Ndị ntakịrị dara Ogbenye
Nime ngalaba ụka nile, anyị chọrọ onye ọbụla—ndị ahụ siri ike ma ndị ahụ nwere ike na-agba mbọ isi ike. Onye nile dị mkpa.
Dịka nwata nwoke, echetara m otu mgbe nnam kwọ m na ụgboala, ma n’ahụta ndị mmadụ nọ n’akụkụ ụzọ ndị hụtara onwe ha nime ọnọdụ siri ike ma ọbụ ndị chọrọ enyemaka. Mgbe nile ahụ ka nnam g’ekwu okwu a “Pobrecito,” nke nkọwa ya bụ “onye ntakịrị dara ogbenye.”
N’otu oge, a hụrụ m otu nnam si enyere ọtụtụ ndị ahụ aka, tụmadị mgbe anyị gara njem ruo Mexico ị jee leta nne na nna ukwu m. Ọ na-achọtakarị otu onye nwere mkpa ma gaa na nzuzo ịrọpụtara onye ahụ enyemaka onye ahụ chọrọ. Emesịrị m mata na ọ n’enyere ha aka tinye ha na ụlọakwụkwọ, zụta nrị, m’ọbụ nye aka n’ụzọ ọbụla maka ọdịmma ha. Ọ n’eje ozi nlekọta nye “onye ntakịrị dara ogbenye” gafere ụzọ ya. N’ezie, nime afọ nile m n’eto-eto, agaghị m echeta oge anyị n’enweghi onye bi n’ụlọ anyị nihi ọ chọrọ ebe ọ g’anọ tupu ụkwu esie ya ike ị nọ na nke ya. Dika m n’ele ahụmịhe ndịa, ọ rọpụtara nime m mmụọ ịnwe ọmịiko n’ebe nwoke na nwanyị ibe m nọ makwa n’ebe ndị nwere mkpa nọ.
Nime Preach My Gospel ekwuru: “Ndị mmadụ gbara gị gburugburu. Ị na-agafe ha n’ụzọ, ị n’eje nleta n’ebe obibi ha, ma na-eme njem n’etiti ha. Ha nile bụ ụmụ nke Chineke, ụmụnne gị ndị nwoke na nwanyị. … Ọtụtụ nime ndịa n’achọ ịmata ebumnuche dị nime njem ndụ nkea. Ịhe gbasara ọdịnihu nke ha na nke ndị ezinụlọ ha n’echegbu ha n’obi” (Preach My Gospel: A Guide to Missionary Service [2018], 1).
Kamgbe ọtụtụ afọ nile m n’eje ozi nime Nzukọ-nsọ a, agbawo m mbọ ị chọta ndị ahụ chọrọ enyemaka na ndụ ha, ma enyemaka nke anụ arụ ma nke mụọ. Mgbe na mgbe ka m na-anụ olu nna m ka ọ n’ekwu, “Pobrecito,” onye ntakịrị dara ogbenye.
Nime Baịbụlụ, anyị n’ahụta ọmarịcha ọmụmatụ nke metụtara ịlekọta otu onye ntakịrị dara ogbenye:
“Ugbua Pịta na Jọn gbagotara elu wee baa nime tempụl n’oge awa nke ekpere, nke bụ awa nke itolu.
“Ma otu nwoke onye si na afọ nne ya daa ngwọrọ ka ebutere, onye ụbọchị nile ka a n’edobe ya n’ọnụ ụzọ nke tempụl ahụ akpọrọ Beautiful, ka ọ wee rịọ ego site n’aka ndị ahụ na-abanye nime tempụl ahụ;
“Ọnye mgbe ọ hụrụ Pita na Jọn dịka ha na-akwado ị banye nime tempụl ahụ, riorio ha ego.
“Ma Pita, dịka ọ n’elekwasị ya anya ya na Jọn, kwuru, Lee anyị anya.
“Ma ọ gere ntị nye okwu ha, ma n’eche n’obi ya n’ọga anata otu ịhe si n’aka ha.
“Mgbe ahụ pita kwuru, enweghi m ọla ọcha na ọla edo; mana ịhe ahụ m nwere A ga m enye gị: N’aha nke Jizọs Kraịst onye Nazareth, bilie ma jee ije.
“Ma ọ jidere ya n’aka nri ya, ma dọlie ya elu: ma ozugbo ahụ ụkwụ ya na ọkpụkpụ ụkwụ ya nwetere ike” (Ọlụ 3:1–7; agbakwụnyere nkọwa).
Mgbe m n’agụ akụkọ nke a, ịhe metụrụ m n’obi bụ gịnị kpatara ejiri tinye mkpụrụ okwu nkea nlekwasị anya. Mkpụrụ okwu nkea nlekwasị anyapụtara ị tinye anya mmadụ nile, mọbụ echiche nile, m’ọbụ ị lepagịde ịhe anya (see “fasten,” Dictionary.com). Dịka Pịta lere nwoke ahụ anya, ọ hụrụ ya n’ụzọ dị iche n’abụghị otu ndị ọzọ si n’ahụ ya. Ọ lere ya anya gafee ngwọrọ ọ dara ma adịghị ike ya nile, ma ọ hụtara na okwukwe ya zuru oké ị nata ọgwụgwọ ma soro baa nime tempụl ka ọ natakwa ngọzi nile nke ọ na-achọ.
A chọpụtakwaram na ọ jidere ya n’aka nri ya ma dọlie ya elu. Dịka ọ nyeere nwoke ahụ aka n’ụzọ dị otua, Onyenwe anyị jiri ọrụ ebube gwọọ ya, ma “ụkwụ ya na ọkpụkpụ ụkwụ ya nwetere ike” (Ọlụ 3:7). Ịhụnaanya ọ nwere maka nwoke ahụ ma ọchịchọ obi ọ nwere ị nyere ya aka, mere ka nwoke ahụ n’adịghị ike nwete mbawanye nke ike na ume.
Dịka m n’eje ozi dịka Onye Iri Asaa Mpaghara, edobere m abalị Tuesday ọbụla maka mụ na ndịisi stake ọbụla nọ n’okpuru m ị mee nleta ije ozi nlekọta. Akpọrọ m ha ka ha chọta onye ọbụla ha cheere n’obi ha n’enwetebeghi otu emume dị nsọ nke oziọma nke Jizọs Kraịst, mọbụ ọnye ọbụla n’adịghị edobe ọgbụgba ndụ nke ọ gbara. Site na ije ozi nlekọta anyị nke anyị n’emezu mgbe nile, Ọnyenwe anyị bawanyere mbọ anyị nile ma anyị chọtara ndị mmadụ ma ndị ezinụlọ ndị nọ na mkpa. Ndịa bụbụrụ “ndị ntakịrị dara ogbenye” ndị bi nime stake nile dị iche iche ebe anyị jere ozi.
Otu oge, esoro m Onyeisi Bill Whitworth, onye isi nke Sandy Utah Canyon View Stake, ijee mee ọtụtụ nleta ije ozi nlekọta. Ọ kpere ekpere ị mata onye anyị g’eje leta, ọ gbara mbọ ị nweta ụdị ahụmịhe ahụ Nifaị nwetere, onye “Mmụọ duru, n’ihi na amaghị m ihe [ọ] ga-eme na mbụ” (1 Nifaị 4:6). Ọ gosiri na dịka anyị n’eje ozi nlekọta, ọ kwesịrị ka mkpughe duo anyị chọta ndị ahụ chọsịrị enyemaka ike, karịa ị soro ndepụta aha dị na akwụkwọ mọbụ ị zute ndị mmadụ n’ụlọ ha kọdịkwa ka a n’eme. Ọ kwesịrị ka ike nke mkpali mmụọ bụrụ ịhe n’edu anyị.
Echetaram mgbe m jere n’ebe obibi otu di na nwunye dị nta, Jeff na Heather, na nwa ha nwoke dị ntakịrị, Kai. Jeff toro dịka onye otú Nzukọ nsọ kwụsiri ike. Ọ nwere akaraaka n’egwuruegwu ị gba ọsọ ma ọdịnihu ya bụ nke ga-adị mma. Ọ bidoro siwe n’ụzọ Nzukọ-nsọ pụwa mgbe ọ nọ afọ ntoroọbịa nta ya. Emesịa, ọ nwere mberede nke ụgbọala, nke gbaworo otu ụzọ ndụ ya kwesịrị isi jee. Dịka anyị bara nime ebe obibi ha, ma mata onwe anyị nke ọma, Jeff jụrụ anyị ịhe kpatara anyị ji bịa ileta ezinaụlọ ya. Anyị zara na enwere ndị otú stake ahụ ruru 3000 ndị bi na ogige stake ahụ. E mesịrị m jụọ ya, “Jeff, nagbanyeghi ọtụtụ ebe obibi ndị ọzọ anyị gaara eje nleta n’abalị a, gwa anyị ịhe mere Onyenwe anyị jiri ziga anyị ebe a.”
Mgbe anyị kwuru nkea, ọ metụrụ Jeff n’obi, ma ọ wee bido gwawa anyị ụfọdụ nchegbu ya ma ụfọdụ ịhe ndị ha na-agabiga n’ezinaụlọ ha. Anyị bidoro kuziwere ha ụkpụrụ dị iche iche nke oziọma nke Jizọs Kraịst. Anyị kpọrọ ha okú ka ha mewe ụfọdụ ịhe n’adịrị ha ka o siri ike na mbụ ma emesịa ọ nwere ike ị nwete nnukwu añụrị na ọñụ. Emesịa Onyeisi Whitworth nyere Jeff ngọzị nke ọkwa nchụ aja k’ọnyere ya aka megide aka-mgba ya nile. Jeff na Heather kwere ị mee ịhe nile anyị gwara ha mee.
Ka otu afọ gasịrị, ọ bụrụ m ohere pụrụ iche ị lee ka Jeff si mee nwunye ya Heather baptizim dịka onye otù Nzukọ Nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazu a. Ugbua, ha na-akwado onwe ha ịbanye na tempụl ka arachie ha dịka otu ezinaụlọ maka nke oge na nke ebighi ebi nile. Njem nleta anyị ahụ gbanwere ụzọ ndụ ha n’ụzọ nke anụ ahụ ma nke ime mmụọ.
Onye-nwe-anyị ekwuwo:
“Ya mere, jupụta n’okwukwe, guzoro n’ọkwa-ọrụ nke m nyeworo gị; lekọta ndị n’adịghị ike, welite aka ndị ahụ rudara ala, ma mee ka ikpere nile ndị n’adịghị ike ka ha guzozie.” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 81:5
“Ma n’ime ihe ndia ị ga-eme ihe kachasị dị mma nye ndị mmadụ ibe gị, ma ga-ebuli otuto ya elu onye bụ Onyenwe gị.” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 81:4).
Ụmụnne ndị nwoke na nwanyị, Pọl onye Ozi kuziri otu ihe dị mkpa gbasara ije ozi nlekọta anyị. Ọ kuziri na anyị nile bụ “anụ ahụ nke Kraịst, ma bụrụkwa otu akụkụ nke anụ ahụ ya” (1 Ndị Kọrịnt 12:27ma otu akụkụ anụ ahụ ọbụla dị mkpa maka ahụ nile ahụ ịnwete ọmụma ịhe. Emesịa, ọ kuzie otu eziokwu siri ike nke banyere nime ime obi m mgbe m gụrụ ya. O kwuru, “Kama ọ bu akụkụ ahụ nke ahụ nke echere na ha adighị ike bu ndị dị mkpà nke-ukwu:: akụkụ ahu nke ahụ, nke anyị chere na ekwesịghị ịsọpụrụ dịka akụkụ ọzọ, akuku ndia ka anyị nenyebiga kwa nsọpụrụ ókè karia;” (1 Ndị Kọrịnt 12:22–23; agbakwụnyere nkọwa).
Nihi nkea, nime ngalaba ụka nile, anyị chọrọ onye ọbụla—ndị ahụ siri ike ma ndị ahụ nwere ike na-agba mbọ isi ike. Onye nile dị mkpa maka mmụta ịhe dị mkpa nke “anụ ahụ nile nke Kraịst.” A na m eche mgbe ụfọdụ onye ahụ n’adịghị abịa ụka nime ịgwé ndị ụka dị iche iche, onye nke g’agba anyị ụme ma mee k’anyị zuo oké.
Okenye D. Todd Christofferson kuziri: “Nime Nzukọ nsọ nkea, anyị anaghị amụ nanị maka ukpuru nke dị nsọ; anyị n’enwetekwa nhụmịhe nke itinye ya n’omume. Dịka anụ arụ nke Kraịst, ndị otú Nzukọ nsọ n’ejekọrịtara onwe ha ozi nleta dịka o siri metụta ndụ ha kwa ụbọchị. Anyị nile ezughi oké. … Nime anụ arụ nke Kraịst, anyị kwesịrị ịkarị ị kuzi sọ nkuzị mọbụ kwuo sọ okwụ, ma bụrụ ndị ‘n’eme eme’ dịka anyị n’amụta ‘ibikọta ọnụ n’ịhụnanya’ [Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 42:45]” (“Why the Church,” Liahona, Nov. 2015, 108–9).
Na 1849, Brigham Young rọrọ nrọ ebe ọ hụrụ Onye Amụma Josef Smith ka ọ na-edu nnukwu ịgwé atụrụ na nke ewu. Ụfọdụ nime ndị anụmanụ ndịa buru ibu, ma ma mma; ụfọdụ ndị ọzọ dị ntakịrị ma ruo inyi. Brigham Young chetara mgbe ọ lebara Onye Amụma Josef Smit nime anya ya ma kwuo, “Josef, ị nwekwara igwé anụmamụ kacha ịgwanwoju anya … nke m huworo na ndụ m; kedụ ịhe ị g’eji ha eme?” Onye amụma ahụ, onye n’achọghịdị ịma otu igwé anụmanụ ya dị, zaghachiri, “[Brigham,] ha nile dị mma n’ụzọ nke ha.”
Mgbe Onyeisi Young tetara n’ụra, ọ ghọtara na n’agbanyeghị na Nzukọ nsọ nkea ga-akpọkọta “atụrụ na ewụ” dị iche iche, ọ bụ oké n’ọrụ ya ị kpọbata onye nile nime ma hapụ ka ha ruo akaraka ha dịka ha n’ewere ọnọdụ ha nime Nzukọ-nsọ. (Adapted from Ronald W. Walker, “Brigham Young: Student of the Prophet,” Ensign, Feb. 1998, 56–57.)
Ụmụnne ndị nwoke na nwanyị, mbido okwu m bidoro mgbe m chere echiche dị omimi maka otu onye ahụ n’akwụsighi ike nime Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst ugbua. Ugbua ọ ga amasị m ị kwuru ha okwu otu n’otu. Okenye Neal A. Maxwell akụziwo na “ụdị mmadụ dị otu ahụ nwere ike ị nọ Nzukọ nsọ nso mana ha anaghị esonye na ihe a n’eme. Ha agaghị abata nime ụlọ-ụka, mana ha agaghị ahapụ isi n’ihu ezi ya pụọ. Ndịa bụ ndị chọrọ Nzụkọ nsọ, ma Nzụkọ nsọ achọkwa ha, mana ha bụ ndị “ bi nime ụwa ma enweghi Chineke nime ndụ ha’ [Mozaya 27:31Why Not Now?,” Ensign, Nov. 1974, 12).
A ga m ekwugharị okpụkpọ okú nke Onyeisi Russell M. Nelson anyị hụrụ n’anya kpọrọ, dịka o kwuuru ndị otú Nzukọ nsọ nkea okwu nke mbụ. O kwuru: “Ugbua, maka onye-otú ọbụla nke Nzukọ-nsọ a na m asị, nọrọ n’ụzọ nke ọgbụgba-ndụ. Mkpebi gị isoro Onye-nzọpụta site n’igba ọgbụgba-ndụ ha na Ya ma emesia na-edebe ọgbụgba-ndụ ndị ahụ ga-emepe ụzọ nke ngọzi ime mmụọ niile na oghere-ọma dịrị ndị nwoke, ndị nwanyị, na ụmụntakịrị ebe niile.”
Emesịa ọ rịọrọ: “Ugbua, ọ bụrụ na ị zọpụwo ụkwụ n’ụzọ ahụ, ka m jiri olile-anya niile dị n’ime obi m kpọkuo gị si biko laghachi azụ. Ihe ọbụla nke n’echegbu gị, ihe ndị ọbụla bụ aka mgba gị, enwere oghere nọọrọ gị n’ime n’ebe a, Nzukọ-nsọ nke Onyenwe anyị. Gị na ndudugandu gị niile nke ana amụbeghị ka aga agọzi site na omume gị niile ugbuaịlaghachi n’ụzọ nke ọgbụgba-ndụ ahụ” (“As We Go Forward Together,” or Liahona, Apr. 2018, 7; emphasis added).
A nam agba ama maka Ya, ọbụna Jizọs Kraịst, Nnaukwu Onye nlekọta ahụ na Onye Nzọpụta nke anyị nile. A na m akpọ onye ọbụla nime anyị okú k’anyị chọpụta ndị “pobrecitos,” ndị “ntakịrị dara ogbenye” nọ n’etiti anyị nwere mkpa. Nkea bụ olileanya m ma ekpere m n’aha Jizọs Kraịst, amen.