Ịgbakwuru Oké Ịgbaọsọ.
Ọ bụghị cha ihe gbasara ihe anyị na agabiga nime ndụ kama ihe anyị na-abụ.
Dịka M gụrụ akwụkwọ nke Olụ Ndi Ozi na akwụkwọ ozi nke Pọl, o juru M anya ụdị ịhụnanya na ekele Pọl nwere na ijeozi, ịkuzi, na ịgba ama nke Jizọs Kraịst. Olee otu onye dị otua ji ejeozi were ụdị ịhụnanya na ekele, tụmadị nke-ka-nke ịcheta ahụhụ nile ọ tara? Gịnị kpaliri mụọ Pọl ijeozi? “A na m agbakwuru óké ịgba ọsọ ka m wee nata ihe a na-agbata n’ọsọ nke ọkpụkpọ dị elu nke Chineke nime Kraịst Jizọs.”1
Ị gbakwuru oké ịgbaọsọ bụ ịnọgide na okwukwe n’elu “ụzọ nke dị wara wara ma dịkwa mkpata nke na eduba na ndụ ebighi-ebi”2 anyị na Onye-nzọpụta na Nna anyị nke Elu-igwe. Pọl hụrụ ịta ahụhụ ya nile dịka “ekwesighị ka ekwuta ha ma e lee ebube ahụ anya bụ nke a g’eje ikpughe n’ebe anyị nọ.”3 Leta nke Pọl nye ndị Filipaị nke odere mgbe ọ nọ nime mkpọrọ, bụ leta nke okee ọńụ na ańụrị ma bụrụ agbamume nye anyị nile, karịsia nime oge ugbua nke ejighị naka. Anyị nile kwesiri ịnweta mgbam ume site n’aka Pọl: “A na m agu ihe nile iyi nihi ịkachasị mma nke ọmụma nke Kraịst Jizọs bụ Onye-nwe m: onye m ji nihi ya hụ ahụhụ ila niyi ihe nile nkem, ma na-agụkwa ha nihe efu, ka m wee rita Kraịst nuru.”4
Dịka anyị na-ele ijeozi nke Pọl, anyị na-enwe nkwalite mụọ na mbuli elu site na “Pọl” nile nke anyị nime ụbọchị anyị, ndị nakwa ejeozi, kuzie, ma gbaa ama jiri ịhụnanya na ekele nime akamgba nile ha na-ahụ nime ndụ ha nile na nime ndụ ndị nile ha hụrụ n’anya. Otu nhụmihe M nwere afọ itolu gara-aga nyere m aka ịmata mkpa ịgbakwuru oké ịgbaọsọ dị.
Nime 2012, dịka M gara nime nzukọ ndị ndu ọgbakọ zuruoha, enwere m mmetụta nke nnyigbu na ezughị oke. Nime obi m enwere olu na-ekwusi ike, “Ikwesịghị ịnọ ebe a! Emehiere nke ukwuu!” Dịka m na-aga ịgbali ịchọta ebe m ga-anọdụ, Okenye Jeffrey R. Holland hụrụ m. Ọ biakwutere m ma sị, “Edward, obi dị m ụtọ ịhụ gị ebe,” ma o jiri nwayọ metụ ihu m aka. E nwere m mmetụta dịka nke nwatakịrị! Ịhụnanya na mmakụ ya medara m obi ma nyere m aka nwee mụọ nke onye-otú, mụọ nke otu ụmụnna. Na ụbọchị n’eso, A hụrụ m Okenye Holland ka omere otu ihe ahụ omerela m n’ụbọchị gara-aga, ka o jiri nwayọ metụ ihu nke Okenye Dallin H. Oaks aka, onye tọrọ ya!
Na oge ahụ E nwetara m mmetụta ịhụnanya nke Onyenwe anyị site n’aka ndị nwoke a anyị na-akwado dịka ndị-amụma, ndị ọhụ-ụzọ, na ndị mkpughe. Okenye Holland, site na omume ọma ya, nyere m aka imeri ilebara nanị onwe m anya na mmetụta ezughị-oké. O nyere m aka ịlegide anya na ọrụ ọńụ di nsọ nke a kpọrọ m—iweta mkpụrụ obi nile nye Kraịst. Ya, dịka Pọl nke ochie, tụrụ m aka ka m gbakwuru oké ịgbaọsọ ahụ.
Na mmasị, Pọl na-agba anyị ume ịgaa nihu, ka ọ na-agwa anyị ka anyị chefuo ihe gara-aga—egwu anyị nile gara-aga, olile-anya anyị gara-aga, ọdịda anyị nile gara-aga, na mwute anyị gara-aga. Ọ na-akpọ anyị, dịka onye-amụma anyị hụrụ n’anya, Onyeisi Russell M. Nelson, nye “ụzọ ọhụrụ, dị nsọ.”5 Nkwa nke Onye-nzọpụta dị adị n’ezie: “Nihi na onye ọbụla nke na-achọ ịzọpụta ndụ ya, ọ ga atufu ya: ma onye ọbụla tufuru ndụ ya nihi m ga ahụ ya.”6
Okwu nke mbụ m kwuru nime ọgbakọ zuruoha, A kọrọ m nhụmihe nke nne m kụziri m ịrụ ọrụ nime ubi anyị. “E lekwala anya n’azụ,” ka o kwuru. “Lee anya n’ihu ihe anyị ka nwere ime.”7
Na ngwụsị nke ndụ ya, ka ọ na-arịa cansa, ya na Naume na mụ biiri. Otu abali A nụrụ m ka ọ na-ebe akwa nime ime ụlọnta ya. Mgbu ya siri ike, agbanyeghị na ọńụrụ ọgwụ morphine ya awa abụọ gara-aga.
A banyere m ụlọnta ya ma soro ya bee akwa. E kpere m ekpere ka onweta enyem aka site na mgbu ya. Ma o mere otu ihe ahụ o merela nime ubi afọ ole na ole gara-aga: ọ kwụsịrị ma kuziere m ihe. E nweghị m ike chefuo ka ihu ya dị oge ahụ: esighị ike, dị egwu, ma jupụta na mgbu, were ọmịiko n’ele nwa ya nwoke na eru uju. Ọ chịrị ọchị site na anya mmiri ya, lebara anya nime anya m, ma kwuo,”Ọ bụghị gị ma-ọbụ onye ọzọ ọbụla, kama ọ bụ ChIneke mara ma mgbu nke a ga-ala ma-ọbụ na ọgaghị ala.”
E jiri m nwayọ bilite. Ya jikwa nwayọ nọrọ ọdụ. Ihe ahụ mere ka doro anya n’uche m. Abali ahụ, site n’aka nne m, Onyenwe anyị kuziri m ihe m agaghị echfu mgbe ebighi-ebi. Dịka nne m gosiri nnabata nke uche nke Chineke, E chetara m ihe mere Jizọs Kraịst jiri taa ahụhụ nime Ubi nke Getsemena na n’elu obe na Gọlgọta. Ọ sịrị: “Lee enyewo m unu oziọma m, ma nke a bụ oziọma ahụ nke m nyeworo unu—na m bịara n’ime ụwa ime uche nke Nna m, n’ihi na Nna m zitara m.”8
A na m eche maka ajụjụ nile nke onye-amụma nke Onyeisi Nelson anyị hụrụ n’anya jụrụ anyị na ọgbakọ zuruọha nke ikpeazụ. Onyeisi Nelson jụrụ: “Ịdị na njikere ị kwe ka Chineke merie n’ime ndụ gị? Ịdị na njikere ị kwe ka Chineke bụrụ mmetụ kachasị mkpa n’ime ndụ gị? … Ị ga-ekwe ka olu Ya … dịrị mkpa karịa ihe ọbụla? Ị dị njikere ị kwe ka uche Ya kpugide uche gị?”9 Nne m gara ejiri “ee,” siri ike na nke nwere mmetụta uche zaa ajụjụ ahụ, ma ndị otú nke Nzukọ-nsọ n’ụwa nile nwere okwukwe ga ejikwa mmetụta uche mana siri ike zaa “ee.” Onyeisi Nelson, ekelere m gị maka iji ajụjụ nke onye-amụma ndị ahụ kwalite mụọ anyị.
Mgbe adịghị anya, enwere m mkparịta ụka nime Pretoria, South Africa, mụ na otu Bishọp onye nke liri nwunye ya na nwa ya nwanyị toro eto na otu ụbọchị. Ọrịa zuru ụwa nke coronavirus gburu ha. A jụrụ m ya otu osi eme. Ọziza nke Bishọp Teddy Thabete mere ka mkpebi m isoro mkpụrụ okwu nile na ndụmọdụ sitere naka ndị-amụma, ndị-ọhụ ụzọ, na ndị mkpughe nile nke Onyenwe anyị sikwuo ike. Bishọp Thabete zara na enwere olile anya na nkasi obi mgbe ọbụla ịma na Onye-nzọpụta ewerela na onwe Ya mgbu nile nke ndị Ya ka Ọ mara otu esi akasi anyị obi.10 O jiri okwukwe miri emi gbaa ama, “E nwere m obi ekele maka atụmatụ nke nzọpụta, atụmatụ nke ańụrị.” Mgbe ahụ ọ jụrụ m ajụjụ: “Ọ bụghị ihe onye-amụma anyị nọ na agbalị ikuziri anyị na ọgbakọ ikpeazụ a?”
Ka akamgba nile nke ndụ ga-abiakwute anyị nime otu ụzọ ma-ọbụ ọzọ, ka anyị lekwasị anya na mgbaru ọsọ nke “ịgbakwuru oké ịgbaọsọ,” nke bụ “ihe nrita nke ọkpụkpọ okú dị elu nke Chineke.”11
Ihe m ji obi umeala agwa anyị nile bụ adala mba! Akpọrọ anyị ka “ka anyị tụpụkwa ibu nile ọbụla, na mmehie ahụ nke na-arapara anyị n’ahụ nke ukwuu, ma ka anyị werekwa ntachi obi gbaa ọsọ ahụ edebere anyị nihu, na-elegide Jizọs anya bụ onye ndu na onye mmezu nke okwukwe anyị.”12
Ọ bụghị cha ihe gbasara ihe anyị na agabiga nime ndụ kama ihe anyị na-abụ. Enwere ọńụ nime ịgbakwuru oké ịgbaọsọ. A na m agba-ama na Ya onye meriri ihe nile ga-enyere anyị aka dịka anyị na elekwasị Ya anya. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen.