Njem Nke Onwe nke Nwa Chineke
Dị ka ụmụ ọgbụgba ndụ Chineke, anyị na-egosi ịhụnaanya, kwanye ugwu, lekọta, chekwaa ma nabata mmụọ ndị ahụ na-abịa site na ụwa tupu anụ ahụ.
Onye ọbụla n’ime anyị ka ọrịa mkpochapụ gburugburu ụwa metụtara, dị ka ezinaụlọ na ndị enyi na-atụghị anya gafeworo ndụ anụ ahụ. Ka m nakwere ndị atọ anyị anyị na-atụ uche ha nke ukwuu, na-anọchite anya ndị ahụ niile anyị hụrụ naanya nke ukwuu.
Nke a bụ Nwanne nwoke Philippe na Nwanne nwanyị Germaine Nsondi. Nwanne nwoke Nsondi, onye naara eje ozi dị ka petrak nke Stek Brazzaville Republic of Congo mgbe ọ nwụrụ. Ọ bụụrụ dibia ọgwụ onye kesaara ndị ọzọ ihe ọ maara n’eleghị anya na-azụ.1
Nke a bụ Nwanne nwanyị Clara Elisa Ruano de Villareal sitere na Tulcán, Ecuador. Ọ nabatara ozi ọma eweghachitere mgbe ọ gbara afọ 34 ma bụrụ onye ndu ahụrụnanya. Ezinaụlọ ya siri laa n’udo site n’ịgụ abụ kacha masị ya, “A Ma M Na Onye Mgbapụta M Dị ndụ.”2
Nke a bụ Nwanne nwoke Ray Tuineau sitere na Utah, ya na ọmarịcha ezinaụlọ ya. Nwunye ya, Juliet, siri, “A chọrọ m [ụmụ m nwoke] ị [cheta nna ha ahụ] mgbe niile na-agbalị itinye Chineke mbụ.”3
Onyenwe anyị e kwuwo, “Unu ga-ebikọta ọnụ nihụnanya, nke mere na unu ga-akwa akwa maka nfunarị nke ndị nwụrụ anwụ.”4
Mgbe anyị na-ebe akwa, anyị nakwa ańụrị ọńụ na Mbilite n’ọnwụ dị ebube nke Onye Nzọpụta anyị. Nihi Ya, ndị anyị hụrụnanya na ndị enyi gaaniihu na njem ebighị ebi ha. Dịka Onyeisi Josef F. Smith kọwara: “Anyị enweghị ike echefu ha; anyị agaghị akwụsị ịhụ ha n’anya. … Ha agawo n’ihu; anyị na-aga n’ihu; anyị na-etolite dị ka ha toliteworo.”5 Onyeisi Russell M. Nelson kwuru, “Anya mmiri nke iru uju anyị … na-atụgharị bụrụ anya mmiri nke nchekube.”6
Anyị Maara banyere Ndụ tupu Ọmụmụ
Echiche ebighị ebi anyị anaghị nanị abawanye nghọta anyị nke ndị ahụ na-aganiihu njem ha gafee ndụ anụ ahụ kama nakwa emepe nghọta anyị nke ndị ahụ bidoro ngwa ngwa na njem ha ma nanị ugbua na-abanye ndụ anụ ahụ.
Onye ọbụla nke bịara elu ụwa bụ nwa nwoke ma ọbụ nwa nwanyị pụrụ iche nke Chineke.7 Njem nke onwe anyị ebidoghị na ọmụmụ. Tupu amụọ anyị, anyị nọkọtara ọnụ n’ụwa nke nkwado n’ebe anyị “natara ihe nkuzi nke mbụ [anyị] n’ụwa nke mmụọ.”8 Jehova gwara Jeremaya, “Tupu mụ akpụọ gị nime afọ a maara m gị; ma tupu gị apụta site n’ime akpa nwa a sachara m gị.”9
Ụfọdụ nwere ike jụọ ma ndụ o bidoro, site na ọkpụkpụ nke embrayo, ma ọbụ mgbe mkpụrụ obi bidoro ịkụ, ma ọbụ mgbe nwa ntakịrị nwere ike ibi ndụ ma ọ pụta na akpa nwa, mana maka anyị, enweghị ajụjụ nke ụmụ ndị nwanyị na ndị nwoke mmụọ Chineke nọ na njem nke onwe ha na-abịa n’elu ụwa ịnata anụ ahụ na nhumiihe nke ndụ anụ ahụ.
Dị ka ụmụ ọgbụgba ndụ Chineke, anyị na-egosi ịhụnaanya, kwanye ugwu, lekọta, chekwaa ma nabata mmụọ ndị ahụ na-abịa site na ụwa tupu anụ ahụ.
Onyinye Dị ịtụnaanya nke Ụmụnwanyị
Maka onye inyom, ịmụ nwa nwere ike bụrụ otu aja dị ukwuu nke ahụrụ anya, nke na-emetụ n’obi, na nke ego. Anyị hụrụ naanya ma nwee nkwanye ugwu nye ndịinyom nke Nzukọ nsọ a. Na ọgụgụisi na amamihe, ị na-ebu ibu arọ nke ezinaụlọ gị. I na-ahụ naanya. I na-eje ozi. I na-achụ aja. I na-agba okwukwe ume, lekọta ndị ahụ nọ na mkpa, na i na-enye aka n’obodo.
Ọrụ Dị nsọ nke Nchekwa nke Ndụ
Afọ ndị gara aga, inwe mmetụta dị omimi n’ihi ọnụọgụgụ nke ite ime n’ụwa, Onyeisi Gordon B. Hinckley gwara ndịinyom Nzukọ nsọ okwu jiri mkpụrụ okwu nke dabaara anyị taa. O siri: “Unu ndị bụ ndị nwunye na ndị nne bụ ihe jidere ezinaụlọ. Unu na-amụ ụmụ ndị ahụ. Ụdị ọrụ dị ukwuu na nke dị nsọ nke ahụ bụ. … Kedụ ihe mere anyị enweghi nsọpụrụ maka ịdị ọcha nke ndụ mmadụ? Ite ime bụ ihe ọjọọ, jọgburu onwe na-asọ oyi, nke na-ekpochapụ ụwa. A na m arịọ ndịinyom Nzukọ nsọ izere ya, iguzogide ya, izere ọnọdụ ikwenye ndị ahụ na-eme ya a dịka ọ bụrụ nwere mmasị. Enwere ike nwee ọnọdụ ole ma ole nke nwere ike ime, kama ha pere mpe nke ukwuu.10 … Unu bụ ndị nne nke ụmụ ndị nwoke na nwanyị Chineke, ndị ndụ ha dị nsọ. Ichekwa ha bụ ọrụ enyere dị nsọ nke a na-enweghị ike idebe na-akụkụ.”11
Okenye Marcus B. Nash kọọrọ m akụkọ otu nwanyị ọma gbara afọ 84 onye, mgbe a na-eme ajụjụ ọnụ nke baptizim ya, “nakweere ite ime [ọtụtụ afọ gara aga].” Na mmetụta si n’obi, o kwuru: “E buruwo m ibu arọ ahụ nke ite ime otu nwa ụbọchị niile nke ndụ m ruo afọ iri anọ na isii. … Enweghị ihe m mere ga-ewepụ mgbu na ikpe ọmụma ahụ. E nweghị m olileanya ruo mgbe a kuziiri m oziọma nke Jizọs Kraịst. A mụrụ m otu esi echegharị … ma na ntabi anya ejupụtara m na olileanya. N’ikpezaụ a bịara m mata na enwere ike ịgbaghara m ma ọbụrụ na m chegharịa site na njọ m n’ezie.”12
Ụdị obi ekele anyị nwere maka onyinye dị nsọ ndị nke nchegharị na mgbaghara.
Gịnị ka Anyị Nwere ike Ime?
Kedụ ihe bụ ọrụ anyị dị ka ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst jupụtara n’udo? Ka anyị debe iwu nsọ nke Chineke, kuziere ha ụmụ anyị, ma kesaa ha n’etiti ndị ọzọ ndị dị njikere ige ntị.13 Ka anyị kesaa oke mmetụta anyị banyere nsacha nke ndụ anyị na ndị ahụ na-eme mkpebi n’obodo. Ha nwere ike ha agaghị anabata n’uju ihe anyị kwere, mana anyị na-ekpe ekpere na ha ga-aghọta n’uju karịa ihe kpatara, maka anyị, mkpebi ndị ahụ gafere nnọọ ihe otu onye chọrọ maka ndụ ya onwe ya.
Ọ bụrụ na nwa a na-echeghị eche na-abịa, ka anyị jiri ịhụnaanya, mgbam ume, na, mgbe achọrọ, enyem aka ego, inye onye nne mgbam ume n’ikwere ka amụọ nwa ya ma gaa nihu na njem ya na ndụ anụ ahụ.14
Ịma mma nke Ịkpọrọ nwa
N’ezinaụlọ anyị, agọziwo anyị n’ụzọ n’enweghị atụ dịka iri afọ abụọ gara aga, otu nwa agbọghọ nta gbara afọ 16 matara na ya dị ime. Ya na nna nwa ya alụbeghị, na ha enweghị ihe ha hụrụ ga-eme ha agakọta n’ihu ọnụ. Onyeinyom nta ahụ kwere na ndụ ya bu na-afọ dị oke ọnụ. Ọ mụrụ nwa nwanyị ma kwere ka ezinaụlọ nwere ezi omume kpọrọ ya dị ka nke onwe ha. Nye Bryce na Jolinne, ọ bụụrụ aziza nye ekpere ha. Ha gụrụ ya Emily ma kuziere ya ịtụkwasị obi na Nna ya nke Eluigwe na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst.
Emily tolitere. Ụdị ekele anyị nwere na Emily na nwa nwa nwoke anyị, Christian, hụrụ onwe ha naanya ma lụọ n’ụlọ nke Onyenwe anyị. Emily na Christian ugbua nwere nwa nwanyị nke ha.
Emily na nso nso a dere: “N’ime ọnwa itolu niile ndịa nke afọ ime, enwetara m oge ịtụgharị uche na ihe ndị mere [nke] ọmụmụ nke m. E chere m maka nne mụrụ m, onye gbara nanị afọ 16. Dị ka m gabigara ihe ụfụ na mgbanwe ndị afọ ime wetere, e nweghị ike ịghara iche otu o sị sie ike na afọ nta nke 16. … Anya mmiri na-agba ọbụna ugbua dị ka m na-eche maka nne mụrụ m, onye maara na ya enweghị ike inye m ndụ [ọ chọrọ maka m ma n’echeghị maka onwe ya tinyere] m maka ndị ga-akpọrọ m. E nweghị m ike iche ihe ọ gabigara n’ọnwa itolu ndị ahụ—ebe elere ya anya ịma ya ikpe dị ka ahụ ya gbanwere, nhumiihe ndị gbanahụrụ ya, mara na n’ikpeazụ nke ọrụ nke ịhụnaanya nke onye nne a, ọ ga etinye nwa ya n’aka onye ọzọ. Obi jupụtara m n’ekele maka nhọrọ ya na-abụghị maka ọdịmma onwe ya nanị, na ọ họrọghị iji ohere nhọrọ ya n’ụzọ nke ga-ewezuga nke m. Emily mechiri okwu, “Obi dị m nnọọ ekele maka atụmatụ dị nsọ nke Nna nke Eluigwe, maka nne na nna m dị ịtụnaanya ndị [hụrụ m n’anya ma na-elekọta] m, na maka tempụl ebe anyị nwere ike dị ka ezinaụlọ rachikọta onwe anyị maka ndụ ebighị ebi.”15
Onye nzọpụta “kpọọrọ otu nwa ntakịrị, ma tinye ya n’etiti ha: ma mgbe ọ jideworo ya n’aka ya, ọ gwara ha, Onye ọbụla nke ga-anabata otu nime ụmụaka [ndịa] n’aha m, anabatawo m.”16
Mgbe A Na-enwetebeghị Ọchịchọ ndị Ziri ezi
A na m ekwupụta ịhụnaanya na ọmịiko m maka di na nwunye ezi omume ndị lụrụ ma ha enweghị ike ịmụta ụmụ ndị ha chọsiri ike inwete na ụmụnwanyị na ụmụnwoke ndị ahụ ndị n’enwebeghị ohere ịlụ dị ka usoro iwu nke Chineke. Mbunobi nke ndụ ndị enwetebeghị siri ike nghọta ma ọbụrụ na-ele ya anya nanị site na anya nke ndụ anụ ahụ. Dịka onye odịbo nke Onyenwe anyị, a na m ekwe gị nkwa na dị ka ị na enwe okwukwe na Jizọs Kraịst na ọgbụgba ndụ gị, ị ga anata ngọzi dị mma na ndụ a ma ọchịchọ nke ezi omume gị n’oge ebighị ebi nke Onyenwe anyị.17 E nwere ike inwe ańụrị na njem nke ndụ anụ ahụ ọbụna mgbe anyị enweteghị olileanya nke ezi omume anyị.18
Mgbe amụchara, ụmụaka na-aganiihu ịchọ enyem aka anyị. Ụfọdụ chọsiri ya ike. Afọ ọbụla site n’aka bishọp ndị nwere obi ọma na onyinye mmepụ aka gị nke onyinye obubu ọnụ na ego enyem aka niile, ndụ nde kwuru nde na nde kwuru nde ụmụaka ka a gọziri. Otú Ndịisi Mbụ na nsonso a mara ọkwa nde dọla 20 agbakwunyere iji nyere UNICEF aka na mgbalị ha zuru ụwa iji nye ijeri vaccine abụọ.19 Chineke hụrụ Ụmụntakịrị n’anya.
Mkpebi ahụ Dị nsọ Ịmụ Nwa
Ọ bụ ihe mwute na ọbụna na ụfọdụ mba nke ụwa kachasị eme nke ọma, ụmụ ole ma ole ka a na amụ ebe ahụ.20 “Iwu nsọ nke Chineke maka ụmụ Ya ịmụba na imejupụta ụwa ka dị iré.”21 Mgbe a ga-amụ na ole a ga-amụ bụ mkpebi nke onwe a na-eme n’etiti di na nwunye na Onyenwe anyị. Na okwukwe na ekpere, mkpebi ndịa dị nsọ nwere ike bụrụ nhumiihe mara mma, ekpughere.22
A na m akọ akụkọ ezinaụlọ Laing nke Southern California. Nwanne nwanyị Rebecca Laing dere:
“N’oge sọma nke 2011, ndụ nke ezinaụlọ anyị dịịrị ka o zuru oké. Anyị nwere ańụrị n’ọlụlụ anyị anyị na ụmụ anọ anyị—gbara afọ 9, 7, 5, and 3. …
Afọ ime m na ịmụ nwa m [abụrụworịị] nke oke egwu ma agọziri anyị [nke ọma] ịnwe ụmụ anọ, [na-eche] na ezinaụlọ anyị zuru ezu. Na Ọktoba ka anyị na-ege ọgbakọ zuru ọha, e nwetere m mmetụta doro anya na anyị ga-amụta nwa ọzọ. Dị ka LeGrand na mụ tụgharịrị ma kpee ekpere, … anyị maara na Chineke nwere atụmatụ dị iche maka anyị karịa ka anyị nwere maka onwe anyị.
Emesịa mgbe anyị gabigasịrị afọ ime na ọmụmụ rara ahụ, eji ọmarịcha nwa nwanyị gọzie anyị. Anyị gụrụ ya Brielle. Ọ bụụrụ ọrụ ebube. Nwa oge amụchara ya, ka m ka nọ nime [ọnụ ụlọ ọmụmụ], a nụtara m olu nke Mmụọ doro anya: ‘E nwere otu ọzọ.’
“Afọ atọ gasịrị, ọrụ ebube ọzọ, Mia. Brielle na Mia bụ ọńụ dị egwu nye ezinaụlọ anyị.” O mechiri, “Inwe obi gheoghe maka ntụzi aka nke Onyenwe anyị na isoro atụmatụ Ya maka anyị mgbe niile ga-ewetere anyị ańụrị kacha karịa … ịdabere na nghọta nke onwe anyị.”23
Onye nzọpụta hụrụ ọmarịcha nwa ọbụla naanya.
“Ma ọ kpọọrọ ụmụaka ha, n’otu n’otu, ma gọzie ha. …
“Ma … ha chewere anya ha nihu eluigwe, … ma ha hụrụ ndị mmụọ ozi na-agbadata site neluigwe … n’etiti ọkụ; ma [ndị mmụọ ozi ahụ] … gbara ụmụntakịrị ndị ahụ okirikiri, … ma ndị mmụọ ozi lekọtara ha.”24
A na m agba ama na njem nke onwe gị dịka nwa Chineke ebidoghịrị gị dị ka ikuku ụwa nke mbụ kwobatara n’ime akpa ume gị, ma ọ gaghị akwụsị mgbe ị ga-eku ume ikpeazụ nke ndụ anụ ahụ gị.
Ka anyị mgbe niile cheta na nwa mmụọ ọbụla nke Chineke na-abịa n’ụwa maka njem nke onwe ya.25 Ka anyị nabata ha, chekwaa ha, ma mgbe niile hụ ha n’anya. Dị ka unu na anabata ọmarịcha ụmụ ndịa n’aha nke Onye nzọpụta ma nyere ha aka na njem ebighị ebi ha, a na m ekwe unu nkwa na Onyenwe anyị ga-agọzi unu ma wụkwasị ịhụnaanya na nnabata Ya n’elu unu. Na aha Jizọs Kraịst, amen.