Ọgbakọ Zuru ọha
Chineke Hụrụ Ụmụ Ya n’Anya
Ọgbakọ Zuru ọha Eprel 2021


Chineke Hụrụ Ụmụ Ya n’Anya

Ọ ga-amasị m ikwu ụzọ atọ kpọmkwem Nna anyị nke Eluigwe si egosi ịhụnaanya Ya maka anyị, ụmụ Ya.

Ụmụnne nwoke na ụmụnne nwanyị, a na m ańụrịkọta ọńụ mụ na ụnụ n’ime oziọma nke Jizọs Kraịst. E ji m ịhụnaanya sitere n’aka ndị otú dị n’ime Filipi kwụsịrị ike bịa ma na-asị, na nkwuchitere ha, Mabuhay!

N’ụtụtụ Ista nke a, a na m agba ama nke Kraịst dị ndụ, na O bilitere site na ọnwụ ma na ịhụnaanya Ya maka anyị na maka Nna nke Eluigwe dị ọcha ma dị ebighị ebi Taa, ọ masịrị m ikwu banyere ịhụnaanya nke Nna nke Eluigwe na Jizọs Kraịst nye ndị niile, nke na-apụta ihé site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst. “N’ihi na Chineke hụrụ nnọ ụwa n’anya, na ọ nyere Ọkpara ya a mụrụ nanị ya” (Jọn 3:16).

Mgbe onye mmụọ ozi jụrụ onye amụma Nifaị banyere ọmụmaihe ya nke Chineke, Nifaị zaghachịrị nanị, “A ma m na ọ hụrụ ụmụ ya n’anya” (lee 1 Nifaị 11:16-17).

Otu amaokwu sitere na Akwụkwọ nke Mọmọn: Ama Ọzọ nke Jizọs Kraịst kọwara n’ike n’ike banyere ịhụnaanya nke Onye Nzọpụta zuru oké: “Ma ndị ụwa, n’ihi ajọọ omume ha, ga-ekpe ya ikpe ka ọ bụrụ ihe efu; … ha ga-apịa ya ụtarị, … ha ga-akụ ya ihe, … ha ga-abụkwasa ya asụ n’ahụ, ma ọ ga-ekwe ka ọ dị otu a, n’ihi ịhụnaanya na obi ebere ya na ogologo ntachi obi ya n’ebe ụmụ nke mmadụ nọ” (1 Nifaị 19:9). Ịhụnaanya zuru ụwa nke Onye Nzọpụta bụ ike na-akpali ihe niile Ọ na-eme. Anyị matara na ọ bụ otu ịhụnaanya ahụ Nna anyị dị n’Eluigwe nwere maka anyị, n’ihi Onye Nzọpụta n’obi umeala kuziri na Ya na Nna “bụ otu” (lee Jọn 10:30; 17:20–23).

Kedụzị, otu anyị ga-esi kwụghachi ma gosi obi ekele anyị maka ịhụnaanya Ha zuru ụwa? Onye Nzọpụta jiri ọkpụkpọ okú nke a dị mfe, zuru ihe niile, kuziere anyị ịhe: “Ọ bụrụ na ụnụ hụrụ m n’anya, debe iwu nsọ m” (Jọn 14:15).

Onyeisi Dallin H. Oaks kuziri, “Ịhụnaanya nke Chineke zuru ụwa ma zuo oké ka a na-egosi n’ime ngọzi niile nke atụmatụ oziọma Ya, tinyere eziokwu na ngọzi Ya nke kachasị masị ka edebeere maka ndị n’erube isi na iwu Ya.”1

Ọ ga-amasị m ikwu ụzọ atọ kpọmkwem Nna anyị nke Eluigwe si egosi ịhụnaanya Ya maka anyị, ụmụ Ya.

Nke mbụ, Mmekọrịta n’etiti Chineke na Ezinaụlọ Na-egosi Ịhụnaanya Ya

Mmekọrịta anyị kachasị baa uru bụ nke anyị na Nna na Ọkpara na ezinaụlọ nke onwe anyị n’ihi ihe jikọtara anyị na ha dị ebighị ebi. Nnukwu atụmatụ nke ańụrị bụ ngọsịpụta dị ịtụnaanya nke ịhụnaanya nke Chineke maka anyị. Nihi anya anyị lekwasịrị n’atụmatụ nke Chineke, anyị n’eji obi anyị niile họrọ ịpịapụta aja na nkume dị n’ime anyị nke na akwado mmasị ọdịmma onwe-nanị ma jiri ntọala n’ewulite mmekọrịta dị ebighị ebi dochie ha. N’otu uche, nke a ka enwere ike ịkpọ “ogwugwu ọnụ nke ime mmụọ.” N’ogwugwu ọnụ nke ime mmụọ anyị, anyị garịrị na mbụ chọọ Chineke ma kpọkuo Ya (lee Jeremaya 29:12-13).

Ịchọ Ya na ikpọku Ya ga-ebido usoro ahụ ma wepụta ohere iwulite ma gbaa mmekọrịta anyị nke ebighị ebi ume. Ọ n’eme ka nghọta ime mmụọ anyị bawanye ma nyere anyị aka lekwasị anya n’ịgbanwe ihe anyị nwere ikike ijikwali kama n’ụjọ karịrị njikwata anyị. Ịmụ ihe banyere ndụ na ije ozi nke Onye nzọpụta anyị, Jizọs Kraịst, ga-enyere anyị aka hụta mkpa ndị ọzọ ndị a site n’anya nke ebighị ebi.

Mmegherị anya mgbe ụfọdụ nwere ike gbochie anyị site n’inwete ịhụnaanya nke Chineke n’ime mmekọrịta na ihe omume nke ezinaụlọ anyị. Otu onye nne, na-eche na gadget anọchịwo mmekọrịta ezinaụlọ ya, chepụtara otu aziza. Na tebulu nri abalị ma na oge ezinaụlọ ndị ọzọ, ọ na-etipụta nnọọ, “Ekwe ntị niile n’elu deck; ka anyị n’ahụ ihu na ihu.” Ọ na-ekwu na nke a bụ iwu ọhụrụ nke ezinaụlọ ma na ọ na-enye mmekọrịta ha mgbam ume dịka ezinaụlọ mgbe ha hụrụ onwe ha ihu na ihu n’ezie. Ugbua ha na-enwekọrịta ezigbo mkparịta ụka ọnụ nke Bịanụ, Soro M dị ka ezinaụlọ.

Nke abụọ, Ọ Na-egosi Ịhụnaanya Ya nye Ụmụ Ya site Na-ịkpọ Ndị Amụma

Ụwa anyị nke ugbua jupụtara na “agha nke mkpụrụ okwu na ọgba aghara nke ntụnye uche” (Josef Smith—Agụgụala 1:10). Pọl na-echetere anyị na “e nwere … ọtụtụ olu dị iche iche nime ụwa” (1 Ndị Kọrịnt 14:10 Olee nke n’ime olu niile gbaliri elu nke ọma ma baa uru karịa ọgba aghara ahụ? Ọ bụ olu nke ndị amụma, ndị ọhụ ụzọ, na ndị mkpughe nke Chineke.

E chetere m nke ọma, mgbe emechara m mgbawa ahụ na 2018 na mgbe m laghachịrị ọrụ, a nọ m n’ebe ọdọ ụgbọala dị n’isi ụlọ ọrụ Nzukọ nsọ. N’otu ntabi anya, a nụrụ m olu nke Onyeisi Russell M. Nelson na-akpọ, “Taniela, Taniela.” Agbakwuuru m ya, ma ọ jụrụ olee otu m si eme.

A sịrị m, “A na m agbake nke ọma Onyeisi Nelson.”

O nyere m ndụmọdụ na mmakụ. E nwetere m n’ezie ozi nlekọta onwe nke onye amụma nye “otu onye” ahụ.

Onyeisi Nelson emewo njem na ọtụtụ mba nke ụwa. N’ime obi m, ọ naghị eje ozi nlekọta nye puku kwuru puku nnọọ, kama ọ n’eje ozi nlekọta nye puku kwuru puku nke “otu otu.” Site ime otu a, ọ na-ekesa ịhụnaanya Chineke nwere maka ụmụ Ya niile.

Na-adịghị anya, okwu ndị nke Onyeisi Nelson abụrụruwo isi mgbam ume na mkpalite mmụọ nye ndị mmadụ Filipin. Dị ka mba niile n’ime ụwa, na 2020 ndị Filipins ka ọrịa ọjọọ COVID-19 metụtara nke ọjọọ, nakwa mgbawa ugwu, ala ọma jijiji, ajọọ ifufe dị ike, na uju mmiri na-emebi ihe.

Mana dị ka ogidi ihe na-amuke site n’urukpuru nke egwu, nke ịnọ nanị, na nke ịda mba ka okwu nke onye amụma bịara. Ha tinyekọtara ọkpụkpo okú zuru ụwa maka obubu ọnụ na ekpere na ndụmọdụ iji gaa n’ihu n’agbanyeghị ọrịa ọjọọ. Ọ kpọkuru anyị ime ebe obibi anyị ebe nsọ nke okwukwe nke onwe. Ọ kpọkuru Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ n’ebe niile ịnye ụmụ nke Chineke niile nkwanye ugwu ma kwe ka Chineke merie n’ime ndụ anyị.2

Ịhe ọzọ kpaliri obi anyị bụụrụ vidio nso nso a ebe Onyeisi Nelson gbara ama banyere ike nke obi ekele, na ekpere mmechi ya metụrụ gburugburu Filipi.3 Na mpaghara Leyte, e gosiri vidio ahụ n’otu mmemme nke okpukperechi dị iche iche bịakọtara ọnụ mee, otu onye ụkọchukwu kwupụtakwara ya nime okwuchukwu ya. Ndị Filipi, ha na ụwa dum, ka agọziri nnọọ inwete mmetụta nke ịhụnaanya nke Chineke site n’okwu nke ndị amụma Ya ahọpụtara.

Nke atọ, Ịdọ aka na ntị Nwere ike Bụrụ Ngosipụta nke Ịhụnaanya nke Chineke maka Ụmụ Ya

Mgbe ụfọdụ Chineke n’egosipụta ịhụnaanya Ya site n’ịdọ anyị aka na ntị. Ọ bụ otu ụzọ iji chetara anyị na Ya hụrụ anyị n’anya ma na Ọ maara ndị anyị bụ. Ngọzi nke udo Ya ekwere na nkwa dịịrị ndị niile ndị n’obisike na-aga ije n’ụzọ ọgbụgba ndụ ma dị njikere ịnata mgbazi olu.

Mgbe anyị matara ịdọ aka na ntị ahụ ma bụrụ ndị nnata dị njikere, ọ na-abụrụ mgbawa ahụ ime mmụọ. Onye ka mgbawa arụ na-amasị, ma asị? Kama banyere ndị ahụ nwere mkpa ya ma dị njikere ịnata ya, o nwere ike ịzọ ndụ. Onyenwe anyị na adọ onye Ọ hụrụ n’anya aka na ntị. Akwụkwọ nsọ na-agwa anyị otu a (lee Ndị Hibru 12:5-11; Helaman 12:3; Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile 1:27; 95:1). Ịdọ aka na ntị ahụ, ma ọbụ mgbawa arụ nke ime mmụọ, ga-ewete nnọọ mgbanwe kwesịrị ekwesị n’ime ndụ anyị. Anyị ga-amatazi, ụmụnne nwoke na nwanyị, na ọ na-emezi ma mee ọcha arịa anyị dị n’ime.

Josef Smith, ọnye amụma nke Mweghachi, ka a dọrọ aka na ntị. Mgbe Josef tufusiri ibe akwụkwọ 116 nke Akwụkwọ nke Mọmọn, Onyenwe anyị meziri ma gosikwa ịhụnaanya site n’ikwu: “I garaghị atụ egwu mmadụ karịa nke Chineke. … Ị kwesịrị nnọọ ijupụta n’okwukwe. … Lee, ị bụ Josef, ma a họpụtara gị. … Cheta, Chineke dị ebere; ya mere, chegharịa” (Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 3:7-10

Na 2016, dịka m na-eje ozi na mishọn dị n’ime Little Rock, Arkansas, a rịọrọ m Nwanne nwoke Cava iwegara nwanne m nwanyị nnukwu otu ngwugwu, onye biiri na agwaetiti dị n’ime Fiji. Nzaghachị ya abụghị ihe m tụrụ anya ya. “Onyeisi Wakolo,” ọ sụọ ude, “nwanne gị nwanyị nwụrụ ma eliwo ya ụbọchị 10 gara aga.” E meere m onwe m ebere ma ọbụladị wetụ nwa obere iwe na ezinaụlọ m enweghị mgbe ọ metụrụ ha ị me ka m mara.

Ụbọchị sotere ya, mgbe nwunye m naara akuziri ndị mgbasa oziọma, echiche nke a rịbatara n’ime mkpụrụ obi m: “Taniela, nhumihe ndị a niile bụ maka ọdịmma na mwulite nke onwe gị. Ị nọwo na-akuzi ma na-ekwupụta ama gị banyere Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst; ugbua bie ndụ otu ahụ.” E cheteere m na ańụrị na-adịrị nwoke ahụ onye Chineke na-agbazi; ya mere [anyị ekwesịghị] ileda anya … ịdọ aka na ntị nke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile” (Job 5:17). Ọ bụụrụ mgbawa arụ nke ime mmụọ nye m, ma ihe ndapụta ya bịara ozugbo.

Dịka m nọọrọ na-atule nhumihe ahụ, a kpọkuru m ịnye nchepụta mmechi m nye mkparịta ụka ahụ. N’etiti ihe ndị ọzọ, ekwupụtara m ihe mmụta nke akuziworo m nnọọ: otu, adọwo m nnọọ aka na ntị site n’aka Mmụọ Nsọ ma ọ masịrị m n’ihi na ọ bụ nanị m nụrụ ya; abụọ, n’ihi aja na nkwuchite nke Onye Nzọpụta, a gaghị m ahụta ihe ịma aka m dịka ọnwụnwa na mkpagbu kama dị ka nhumihe nke mmụta; na atọ, n’ihi ndụ Ya zuru oké na nke n’enweghị njọ agaghịkwa m ahụta emezighị emezi na enweghị ike m niile dị ka adịghị ike ma kama dị ka ohere mwulite m. Nhumihe nke a nyeere m aka ịmata na Chineke na-adọ anyị aka na ntị n’ihi na Ọ hụrụ anyị n’anya.

A na m emechi. Nna anyị nke Ebighị ebi anyị na Ọkpara Ya, Jizọs Kraịst, na-egosi ịhụnaanya Ha site n’ime ya a dị ire maka anyị inwe mmekọrịta ebighị ebi anyị na Ha na ndị otu ezinaụlọ anyị, site n’ịkpọ ndị amụma oge a ikuzi ma jee ozi nye anyị, na site n’ịdọ anyị aka na ntị iji nyere anyị aka mụọ ihe ma tolite. “Ekele dịrị Chineke maka onyinye n’enweghị atụ nke Ọkpara Ya dị nsọ,”4 Onyenwe anyị bilitere n’ọnwụ, ọbụna Kraịst ahụ dị ndụ. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen