Ndị Bishọp—Ndị ọzụzụ Atụrụ n’elekọta Igwe Anụ ụlọ nke Onyenwe anyị
Bishọp nwere ọrụ kacha mkpa n’ije ozi dị ka onye ọzụzụ atụrụ idu ndudugandu n’eto eto ruo na Jizọs Kraịst.
Ezi ụmụnne m ndị nwoke nke ọkwa nchụaja, otu n’ime ahịrị nke kachasị abịa n’uche dị n’ime abụ ahụrụ n’anya karịsịa na-ajụ sị, “Ndị ntoroọbịa nke Zayọn ha ga-ada?”1 Nkwupụta m kacha ada ụda sị n’obi na-aziza nye ajụjụ ahụ bụ “Mba!”
I hụ na aziza ahụ bụụrụ ezi okwu, a na m agba ama taa na ikwado ọgbọ na-eto eto n’oge aka mgba na ọnụnwa dị iche iche bụ ọrụ dị mkpa enyere ndị nne na nna na ndị bishọp site n’aka Nna nke Eluigwe.2 Ka m gosị mkpa nke otu bishọp nwetere nhumiihe nke onwe ya.
Mgbe m bụụrụ onye dikọn, ezinaụlọ m kwabara n’ebe obibi ọhụrụ dị n’ime ngalaba ukwu dị iche. A naara m ebido kọleeji ukwu nke nta, ya mere a gakwara m ụlọakwụkwọ ọhụrụ. E nwere otu ndị ikom nta dị ebube dị nime kworum ndị dikọn. Ọtụtụ nime ndị nne na nna ha bụụrụ ndị otu dị uchu n’ọrụ. Nne m dịịrị uchu n’ọrụ kpamkpam; nna m pụrụ iche n’ihe niile kama ọ bụghị onye otu dị uchu n’ọrụ.
Onye ndụmọdụ nke abụọ n’otu bishọp,3 Nwanne nwoke Dean Eyre bụụrụ onye ndu kwesịrị ntụkwasị obi. Mgbe m ka nọ na-anọgharị na ngalaba ukwu ahụ, mmemme nna-ọkpara ka a mara ọkwa nke Bear Lake—ihe gafere maịlụ 40 (65 km) pụọ. E cheghị m na m ga-aga hapụ nna m. Mana Nwanne nwoke Eyre nyere ọkpụkpọ oku pụrụ iche ka m soro ya gaa. O kwuru nke ọma na nkwanye ugwu banyere nna m ma o kwusịrị ike mkpa ohere ahụ dị ịnọkọta mụ na ndị otu ọzọ nke kworum ndị dikọn. Ya mere e kpebiri m iso Nwanne nwoke Eyre gaa, ma e nwetere m nhumiihe dị ịtụnaanya.
Nwanne nwoke Eyre bụụrụ ọmụmaatụ dị ebube nke ịhụnaanya dị ka nke Kraịst n’imejupụta ọrụ nke otu bishọp ikwado ndị nne na nna n’ichekwa na ilekọta ndị ntoroọbịa. O nyere m mbido magburu onwe ya n’ime ngalaba ukwu nkea ma bụrụ onye ndụmọdụ nye m.
Ọnwa ole ma ole tupu m gawa mishọn na 1960, Nwanne nwoke Eyre nwụrụ n’ihi kansa nafọ 39. Ọ hapụrụ nwunye ya na ụmụ ha ise, ha niile dị nta karịa afọ 16. Ụmụ ya ndị nwoke kacha tolite, Richard na Chris Eyre, enyewo m obisike na ebe nna ha anọghị ya, ndị otu bishọp akwadowo ma chekwaa ha na ụmụnne ha ndị nwoke nta na nwanne ha nwanyị site n’ịhụnaanya dị ka nke Kraịst, nke nyere m obi ụtọ.
Ndị nne na nna mgbe niile nwere isi ọrụ maka ndị ezinaụlọ ha.4 Ndịisi kworum nakwa ewete nkwado na odudu dị oke mkpa nye ndị otu kworum site n’inyere ha aka welite ọrụ na ike nke Ọkwa nchụaja Erọn ruo n’etiti nke ndụ ha.5
Taa ebumnobi m bụ ikwu banyere ndị bishọp na ndị ndụmọdụ ha, ndị n’ezia n’ezia enwere ike ịkpọ “ndị ọzụzụ atụrụ n’elekọta igwe anụ ụlọ nke Onyenwe anyị”—kwusie ike n’ịbụrụ ndị ọzụzụ atụrụ nye ọgbọ n’eto eto.6 Ọ bụ ihe mmasị na Onye ozi Pita kpọrọ Jizọs Kraịst dị ka “Onye ọzụzụ atụrụ na Bishọp nke mkpụrụ obi unu.”7
Bishọp nwere isi ọrụ ise n’iduzi ngalaba ukwu:
-
Ọ bụ onyeisi nchụaja nduzi n’ime ngalaba ukwu ahụ.8
-
Ọ bụ onyeisi nke Ọkwa nchụaja Erọn.9
-
Ọ bụ ọka ikpe nke ọha.10
-
Ọ na-ahazi ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu, tinyekọta ilekọta ndị nọ na mkpa.11
-
Ma ọ na-elekọta ndekọ ihe, ego, na otu esi eji ụlọ ụka eme ihe.12
N’ọrụ ya dịka onyeisi nchụaja nduzi, bishọp bụ “onye ndu ime mmụọ” nke ngalaba ukwu ahụ.13 Ọ bụ “onye na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst jupụtara n’okwukwe.”14
Na mgbakwunye, “bishọp na-ahazi ọrụ nke nzọpụta na mbuli elu n’ime ngalaba ukwu ahụ.”15 Bishọp kwesịrị ikenye ọrụ nkesa ozi ọma ahụ ụbọchị-ruo-ụbọchị, inye ndị otu ọhụrụ na ndị bịaghachịrị mgbam ume, ije ozi nlekọta, na ọrụ tempụl na agụgụala ezinaụlọ nye ndịisi kworum ndị okenye na Otu Enyem aka.16 Bishọp na-ahazi ọrụ nke a na kansụl ngalaba ukwu na kansụl ngalaba ukwu ndị ntoroọbịa.
Bishọp nwere ọrụ kacha mkpa n’ije ozi dị ka onye ọzụzụ atụrụ idu ọgbọ n’eto eto, tinyekọta ndị dimkpa nta na-emebeghị ọlụlụ, ruo na Jizọs Kraịst.17 Onyeisi Russell M. Nelson ekwusiwo ike maka ọrụ kacha pụta ihe nke bishọp na ndị ndụmọdụ ya. Ọ kuziwo na “ọrụ mbụ ha nke kachasị mkpa bụ ịlekọta ndịikom nta na ndịinyom nta nke ngalaba ukwu [ha].”18 Bishọp na ndị ndụmọdụ ya na-akwado ndị nne na nna n’ichekwa na ịlekọta ụmụaka na ndị ntoroọbịa dị n’ime ngalaba ukwu ha. Bishọp na onyeisi Ndịinyom Nta na-adụkọrịta ndụmọdụ. Ha na-agbalisike inyere ndị ntoroọbịa aka bie ọmụmaatụ ndị dị n’ime Maka Ume nke Ndị Ntoroọbịa, tozuo ịnata emume nsọ niile, ma mee ma debe ọgbụgba ndụ dị nsọ niile.
I nwere ike jụọ, “Gịnị mere esi kwuo ka bishọp nọnyere ndị ntoroọbịa oge ndịa niile?” Onyenwe anyị ahaziwo Nzukọ nsọ Ya imejupụta ihe ndị kacha mkpa. Dị ka ọ dị, nhazi nke Nzukọ nsọ Ya nwere ọdịdị nke bishọp nwere ọrụ gbara ụzọ abụọ. O nwere ọrụ nke ozizi maka ngalaba ukwu ahụ dum, mana o nwekwara ọrụ ozizi kpọmkwem maka kworum ndị nchụaja.19
Ndịikom nta ndị bụ ndị nchụaja na ndịinyom nta gbara otu ụdịrị afọ ahụ nọ na ogo dị mkpa na ndụ ha ma na ntolite ha. Na nwa obere oge, ha na-eme mkpebi nwere ihe mpụtara dị mkpa nke ndụ. Ha na-ekpebi ma ha ga-etozu maka tempụl, jee mgbasa ozi,20 gbalịa ịlụ ọlụlụ n’ime tempụl, ma kwadoo maka ọrụ nke ndụ ha. Mkpebi ndịa, ka emechara ya, nwere ihe mpụtara nke ime mmụọ na nke a hụrụ anya dị omimi n’oge ndụ ha fọdụrụ. Ndị bishọp, biko maranụ na nwa oge ntakịrị a nọnyeere onye ọkwa nchụaja nta, onye inom nta, ma ọbụ okenye nta nwere ike nyere ha aka ghọta ike ahụ nọọrọ ha site na Aja-mgbaghara-mmehie nke Jizọs Kraịst. O nwere ike wete mbunobi nke ga-enwe mmetụta dị omimi na ndụ ha niile.
Otu nime ọmụmaatụ kachasị mma m huworo otu bishọp onye nyere aka wete ụdị mbunobi nkea maka onye ntoroọbịa ya bụụrụ Bishọp Moa Mahe. A kpọrọ ya ịbụ bishọp mbụ nke Ngalaba ukwu Tonga San Francisco.21 Ọ bụụrụ mbịarambịa sitere na Vava’u, Tonga. Ngalaba ukwu ya nọ n’akụkụ ọdụ ụgbọ elu San Francisco, California, n’ebe ọ na-arụ ọrụ.22
Ngalaba ukwu ahụ nwere ọtụtụ ọnụọgụgụ nke ndị ntoroọbịa, ọtụtụ sitere na ezinaụlọ ndị ka batara n’ime United States na nso nso a. Bishọp Mahe abụghị nanị na ọ kuziiri ha n’okwu na n’ọmụmaatụ otu esi abụ onye ezi omume na-eso ụzọ nke Jizọs Kraịst, kama o nyekwara aka nye ha mbunobi nke ihe ha nwere ike bụrụzie ma nyere ha aka kwado maka tempụl, mishọn, agụm akwụkwọ, na ọrụ. O jere ozi ihe ruru afọ asatọ, ma olileanya na ọchịchọ ya niile maka ndị ntoroọbịa bịara na mmezu.
Ruo nnọọ pacent 90 nke ndịikom nta n’ime kworum Ọkwa nchụaja Erọn jere mgbasa ozi. Ndịikom na ndịinyom nta iri na ise bụụrụ ndị mbụ nke ezinaụlọ ha gara kọleeji.23 O jekwuuru onyeisi ụlọakwụkwọ nke kọleeji obodo ahụ (ọ bụghị nke okpukperechi anyị), ma ha mere enyi ma kwekọrịta ụzọ ha ga-esi nyere ntoroọbịa ọbụla aka inwete ebumnobi niile bara uru ma merie nsogbu niile. Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ gwara m na Bishọp Mahe nyeere ya aka n’ọrụ n’etiti ndị niile bịara abịa nke okpukperechi dum ndị naara adọlị ndọlị. Ndị ntoroọbịa ahụ maara na Bishọp ahụ hụrụ ha n’anya.
Dị mwute, Bishọp Mahe nwụrụ dịka ọ na-arụ ọrụ dị ka Bishọp. A gaghị m echefu ma ọlị olili ya na-emetụ obi na akpake mmụọ. E nwere nnukwu igwe mmadụ. Otu abụ gụnyekọtara ihe karịrị ndị otu dị nta 35 jupụtara n’okwukwe ndị jeworo ozi mgbasa ozi ọma ma ọbụ naara eje kọleeji na ndị bụbụụrụ ntoroọbịa n’oge ije ozi ya dị ka bishọp. Otu onye kwuru okwu kwupụtara mmetụta kpo ọkụ n’ọnụ nke obi ekele sitere na ndị ntoroọbịa na ndị okenye nta dị n’ime ngalaba ukwu ya. O kwuru okwu ekele nye Bishọp Mahe maka mbunobi o nyebuuru ha n’ịkwado ha maka ije ozi nke ndụ na nke ezi omume. Mana kachasị nke, Bishọp Mahe enyewooro ha aka n’iwulite okwukwe n’ime Onyenwe anyị Jizọs Kraịst dị ka ntọala nke ndụ ha.
Ugbua, ndị bishọp, n’ebe ọbụla unu na-eje ozi, na-ajụjụ ọnụ unu niile na mmekọ ndị ọzọ, unu nwere ike mepụta ụdị mbunobi ahụ ma wulite okwukwe n’ime Jizọs Kraịst. I nwere ike setipụ ọkpụkpọ oku dị ike iji gbanwee omume, kwadoo ha maka ndụ, ma kpate mmụọ ha ịnọ n’ụzọ nke ọgbụgba ndụ
Na mgbakwunye, i nwere ike nyere ụfọdụ ndị ntoroọbịa aka ndị ha na ndị nne na nna ha nọ na ndọkụrịta maka ihe ndị na-adịghịcha oke mkpa.24 Noge mgbe ndị ntoroọbịa dị nnọọ ka ha nọ na oke ndọkụrịta ha na ndị nne na nna ha, onye nke na-eduzi kworum ha na onye nke ha na-ańa ntị na ụka bụkwa onye nne na nna ha na-agakwuru maka rekọmend tempụl. Nkea n’etinye bishọp n’ọnọdụ pụrụ iche inye ndị ntoroọbịa na ndị nne na nna ha ndụmọdụ mgbe esemokwu butara nkewa. Bishọp nwere ike nyere ha abụọ aka hụta ihe niile n’anya nke ebigh ebi ma mezie nsogbu ndị dị mkpa karịa na ndị na-adịchaghị mkpa. Anyị na-atụ arọ na ndị bishọp hara inwe ndị ezinaụlọ ije ozi nlekọta nke enyere ha ka ha nwee ike tinye oge na ume ha n’ilekọta ndị ntoroọbịa na ndị ezinaụlọ ha nọ n’ụdị ọnọdụ ndịa niile.25
A ma m maka otu bishọp onye ọ dịịrị mfe imezi esemokwu dị oke egwu n’etiti nwa nwoke na ndị nne na nna ya, webata ịdị n’otu n’ebe obi ha ma melite mkpebi n’ozi ọma. Bishọp ahụ nyeere ndị nne na nna ahụ aka ghọta na ịgbasị mbọ ike ịbụrụ onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst dịịrị mkpa karịa otu esi mee na mgbe emere ọrụ ezinaụlọ kpọmkwem.
Iji nwee ike nọnyetụrụ ndị ntoroọbịa, n’ebe ọbụla ha nọ, tinyekwara na mmemme ma ọbụ ihe omume ụlọakwụkwọ, bishọp na ndị ndụmọdụ ya ka enyeworo ndụmọdụ ihazi nzukọ ziri ezi na oge ndụmọdụ ha na ndị di mkpa. Ebe bishọp nwere ike nye ndụmọdụ na ihe siri ezigbo ike na nke dị ngwangwa, anyị na-atụ arọ na izipụ ọrụ nke ndụmọdụ na-aganiihu na ihe jọgburu onwe ya, nke na-adịghị ngwangwa na-agụnyeghị ọmụmaikpe dị ka ntozu oke ka a ga-enye ndị otu kworum ndị okenye ma ọbụ Otu Enyemaka—na-abụkarị otu ndịisi ma ọbụ ụmụnne nwoke na nwanyị ije ozi nlekọta. Mmụọ ahụ ga-edu ndị ndu26 ịhọrọ ndị otu kacha mma inye ndụmọdụ nkea. Ndị ahụ na-anata nzipu ọrụ ndụmọdụ a tozuru oke inweta mkpughe. Ha, n’ezia, garịrị mgbe niile hụ na ha agwaghị onye ọzọ ihe mere.
Ndị ndu na-echeba echiche ime mgbe niile achụwo aja maka ọgbọ na-eto eto. Nkea bụ ebe ndị otu bishọp na-akacha etinye oge ha niije ozi Nzukọ nsọ.
Ugbua ọ na-amasị m ikwu ihe ole ma ole n’ezie nye ndị ntoroọbịa ma emesịa nye ndị bishọp anyị.
Ọtụtụ n’ime unu ọmarịcha ndị ntoroọbịa nta nwere ike unu enweghị mbunobi kwere nghọta nke onye ị bụ na onye ị nwere ike ịbụrụzi. N’agbanyeghị unu bụ mbido nke mkpebi kachasị mkpa unu ga-eme n’ime ndụ unu. Biko nwee ndụmọdụ gị na ndị nne na nna gị na bishọp gị banyere nhọrọ dị mkpa nọ gị n’ihu. Kwe ka bishọp bụrụ enyi gị na onye ndụmọdụ gị.
O doro anyị anya na unu nwere mnwale na ọnwụnwa na-abịara unu site na-ụzọ niile. Anyị niile kwesịrị ichegharị kwa ụbọchị, dị ka Onyeisi Nelson kuziworo. Biko gwa bishọp gị okwu banyere ihe ọbụla nke ọkaikpe ọha nwere ike inyere gị aka n’ịhazi ndụ gị n’usoro gị na Onyenwe anyị na nkwado nke nnukwu ọrụ ahụ O nwere maka gị n’ọgbọ nke ikpeazụ a.27 Dị ka Onyeisi Nelson kpọworo unu oku, biko tozuonụ oke n’onwe unu ịbụrụzi akụkụ nke ndị agha ntoroọbịa nke Onyenwe anyị!28
Ugbua okwu maka unu ọmarịcha ndị bishọp na-aha nke odudu na ndị otu nke Nzukọ nsọ. Anyị n’ekwupụta obi ekele anyị dị ukwuu nye unu. Na mbelata niile nke ekwuworo ka unu mee n’afọ ndị na-adịghị anya, ezi ndị bishọp, biko maranụ otu anyị siri hụ unu n’anya ma na ekele unu. Ntụnye unu nye alaeze ruru ihe kachasị gafee nkọwa. Nzukọ nsọ nwere ndị bishọp na ndịisi ngalaba nta dị 30,900 n’eje ozi gburugburu ụwa.29 Anyị na-akwanyere onye ọbụla n’ime unu ugwu.
Ụfọdụ mkpụrụ okwu na ọkpụkpọ oku dị nsọ ha na-akọwa ka enwere nnukwu uru ime mmụọ dị na ya. Ọkpụkpọ oku nke bishọp doro anya na ọ nọ n’isi nke ụdịrị okwu ndị ahụ Ijere Onyenwe anyị ozi n’ike nkea pụrụ iche n’ọtụtụ ụzọ. Ọkpụkpọ oku ahụ, nkwado, na ndopụ iche nke onye bishọp bụ nhumiihe na-agaghị-enwe-ike-chefuo-ma-ọlị. Maka m, ọ nọ n’ọkwa ụmụ obere mmemme magburu onwe ya nihi mmetụta sara mbara ma dị omimi nke ọ na-akpake. Ọ kasịrị obi nọdụ na ndokwa nke ọmarịcha mmemme dịka ọlụlụ na ọkwa nke nna nke a n’enweghị ike ịkọwa na mkpụrụ okwu ole na ole.30
Ndị Bishọp, anyị na-akwado unu! Ndị Bishọp, anyị hụrụ unu n’anya. N’ezia n’ezia unu bụ ndị ọzụzụ atụrụ nke Onyenwe anyị n’elekọta igwe anụ ụlọ Ya. Onye nzọpụta agaghị ahapụ unu na ọkpụkpọ oku ndịa. Nke a ka m na-agba ama, na njedebe izu ụka Ista a, n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.