ruo na Uche Chineke
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2022


13:27

Mgbanwe ruo na Uche Chineke

Mgbanwe nke onwe anyị gụnyere oke na ọrụ ikesa ozi ọma nke Jizọs Kraịst n’ime ụwa.

Obi juru m n’ekele maka ọkpụkpọ okù amụma siri ike nke Onyeisi Russell M. Nelson n’ije ozi mgbasa ozi ọma na ozi mgbasa ozi ọma nke Onyeisi M. Russell Ballard na nke Okenye Marcos A. Aidukaitis na-akpake mmụọ taa.

Ọrụ mgbasa ozi ọma na Great Britain ngwụcha afọ ikpeazụ gara aga nyere m ohere ịtụgharị uche na mmemme ime mmụọ dị oke ọnụ ahịa nke bụụrụ ntọala nye mkpebi m iji jee ozi dị ka onye mgbasa ozi ọma.1 Mgbe m gbara afọ 15, nwanne m nwoke ukwu, Joe, gbara 20—afọ ntozu oke iji jee ozi mishọn. N’ime United States, n’ihi esemokwu ndị Koria, ole na ole ka e kwere ije ozi. Naanị otu ka e nwere ike ịkpọ site na ngalaba ukwu n’otu afọ.2 Ọ bụụrụ ihe ijuanya mgbe bishọp anyị gwara Joe na nna anyị ka ha nyochaa ma nke a ọ ga-ekwe omume. Joe naara akwado itinye akwụkwọ maka ụlọakwụkwọ ahụike. Nna anyị, onye na-adịghị ike n’okwukwe n’ime Nzukọ nsọ, emeworịị nkwado banyere ego iji nyere ya aka ma ọ masịghị ya Joe ịga mishọn. Nna tụpụtara na Joe ga-emepụtali ihe dị mma karịa site n’ịga ụlọakwụkwọ ahụike. Nkea bụụrụ nnukwu okwu n’ime ezi na ụlọ anyị.

Na mkparịta ụka pụrụ iche anyị na nwanne m nwoke ukwu maara ihe bụ ezi ihe nṅomi, anyị kwubiri na mkpebi ya ma ọ ga-eje ozi mishọn ma gbuo oge n’agụm akwụkwọ ya dabeere n’ajụjụ atọ: (1) Jizọs Kraịst ọ sikwa na chi? (2) Akwụkwọ nke Mọmọn ọ bụ okwu nke Chineke? ma (3) Josef Smith ọ bụ Onye Amụma nke Mweghachite? Ọ bụrụ na azịza nye ajụjụ ndịa bụ ee, o doro anya na Joe nwekwara ike mee ihe dị mma iwere ozi ọma nke Jizọs Kraịst nye ụwa karịa ịbụrụ dọkịnta ụbọchị nso nso.3

N’abalịa ahụ e kpesịrị m ekpere ike ma jiri ezi nzube. Mmụọ ahụ, n’ụzọ siri ike n’enweghị ngọnahụ, kwadokwara m na azịza nye ajụjụ atọ niile ndịa bụ eziokwu. Nke a bụ ihe omume mmalite nye m. A bịara m mata na mkpebi ọbụla m ga-eme n’oge ndụ m niile fọdụrụ ka eziokwu ndịa ga-emetụta. A makwaara m na m ga-eje ozi mishọn ma ọ bụrụ enye m ohere. Níme oge ndụ niile nke ije ozi na nhụmiihe niile nke ime mmụọ, a bịawo m ghọta na ezigbo mgbanwe bụ ịhe mpụta si nime nnabata nke uche Chineke akpachapụrụ anya mee ma na e nwere ike duo anyị n’ihe ndị anyị na-eme site n’aka Mmụọ Nsọ.

Enwewo m ọgbụgba ama nke ịdị nsọ nke Jizọs Kraịst na mbụ dị ka Onye Nzọpụta nke ụwa. N’abalị ahụ a natara m ọgbụgba ama nke ime mmụọ nke Akwụkwọ nke Mọmọn4 na Onye Amụma Josef Smith.

Josef Smith Bụ Ngwa ọrụ n’Aka nke Onyenwe anyị.

Ama gị ka a ga-agba ume mgbe ị matara n’ime obi gị site n’ekpere na Onye Amụma Josef Smith bụ ngwa ọrụ n’aka nke Onyenwe anyị. N’oge afọ asatọ ndị gara aga, otu nime ọrụ m nime Ndị Ozi Iri na Abụọ bụ inyochagharị ma gụọ akwụkwọ Josef Smith niile dị ịrịba ama na nnyocha nke dubara na mbipụta nke ukwu akwụkwọ niile nke Ndị Nsọ niile.5 Ama na mmasị m nke Onye Amụma Josef Smith enwetewo nnukwu mgbam ume ma melite mgbe m gụsịrị nkọwa niile na akpate mmụọ nke ndụ ya na ozi nlekọta amụma ya eburu n’amụmụ.

Ntụgharị asụsụ nke Josef Smith nke Akwụkwọ nke Mọmọn site n’onyinye na ike nke Chineke bụ ntọala nye Mweghachite ahụ.6 Akwụkwọ nke Mọmọn bụ nke n’enweghị mgbanwe n’ime ya, edeziri nke ọma, ma nwee azịza niile nke oke ajụjụ niile nke ndụ. Ọ bụ ama ọzọ nke Jizọs Kraịst. Ana m agba ama na Josef Smith bụ onye ezi omume, jupụtara n’okwukwe, ma bụrụ ngwa ọrụ n’aka nke Onyenwe anyị n’ịwepụta Akwụkwọ nke Mọmọn.

Mkpugbe niile na ihe omume niile edere n’ime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile n’ewete ọtụghe niile, emume nsọ niile, na ọgbụgba ndụ niile dị mkpa maka nzọpụta na mgbapụta. Ha anaghị ekwupụta naanị ihe ndị dị mkpa achọrọ iji mepụta Nzukọ nsọ mana ọzọkwa n’ewete ozizi dị omimi nke na-ekwe anyị ịghọta ebumnuche nke ndụ ma na-enye anyị echiche dị ebighị ebi.

Otu n’ime ọtụtụ ọmụmaatụ nke ọrụ amụma nke Josef Smith ka a na-ahụta n’ime nkeji nke 76 nke Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile Ọ bụ ndekọihe doro anya nke ọhụ nke eluigwe, tinyekọta alaeze otuto niile, nke agọziri Onye Amụma Josef Smith na Sidney Rigdon ịnata na Febuwarị 16, 1832. N’oge ahụ, ọtụtụ n’ime nzukọ nsọ niile naara akuzi na Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta agaghị ewetere ọtụtụ ndị mmadụ nzọpụta. E kwere na ole ma ole ka a ga-agọzi, ma ọtụtụ ka a ga-ebibi ruo ọkụ mmụọ na ikpe ọmụma, tinyekọta ntaram ahụhụ n’enweghị ọgwụgwụ “nke isi ike ya kachasị dị egwu ọnụ n’apụghị ikwu.”7

Mkpughe nke dị n’ime nkeji nke 76 wetere ọhụ dị ebube nke ogo nke otuto ebe ọtụtụ n’ime ụmụ Nna nke Eluigwe ndị dị ike n’ọnọdụ ndụ anụ ahụ ha ka a gọziri nke ọma n’isote ikpe kachasị.8 Ọhụ nke ogo nke otuto atọ ndị ahụ, nke kachasị nta ọbụna nke “gafere nghọta niile,”9 bụ nkwuputa kpọmkwem nke ozizi mgbe ahụ siri ike mana ezighi ezi na ọtụtụ ka a ga-ebibi ruo ọkụ mmụọ na ikpe ọmụma.

Mgbe ị matara na Josef Smith gbara naanị afọ 26, nwere agụmakwụkwọ obere, ma maara obere ma ọ bụ enweghị nke ọ maara n’asụsụ oge gboo nke esitere na ya tụgharịa asụsụ Baịbụl, ọ bụ n’ezie ngwa ọrụ n’aka Onyenwe anyị. N’ime amaokwu 17 nke nkeji 76, mmụọ ya kpatere iji mkpụrụ okwu ahụ ezighị ezi kama nke ikpe ọmụma nke e jiri nime Ozi ọma nke Jọn.10

Ọ na-adọrọ mmasị na afọ 45 gasịrị onye ndu nzukọ nsọ Anglican na ọkà mmụta oge gboo nwere nzere nke agụmakwụkwọ,11 Frederic W. Farrar, onye dere Ndụ nke Kraịst,12 kwuputara na nkọwa nke ikpe ọmụma n’ime Vashọn Eze Jemis nke Baịbụl bụ n’ihi ndejọ ntụgharị asụsụ niile sitere na Hibru na Grik ruo Inglish.13

N’ụbọchị anyị, ọtụtụ anabatawo echiche ahụ na ekwesịghị inwe mpụtara maka njọ. Ha na-akwado nkwado njọ na-amaghị oke na-enweghị nchegharị. Ozizi anyị ekpughere anaghị naanị agbagha echiche ahụ na ọtụtụ ndị mmadụ ka a ga-ama ikpe ebighị ebi ruo na ọkụ mmụọ na ikpe mana ọzọkwa n’ekwupụta na nchegharị nke onwe bụ ihe achọrọ n’iwu iji rite Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta ma keta oke alaeze celestial.14 Ana m agba ama na Josef Smith bụ ngwa ọrụ n’aka nke Onyenwe anyị n’ịwepụta Mweghachite nke ozi ọma Ya.

N’ihi Mweghachite nke ozi ọma nke Jizọs Kraịst, anyị na-aghọta mkpa nke ma nchegharị dị makwa “ọrụ niile nke ezi omume.”15 Anyị na-aghọta nnukwu mkpa nke Aja mgbaghara mmehie nke Onye Nzọpụta na emume nsọ na ọgbụgba ndụ Ya niile na-azọpụta, tinyekọta ndị ahụ a na-eme n’ime tempụl.

“Ọrụ niile nke ezi omume” na-esite na ma bụ mkpụrụ niile nke mgbanwe. Ịkpachapụ anya nabata uche nke Chineke ma ikpebi obi isoro nke a, n’ewete ezi mgbanwe.16 Nsonazụ dị iche iche na ngọzi niile nke n’esite na mgbanwe apụta bụ eziokwu ma udo adịgịde na nkwa nke onwe nke obi ụtọ kachasị17—agbanyeghị ufufe niile nke ndụ.

Mgbanwe na Onye Nzọpụta na-agbanwe mmadụ anụ ahụ ịbụrụ onye e doro nsọ, amụgharịrị ọzọ, dị ọcha—ekereke ọhụrụ n’ime Kraịst Jizọs.18

Ọtụtụ Ka E Debere site n’Eziokwu N’ihi na Ha Amaghị Ebe a Ga-achọta Ya

Kedụ ihe bụ ọrụ ndị na-esi na mgbanwe apụta? N’ime mkpọrọ Liberty Onye Amụma Josef Smith kwuru na ọtụtụ “ka e debere site n’eziokwu n’ihi na ha amaghị ebe a ga-achọta ya.”19

N’ime okwu mmalite nke Onyenwe anyị nye Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, nnukwu nkọwa nkwupụta nke ebumnuche nke Onyenwe anyị maka anyị ka enyere. O kwupụtara, “Ya mere, mụ onwe m Onyenwe, ebe m maara ọdachi ga-adakwasị mmadụ niile bi n’ime ụwa, kpọrọ odibo m Josef Smith, Nta, ma gwa ya okwu site n’eluigwe, ma nyekwa ya iwu nsọ niile.” Ọ gara n’ihu ikuzi “Na uju nke ozi ọma ka e nwere ike ịma ọkwa site n’aka ndị n’adịghị ike n’adịghị aghụghọ nye nsọtụ niile nke ụwa.”20 Nke ahụ gụnyekọtara ndị mgbasa ozi ọma n’uju oge. Nke ahụ gụnyekọtara onye ọbụla nime anyị. Nkea kwesịrị ịbụ ilekwasị anya dị ka laser nye onye ọbụla nke ejiworo mgbanwe ruo na uche Chineke gọzie. Onye Nzọpụta ji amara akpọku anyị ịbụrụ olu Ya na aka Ya.21 Ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta ga-abụ ìhè na-eduzi anyị. Onye Nzọpụta kuziri ndị na-eso ụzọ Ya, “Ya mere gaanụ, ma kuziere mba niile.”22 Ma nye Josef Smith, Ọ kwupụtara, “Kwusaa ozi ọma m nye okike niile ndị na-anatabeghị ya.”23

Otu ọnwa mgbe nranye nke Tempụl Kirtland na Epril 3, 1836 gasịrị, nke bụ Ista Sọnde nakwa Ngabiga, Onyenwe anyị pụtara n’ọhụ dị ebube nye Josef na Oliver Cowdery. Onyenwe anyị nabatara tempụl ahụ ma kwupụta, “Nke a bụ mmalite nke ngọzi nke a ga-awụpụta n’isi ndị nke m.”24

Mgbe ọhụ nke a mechiri, Moses pụtara “ma nyefee … ntụghe niile nke mkpọkọta nke Israel site n’akụkụ anọ niile nke ụwa, na odudu nke ebo iri site n’ala nke elu ndị ugwu.”25

Onyeisi Russell M. Nelson, onye amụma anyị taa anyị hụrụ naanya onye ji otu ụdị ọtụghe ndịa, kuziri nụtụtụ a: “Unu ndịikom nta ka echekwara maka oge nkea mgbe mkpokọta nke Isreal e kwere na nkwa na-aga n’ihu. Dị ka unu na-eje ozi mishọn, ị na-eme ọrụ dị mkpa n’ihe omume a na-enwetụbeghị ụdị ya!”26

N’ihi na iwu nke Onye Nzọpụta iji kwusaa ozi ọma ahụ iji bụrụ akụkụ nke ndị anyị bụ, anyị kwesịrị ịdị mgbanwe nye uche Chineke; anyị kwesịrị inwe ịhụnaanya n’ebe ndị agbata obi anyị nọ, kwusaa ozi ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere, ma kpọkuo ndị niile iji bịa ma lee. Dị ka ndị otù Nzukọ nsọ, anyị hụrụ azịza Josef nye Jọn Wentworth n’anya, onye nnyocha nke Ngalaba Chigaco Democrat, na 1842. Ọ naara achọ ozi banyere Nzukọ nsọ. Josef mechiri azịza ya site n’iji “Ọkọlọtọ nke Eziokwu” dị ka okwu mmalite nye Ndepụta nke Okwukwe nke Iri na atọ. Ọkọlọtọ ahụ n’ekwupụta, n’ụzọ doro anya, ihe a ga-emezurịrị.

“Enweghi aka rụrụ arụ ga-akwụsị ọrụ nkea iganiihu; mkpagbu nwere ike dị ike, igwé mmadụ ga-etikọta aka ọnụ, ndị agha ga-agbakọ, ebubo ụgha ga-achọ imebi aha, mana eziokwu ahụ nke Chineke ga-eje niihu atụghị ụjọọ, jidesie ezi ukpuru ya aka, ma nọrọ n’onwe ya, ruo mgbe ọ rikpụru ala ukwu niile, zute mpaghara niile, zachaa obodo niile, daa na ntị niileruo mgbe ebumnuche niile nke Chineke mezuworo, ma Nnukwu Jehova ahụ ekwuo na ọrụ ahụ emezuwo.”27

Nkea abụrụwo iwu nye ndudugandu niile nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a, kacha nke ndị mgbasa ozi ọma. Nime mmụọ nke “Ọkọlọtọ nke Eziokwu,” anyị jupụtara n’ekele na n’etiti ọrịa mkposasị zuru ụwa ndị mgbasa ozi ọma kwesịrị ntụkwasị obi ekesawo ozi ọma ahụ. Ndị Mgbasa ozi ọma, anyị hụrụ unu n’anya! Onyenwe anyị na-arịọ onye ọbụla n’ime anyị ikesa ozi ọma Ya n’okwu na n’omume. Mgbanwe nke onwe anyị gụnyere oke na ọrụ ikesasị ozi ọma nke Jizọs Kraịst n’ime ụwa.

Ngọzi niile nke ikesa ozi ọma tinyekọtara imelite mgbanwe anyị ruo n’uche Chineke ma n’ekwe ka Chineke merie na ndụ anyị.28 Anyị na-agọzi ndị ọzọ izute “nnukwu mgbanwe” nke obi.29 E nwere n’ezie ọńụ dị ebighị ebi n’inye aka iwete mkpụrụ obi niile nye Kraịst.30 Ịrụ ọrụ maka mgbanwe nke onwe na nke ndị ọzọ bụ ọrụ ahụ mara mma.31 Otu a ka m si gbaa ama n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. E jere m ozi na Mishọn ndị Britain site na Septemba1, 1960, ruo na Septemba 1, 1962.

  2. Ndị ikom nta aghaghị ịdị adị maka ndenye aha n’otu agha.

  3. Mgbe Joe laghachiziri site na mishọn ya, ọ gụsịrị akwụkwọ na ụlọakwụkwọ ahụike ma n’eje ozi dị ka dọkịnta n’eme nke ọma. Mishọn ya kwadokwara ya ịbụ bishọp, onyeisi stek, onye nnọchi anya mpaghara, na onyeisi mishọn.

  4. Lee Moronaị 10:4. Agụwo m Akwụkwọ nke Mọmọn. Jiri isiike nke okwu nkea nime ezi na ụlọ anyị, a naara m eji ezi ebumnuche ekpe ekpere.

  5. Lee Ndị nsọ: Akụkọ ahụ nke Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nime Ụbọchị Ikpeazụ ndịa, vol. 1, Ọkọlọtọ nke Eziokwu, 1815–1846 (2018), na vol. 2, Enweghị Aka Na-adịghị Nsọ, 1846–1893 (2020).

  6. Ntụgharị asụsụ malitere na Epril 7, 1829, ma emezuo ya ihe dị ka Ụbọchị mbụ nke Julaị 1829. Ọ bụrụwo ihe dị iriba ama ịmụ ihe maka eziokwu ndị gbara ntụgharị asụsụ ahụ gburugburu. I particularly appreciated reading the printer’s manuscript and the original manuscript of the Book of Mormon published as volumes 3 and 5 in the Revelations and Translations series of The Joseph Smith Papers. They are both landmark volumes.

  7. Frederic W. Farrar, Olileanya Ebighị ebi: Okwuchukwu Ise Ekwusara n’ime Westminster Abbey, Nọvemba na Desemba, 1877 (1892), xxii.

  8. Ọhụ ahụ tinyekọtara ndị ahụ na anaghị amụ maka Kraịst n’ime ndụ a, ụmụ ndị na-anwụ tupu afọ ntọzu oke, na ndị ahụ n’enweghị nghọta.

  9. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 76:89.

  10. Lee Jọn 5:29.

  11. Farrar was educated at King’s College, London, and Trinity College, Cambridge. Ọ bụ onye ụkọchukwu nke Nzukọ nsọ nke England (Anglican), archdeacon nke Westminster Abbey, dean nke Canterbury Cathedral, na chaplain nye Royal Household.

  12. Lee Frederic W. Farrar, Ndụ nke Kraịst (1874).

  13. Lee. Farrar, Olileanya Ebighị ebi, xxxvi–xxxvii. Fredric Farrar ka amanyere imezi nkuzi banyere ikpe na ala mmụọ. Ọ mara ọkwa siri ike ihe ọ kpọrọ eziokwu dị mfe, n’enweghị ngọnahụ, ma n’enweghị esemokwu. … Ngwaa ahụ “ima ikpe” na njikọ ya niile anọghị n’ime Agba Ochie. Enweghị mkpuru okwu newete ụdị nkọwa ọbụla ahụ dị nime Griik nke Agba Ọhụụ.” Ọ garaniihu ịkọwa na mkpụrụ okwu ahụ ikpe bụ “ntụgharị asụsụ dị njọ … [ma] na-agbagọ ma na-ekpuchi ezigbo mpụtara nke okwu ọnụ niile nke Onyenwe anyị” (Olileanya Ebighị ebi, xxxvii). Farrar kwuru maka nnukwu ngosipụta nke Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya gburugburu Baịbụl dị ka ihe aka ebe mgbakwunye na nkọwa niile nke ala mmụọ na ikpe edere nime ntụgharị asụsụ Bekee ezighị ezi (lee Olileanya Ebighị ebi, xiv–xv, xxxiv, 93; lee kwa Quentin L. Cook, “Atụmatụ nke Nna Anyị—Dị Nnukwu Zuru ezu maka Ụmụ Ya Niile,” Liahona, Me 2009, 36).

  14. Mmekọrịta n’etiti nchegharị na Aja mgbaghara mmehie ahụ ka atụpụtara n’ime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 19:15–18, 20. Na mgbakwunye, ntaram ahụhụ n’enweghị ọgwụgwụ ka e mere ya e doo anya n’ime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 19:10–12.

  15. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 59:23.

  16. Lee Mozaya 27:25; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 112:13; lee kwa Dale E. Miller, “Iwete Udo na Ọgwụgwọ nye Mkpụrụ obi Gị,” Liahona, Nov. 2004, 12–14.

  17. Lee Mosaia 2:41.

  18. Lee Dallin H. Oaks, “Ịma aka nke Ịbụ,” Ensign, Nov. 2000, 33; Liahona, Jan. 2001, 41; lee kwa 2 Ndị Kọrịnt 5:17; Ọkọwa okwu Baịbụl, “Mgbanwe.”

  19. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 123:12.

  20. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:17, 23.

  21. Ọ bụrụ na nke ahụ bụ ọchịchọ anyị, anyị ka “a kpọrọ n’ọrụ ahụ” (Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 4:3; lee kwa Thomas S. Monson, “A Kpọrọ N’ọrụ ahụ,” Liahona, June 2017, 4–5).

  22. Matiu 28:19

  23. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 112:28

  24. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:10

  25. Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 110:11

  26. Lee Russell M. Nelson, “Ikwusa Ozi ọma nke Udo,” Liahona, Me 2022, 6–7; lee kwa Russell M. Nelson, “Olileanya nke Israel” (worldwide youth devotional, June 3, 2018), HopeofIsrael.ChurchofJesusChrist.org.

  27. Nkuzi niile nke Ndịisi nke Nzukọ nsọ: Josef Smith (2007), 444.

  28. Lee Russell M. Nelson, “Ka Chineke Merie,” Liahona, Nov. 2020, 92–95.

  29. Alma 5:14

  30. Lee Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:15; lee kwa Jemis 5:19–20.

  31. Lee Alma 26:22; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 18:13–16; lee kwa Ọkọwa okwu Baịbụl, “Mgbanwe.”