Olilenanya na Kraịst
Ịhe anyị chọsịrị ike bụ ị nyere ndị n’enwe mmetụta ịnọ nanị mọbụ nke esonyeghi na ịhe a neme aka. Ka m kwuo maka ndị ahụ n’emebeghị ọlụlụ ugbua.
Ụmụnne ndị nwoke na nwanyị, n’oge Ista nke a, anyị n’elekwasị anya na Mbilite n’ọnwụ dị ebube nke Onyenwe anyị na Onye-nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst. Anyị n’echeta ọkpụkpọ okú dị ịhụnanya nke Ya kanyị “bịakwutenụ m, unu ndi na-adọgbu onwe unu n’ọrụ, ndi e bowokwara ibu dị arọ, Mụ onwe m ga-emekwa ka unu zuru ike.
“Nyaranụ yok m, mụtakwanụ ihe n’aka m; n’ihi na m dị nwayọọ, dịkwa umeala n’obi: mkpụrụ obi unu ga-enweta ume.
“N’ihi na ihe nkekọta nke m adịghị egbu mgbu, ibu m dịkwa mfe.”1
Ọkpụkpọ okú nke Onye nzọpụta kpọrọ k’anyị bịakwute Ya abụghi nanị okú nye onye nile k’ọbịakwute Ya kama ka ha sonyekwa Nzụkọ nsọ Ya.
Na amaokwu nke nọ tupu ọkpụkpọ okú ahụ, Jizọs kuziri otu esi eme ya site n’isoro Ya O kwupụtara, “Ọdịghi nwoke [mọbụ nwanyị] mazuru Ọkpara ahụ, mọbụghị Nna; ọ dịghị kwa nwoke ọbụla [mọbụ nwanyị] mazuru Nna ahụ, mọbịghị Ọkpara Ya, ma ọnye ọbụla Ọkpara nezube ikpughe Ya nye ya.”2
Jizọs chọrọ k’anyị mara na Chineke bụ Nna nke Igwe nwere ịhụnanya.
Ọ bụrụ n’anyị mata na Nna anyị nke Igwe hụrụ anyị n’anya, ọ g’enyere anyị aka mata ọnye anyị bụ ma mara na anyị sonyere nime nnukwu ezinụlọ nke ebighi ebi Ya.
Oge n’eteghi aka, Mayo Clinic chọpụtara na “Ọ dị oke mkpa ịnwe mmetụta n’obi na isonyere n’ịhe. … Ịhe nile banyere ndụ anyị bụ ịhe ahaziri ahazi dịka ịhe sonyere na otu ịhe. Nchọpụta ahụ gbakwụnyere na, “Anyị agaghị asị na isonye nihe a neme adịghị mkpa maka ahụ-ike nke anụ arụ na nke uche anyị.”3—ma a ga m agbakwụnye ahụ-ike nke ime mụọ.
Na mgbede tupu ntaramahụhụ Ya na Gethsemane ma ọnwụ ya n’elu obe, Onye nzọpụta zutere ndị n’eso Ya maka Oriri abalị nke Ikpeazụ. Ọ gwara ha, “Na ụwa unu ga enwe mkpagbu: ma na nwee nụ ańụrị; E-meriwo m ụwa.”4 Tupu anyanwụ adaa n’ụbọchị nke sochiri ya, Jizọs Kraịst tara ahụhụ ma ọ “nwụrụ [n’elu obe] maka mmehie nile anyị.”5
A na m atule uche ụdị mmetụta ịnọ nanị dasara ndị iyom na ndị ikom ahụ nọ n’obodo Jerusalem mgbe ahụ anwụ dara ma ọchịchịrị na egwu adakwasị ha.6
Dịka ndị n’eso ụzọ ya nke mgbeochie afọ 2,000 gara-aga, ọtụtụ nime unu nwere ike nwee mmetụta ịnọ nanị mgbe na mgbe. Enwetawo m mmetụta ịnọ nanị kemgbe nwunye m ọma Barbara nwụrụ, ịhe gafere afọ abụọ n’ọkara gara aga. A mam ịhe ọ pụtara na ndị ọtú ezinụlọ, ndị enyi, ndị anyị na ha n’arụkọ ịgba anyị gburugburu, ma a n’enwekwa mmetụta ịnọ nanị—nihi ịhụnanya nke ndụ m anọghịzi na akụkụ m.
Ọrịa ozuru ụwa nke COVID-19 ebupụtawo mmetụta nke ịnọ nanị nime ndụ ọtụtụ mmadụ. Nagbanyeghi mwale ndị n’agba anyị mgba na ndụ nkea, anyị nwere ike dịka otu ọdị n’ụtụtụ nke Ista ahụ, bilite na ndụ ọhụrụ nime Kraịst, ma jiri ohere ọhụrụ pụrụiche, ma ụzọ ọhụrụ ma lekwasị anya na Onyenwe anyị maka olileanya na mmetụta isonye.
Ụfụ ndị ahụ n’adịghị enwe mmetụta isonye n’emetụ m n’obi. Dịka m n’ele akụkụ-ozi si gburugburu ụwa, A na m ahụ ọtụtụ ndị na-agabiga nhụmịhe nke ịnọ nanị. Echerem na, maka ọtụtụ mmadụ, ọ ga-bụ nihi ha amaghị na Nna nke Igwe hụrụ ha n’anya nakwa n’anyị nile sonye nime ezinụlọ nke ebighi ebi Ya. Ị kwere na Chineke hụrụ anyị n’anya ma n’anyị bụ ụmụ Ya n’akasị obi ma n’agba anyị ume.
Nihi anyị bụ ụmụ nke mụọ nke Chineke, onye nile nwere mbido dị nsọ, ejirimara na akaraka dị nsọ. Onye ọbụla nime anyị “bụ nwa nwoke ma-ọbụ nwa nwanyị nke mụọ a hụrụn’anya nke nne na nna nke elu-igwe”7 Nke a bụ ejirimara anyị! Nke-a bụ ọnye anyị bụ n’ezie!
Ejirimara anyị nke mụọ n’abawanye mgbe anyị ghọtara ejirimara anyi nile nke anụ arụ, ma agbụrụ, omenala na ịhe nketa obodo anyị.
Ejirimara nke mụọ na nke omenala, ịhụnanya ma isonye nwere ike kpalie olileanya ma ịhụnanya anyị nwere maka Jizọs Kraịst.
Okwu m maka olilenanya na Kraịst adịghị ka echiche nke napụghị ịpụta ịhé. Kama, A nam ekwu maka olileanya dịka ebumnobi nke g’abịa n’emezu. Ụdị olileanya nkea dị oke mkpa maka imeri ịhe isi ike, ị hiwe nnagide na ume nke mụọ, ma ịbịa mata na Nna nke Ebigh ebi hụrụ anyị nanya, na anyị bụ ụmụ Ya, ndị sonyere na ezinụlọ Ya.
Mgbe anyị nwere olilenanya na Kraịst, anyị g’abịa mara na anyị kwesịrị ị mee ma dobe ọgbụgbandụ dị nsọ, ọchịchọ anyị ndị kacha masị anyị ma nrọ anyị nile nwere ike ịbịa na mmezu site na Ya.
Kworum Ndị Ozi Iri na Abụọ agbawo izu n’etiti ha nime mụọ nke ekpere, ma ọ nụrụ ha ọku n’obi ị ghọta otu esi enyere mmadụ nile aka ndị n’enwe mmetụta nke ịnọ nanị mọbụ nke esonyeghi. Ịhe anyị chọsịrị ike bụ ị nyere ndị n’enwe ụdị mmetụta a aka. Ka m kwuo maka ndị ahụ n’emebeghị ọlụlụ ugbua.
Ụmụnne ndị nwoke na nwanyị, ọtụtụ ndị toro-eto nime Nzukọ-nsọ anyị taa bụ ndị isi mkpe, ndị gbara alụkwaghịm, mọbụ ndị n’emebeghi ọlụlụ. Ụfọdụ n’eche maka ohere nile ha nwere ma ọnọdụ ha nọ nime atụmadụ nke Chineke ma nime Nzukọ nsọ. Anyị kwesịrị ịghọta na ndụ ebighi ebi abụghị nanị ajụjụ maka mmadụ ọ gbawo akwụkwọ mọbụ mba, kama ọ bụ maka isoro ụzọ ya ma “nọsie ike n’ịgba ama nke Kraịst.”8 Olileanya nke ndị nile n’emebeghi ọlụlụ bụkwa ụdị nke ndị otú nile nke Nzụkọ nsọ nke Onyenwe anyị eweghachitere—ịnwete amara nke Kraịst site na “nrube isi nye iwu nile na emume-nsọ nile nke Oziọma.”9
A na m atụpụta na enwere ụfọdụ ukpuru ndị dị mkpa nke anyị kwesịrị ịghota.
Nke mbụ, akwụkwọ nsọ na ndị amụma nke ụbọchị ikpeazu a ekwuwo na mmadụ nile kwụsịrị ike n’idobe ọgbụgbandụ nke oziọma g’enwe ohere maka mbuli elu ahụ. Onyeisi Russell M. Nelson akụziwo na: “N’ụzọ ma n’oge nke Onyenwe anyị, agaghị enwe mọlị ngọzị nke agaghị erutere Ndị Nsọ Ya kwụsịrị ike n’okwukwe. Onyenwe anyị g’ekpe ikpe ma kwụọ onye ọbụla ụgwọ dịka otu ọchịchọ obi onye ahụ sịrị dị ma ịhe ọ metara.”10
Nke abụọ, ekpughebeghị oge na ụzọ nile eji enyekwasị ngọzị nile nke mbuli elu, mana ha bụ nke a ga-emezurịrị.11 Onyeisi Dallin H. Oaks kọwara na ụfọdụ ọnọdụ anyị n’ahụ “na ndụ anu arụ nkea bụ nke a ga-edozi n’oge Millennium, oge arọpụtara iji mezuo ịhe nile nke n’ezughi ezu nime atụmatụ ukwu maka ụmụ nile tọzụrụ oké nke Nna.”12
Nke apụtaghị na ngọzị nile ka edowere ruo n’oge Millenium: ụfọdụ bụ nke anataworo ma ndị ọzọ ka a ga aga n’ihu na-anata ruo n’ụbọchị ahụ.13
Nke atọ, ịchere n’oge Onyenwe anyị pụtara ị ga n’ihu n’ịrube isi ma n’eto eto na mụọ ruo ebe Ọ nọ. Ịche, n’oge nke Onyenwe anyị abụghị ị nọ nnọọ nkịtị. Ị kwesịghị ị kpa agwa dịka onye nọ nime ụlọ-nta nke nchere mmadụmọlị.
Ịche, n’oge nke Onyenwe anyị pụtara ịrụ ọrụ. Amụtawo m kamgbe ọtụtụ afọ ndịa na olilenanya anyị na Kraịst n’amụbanye mgbe anyị n’ejere ndị ọzọ ozi. Ijee ozi dịka Kraịst siri jee neme ka olileanya anyị nwere na Ya bawanye.
Otito nke onwe nke mmadụ g’enwete ugbua mgbe ọ ji ndidi n’eche oge nke Onyenwe ma nkwa Ya bụ otu ịhe n’enweghi ọnụ ahịa, dị nsọ nke dị nime atụmatụ Ọ nwere maka onye ọbụla nime anyị. Aka mmadụ g’etinye ugbua iji wulite Nzukọ nsọ n’ụwa ma iji kpọkọta Izrel bụ ịhe ndị achọsịrị ike. Ma mmadụ ọ luwo di na nwunye mọbụ ọlụbeghi enweghi ịhe ọ neme ike mmadụ ji eje ozi. Onyenweanyị na-akwanye ugwu nye ndị ahụ n’eje ozi ma jiri ndidi na okwukwe n’eche n’oge Ya.14
Nke anọ, Chineke n’enye ụmụ Ya nile ndụ ebighi ebi. Ndị nile ga-anabata onyinye-amara nchegharị nke Onye nzọpụta nyere, ma dobe iwu Ya nile ga-anata ndụ ebighi ebi, nagbanyeghi na ha etorughị inwete ejirimara ya na ntozu oké ya n’oge ndụ anụ arụ. Ndị nile g’echegharị ga-amata na Onyenwe anyị dị na njikere ị gbaghara dịka otu osi kwe na nkwa, “E, ma ugbọrọ ole ọbụla ndị m chegharịrị ka m ga-agbaghara ha njehie ha nile megide m.”15
Na ntule nke ikpeazụ, ike mmadụ nwere, ọchịchọ ya, ma ohere nile ọ nwetere banyere ohere nhọrọ nke aka ya, tinyekwa itozu oké ị nata ngọzi nile nke ebighi ebi, bụ ịhe nanị Chineke g’ekpe ikpe dị na ya.
Nke ise, obisike anyị nwere nime nkwa nile ndị ahụ gbara mgbọrọgbụ nime okwukwe anyị na Jizọs Kraịst, onye site n’amara ya ka a na-edozi n’ụzọ ziri ezi ịhe nile metụtara ndụ anụ arụ.16Ngọzị nile ekwere na nkwa g’ekwe omume site na Ya, onye nihi Aja mgbaghara mmehie Ya, “rịdara n’okpuru ihe nile”17ma “merie ụwa ahụ.”18 Ọ “nọdụwo nʼaka nri nke Chineke, na ịnata site nʼaka Nna ihe nile ruru ya nke ebere nke o nwere nʼarụ ụmụ nke mmadụ[;] … ya mere ọ na-ekwuchita ihe gbasara ụmụ nke mmadụ.”19 N’ikpe azụ, “ndị-nsọ nile ga-ejupụta n’ebube ya, ma nata ihe-nketa ha”20dịka ndị “g’eso Kraịst keta oké.”21
Ọchichọ obi anyị bụ, na ukpuru ndịa g’enyere onye nile aka iwulite olilenanya na Kraịst ma mara na ha sonyere.
Echefukwala na ị bụ nwa nke Chineke, Nna anyị nke Igwe, ugbua ma ebighi ebi. Ọ hụrụ gị naanya ma Nzụkọ nsọ chọrọ gị ma chọsie gị ike. Eeh, anyị chọsiri gị ike! Anyị chọrọ olu gị nile, akaraka gị nile, ịdịmma gị , ma eziomume gị.
Kemgbe ọtụtụ afọ, anyị ekwuwo maka “ndị ntorobịa n’emebeghi ọlụlụ,” “ndị toro eto n’emebeghi ọlụlụ,” ma “ndị toro eto.” Aha ndịa n’enye aka mgbe anyị na-ahazị ịhe ole n’ole mgbe ụfọdụmana ha jikwa wayọ agbanwo otu anyị si ahụkọrịta ndị ọzọ.
Enwere otu ị nwere ike iji hapụ ma gbanarịa agwa nkea n’ekewa anyị site n’etiti ndị ọzọ?
Onyeisi Nelson gwara anyị k’anyị kpọọ onwe anyị dịka ndị otù Nzukọ Nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazu a. Ọ dịka nkea kpuchitere anyị nile, ọ bụghị ya?
Oziọma nke Jizọs Kraịst nwere ike imee k’anyị dịrị n’otu. N’ezie anyị ka yie onwe anyị karịa otu anyị sịrị dịrị iché. Dịka ndị otú ezinụlọ nke Chineke, anyị niile bụ ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị n’ezie. Pọl kwuru, “Ma [Chineke] emewo site n’otu ọbara mba nile nke ụmụ mmadụ maka ibi na mbara iru nile nke ụwa.”22
Maka ndịisi stek nile, ndị bishọpụ, ndị ndu kworum ma nke ụmụnne nwanyị, A na m arịọ ka ịwere onye otú stek nile, ngalaba ụka gị, kworum, ma otú nile dịka onye otú nwere ike itinye aka ma jee ozi nime ọkpụkpọ okú ha ma soro ime ịhe n’ụzọ dị ọtụtụ.
Onye otú ọbụla nime kworụm anyị, nime otú anyị, ngalaba ụka, ma stek anyị nwere onyinye-chi ma akaraka nke nwere ike ịnye aka wulite alaeze Ya ugbua.
K’anyị kpọọ ndị otú anyị ndị nọ nkịtị ka ha jee ozi, bulie elu ma kuzie nkuzi. Tufuo echiche ochie nke ụfọdụ oge a n’amaghị ama mee, nke n’akpali nime ha, mmetụta ịnọ nanị ha, ma mee ọ dịka ha esonyeghi mọbụ ha agaghị ejenwu ozi.
A nam agba akaebe m na mgwụcha izu-ụka nke Ista nkea, maka Onye nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, ma maka olileanya ebigh ebi nke Ọ n’enye m ma onye nile kwere n’aha Ya. Ma A na m agba ama nkea n’obi umeala n’aha dị nsọ, ọbụna nke Jizọs Kraịst, amen.