Ọgbakọ Zuru ọha
Were Okwukwe Nabata Ọdịnihu
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2020


Jiri Okwukwe Nabata Ọdịniihu

Ọdịniihu ga adị ebube maka ndị dị na njikere ma nọgide na akwado ịbụ nkwa ọrụ n’aka nke Onye-nwe-anyị.

Nke a bụ mgbede na enweghị nchefu. Ụmụnne m nwanyị m hụrụ na anya, ọ bụ ihe ọńụ ị nọnyere unu. Unu nọ m na obi mgbe niile nime ọnwa ole na ole ndịa gara aga. Unu gbasiri ike nke ukwuu. Unu enweghị nanị ọnụ ọgụgụ kama ikike nke mụọ iji gbanwee ụwa. A hụla m ka unu na eme nke a na oge ọrịa mkpochapụ a.

Ụfọdụ unu na mberede hụrụ onwe unu ebe unu na achọ ihe oriri dị ụkọ ma-ọbụ ọrụ ọhụrụ. Ọtụtụ kuziiri ụmụntakịrị ihe ma lekọta ndị agbataobi. Ụfọdụ nabatara ndị mgbasa oziọma na oge n’ebe obibi ha karịa ka atụrụanya anya ha, ebe ndị ọzọ gbanwere ebe obibi ha ka ọbụrụ Ebe Ọzụzụ ndị Mgbasa oziọma. Unu ewerela teknụzụ jikọta ndị ezinaụlọ na ndị enyi, lekọta ndị chere na nanị ha nọ, ma mụọ Bianụ, Soro M unu na ndị ọzọ. Unu achọtala ụzọ ọhụrụ ndị eji eme ka Ụbọchị izu-ike dị mma. Ma unu emepụtala ihe mkpuchi niile maka nchekwa—nde kwuru nde n’ime ha!

Site n’obi ọmịko na ịhụnanya, obi m nọ na nwute maka ọtụtụ ndị inyom nọ na gburugburu ụwa ndị nke ndị ha hụrụ nanya nwụrụ. Anyị na ebere unu akwa. Ma anyị n’ekpere unu ekpere. Anyị na eto ma na ekpe kwa ekpere maka ndị nọ n’ọrụ ezughị ike ichekwa ahụ ike ndị ọzọ.

Unu bụ ndị inyom nta emewokwa ihe dị ukwuu. Na agbanyeghị na ndoro ndọrọ jupụtara na social media, ọtụtụ nime unu achọpụtala ụzọ iji kwado ndị ọzọ ma mee ka ihé nke Onye nzọpụta anyị gbasaa.

Ụmụnne m nwanyị, unu nile dị ike! Ike unu na okwukwe unu na eju m anya. Unu egosila na mgbe ihe siri ike, unu na aga nihu na-atụghị egwu. A hụrụ m unu nanya, ma a na m ekwe unu nkwa na Onyenwe anyị hụrụ unu n’anya ma na ahụ oke ọrụ unu na arụ. Unu emela! Ọzọ kwa, unu egosila na unu bụ olile anya nke Israel!

Unu bụ olile anya nile nke Onyeisi Gordon B. Hinckley nwere maka unu mgbe o wepụtara “Ezinaụlọ Ahụ: Ọkwa a mara nye Ụwa,” afọ 25 gara aga na Septemba 1995 nzukọ Otu Enyem-aka zuru-ọha.1 Ọ dị mkpa na ọ họọrọ iwepụta ọkwa nke a dị mkpa nye ụmụnne ndị nwanyị nke Nzukọ-nsọ ahụ. Site na ime nke a, Onyeisi Hinckley gosiri ike na enweghị ike ịgbanwe nke ndị inyom nime atụmatụ nke Onye-nwe-anyị.

Ugbua, a ga m achọ ịmata ihe unu mụtarala na afọ nke a. Unu abiakwutewo Onyenwe anyị nso, ma-ọbụ unu na enwe mmetụta na unu anọghị Ya nso? Olee ka ihe ndị mere na nso nso a ji mmetụta gị gbasara ọdịniihu?

Na ikwenye, Onyenwe anyị ekwuwo okwu banyere ụbọchị anyị n’ụzọ dị nro. Ọ dọrọ aka nti na n’ụbọchị anyị “obi ndị mmadụ [ga- ada mba]”2 ma ha ga eduhie obuna ndị ahọọrọ.3 Ọ gwara Onye amụma Josef Smit na “udo [ka] aga ewepụ site na etiti ụwa”4 ma ọdachi nile ga adakwasị ụmụ mmadụ.5

Agbanyeghị Onye-nwe-anyị wepụtakwara ọhụ nke gosiri ka ọgbọ nke a siri pụọ iche. Ọ kwalitere mmụọ nke Onye amụma Josef Smit ka okwupụta na “ọrụ nke … ụbọchị ikpeazụ ndị a, bụ nke dị oke ukwuu. … Ịdị ebube ha nyịrị nkọwa, ma ịma mma ya enweghị njedebe.“6

Ugbua, ịma mmanwere ike ọbụghị okwu unu ga achọ iji kọwa ọnwa ole na ole ndịa gara aga! Olee otu anyị ga esi mee maka ibu amụma n’anya udo na nkwupụta dị ebube gbasara ụbọchị anyị a? Onyenwe anyị gwara anyị otu esi eme ya site na mmasi obi ike dị mfe kama dị mgbagwoju anya: “Ọ bụrụ na unu dị na njikere unu agaghị atu egwu.“7

Nkwa nke a dị mma! Ọ bụ nke nwere ike ịgbanwe ụzọ anyị ji ahụ ọdịniihu anyị. A nụrụ m na nso nso a site na ọnụ otu nwanyị gbara ama dị omimi na ọrịa mkpochapụ ahụ, tinyere ala ọma jijiji nime Salt Lake Valley, nyeere ya aka ịmata na ya adịghị na njikere otu o chere na ya dị. Mgbe m jụrụ ma ọ nọ na ekwu maka ndokwa nri ya ma-ọbụ ịgba ama ya, ọ chịrị ọchị ma sị, “Ee!“

Ọ bụrụ na ịdị na njikere bụ ọtughe ụzọ anyị banyere iji okwukwe nabata ọgbọ nke a na ọdịanihu anyị, olee otu anyị nwere ike isi jikere n’ụzọ kachasị mma?

Nime iri kwuru iri afọ, ndị amụma nke Onye-nwe-anyị agbawo anyị ume ka anyị chekwaa nri, mmiri, na ego edokwara maka oge mkpa. Ọrịa mkpochapụ dị ugbu a emesịwo amamihe nke ndụmọdụ ahụ ike. A na m agwa unu ka unu mee ihe ndị ga enyere unu aka ịdị na njikere. Kama nkwadobe nke ime mmụọ na nke obi unu kacha dị m mkpa.

Banyere nke ahụ, anyị nwere ike ịmụta ọtụtụ ihe site naka Ọchị agha Moronaị. Dịka onye ndu nke ndị agha Nifaị, o zutere ndị agha ndị ọzọ ka ha ike, karịrị ha na-ọnụọgụgụ, ma jọkarịa ha na njọ. Ya mere, Moronaị kwadoro ndị ya na ụzọ atọ dị mkpa.

Nke mbụ, o nyere ha aka imepụta ebe nile ha ga-enwe nchekwa—“ebe nchekwa ha nile” ka ọ kpọrọ ha.8 Nke abụọ, ọ kwadoro “echiche ndị ahụ ikwesị ntụkwasị obi nye Onye-nwe-anyị.”9 Ma nke atọ, ọ kwụsịghị ịkwado ndị ya—na mmadụ ma-ọbụ na mụọ.10 Ka anyị tulee ụkpụrụ atọ ndị a.

Ụkpụrụ Nke Mbụ: Rụọ ebe nchekwa nile.

Moronaị wusiri obodo Nifaị niile ike jiri mgbidi aja, ụlọ ndị a rụsiri ike, na mgbidi nile.11 Mgbe ndị Leman bịara imegide ha, ha “ọ tụrụ ha nanya nke ukwuu, nihi amamihe nke ndị Nifaị na ịkwado ebe nchekwa ha nile.12

Otu aka ahụ, dịka nsogbu na abịakwute anyị, anyị kwesiri ikewapụta ebe nile anyị ga enwe nchekwa, ma na anụ ahụ ma n’ime mmụọ. Mgbe ebe obibi unu ghọrọ ebe mgbaba nke okwukwe nke onwe m—ebe Mụọ nsọ n’ebi—ebe obibi unu na abụ ebe mbụ a na-enye nchekwa.

Otu aka ahụ, stek nile nke Zaịọn bụ “ebe mgbaba site na ebili mmiri”13 maka a na edu ha site naka ndị ji ọtughe ụzọ nke ọkwa nchụ-aja ma jiri ikike ọkwa nchụ-aja arụ ọrụ. Dịka unu na-aganiihu eso ndụmọdụ nke ndị ahụ Onye-nwe-anyị nyere ikike ịdu unu, unu ga enwe nchekwa karịa.

Tempụl ahụ—ụlọ nke Onye-nwe-anyị—bụ ebe nchekwa na-enweghị atụ. Ebe ahụ, ka ana enye unu ụmụnne m nwanyị onyinye nsọ site na ike okwa nchụaja site na ọgbụgba-ndụ nile nke ọkwa nchụ-aja dị nsọ unu na-eme.14 Ebe ahụ, ka a na arachi ezinaụlọ unu maka mgbe ebigh-ebi. Ma na afọ nke a, mgbe egburu ohere ịga tempụl oke nkenke, onyinye dị nsọ unu enyewo unu ụzọ iji nweta ike nke Chineke mgbe niile dịka unu dobere ọgbụgba-ndụ unu na Ya.

Igbu ya nke nke, ebe ana enweta nchekwa bụ ebe ọbụla unu nwere ike nwee mmetụta nke Mụọ Nsọ ma nwe odudu Ya.15 Mgbe Mụọ Nsọ nọnyeere unu, unu nwere ike ịkuzi eziokwu, ọbụnaghị mgbe ọdabaghị na uche nke ndị nọ ugbu a. Ma unu nwere ike tụgharịa uche n’ezi ajụjụ ndị gbasara oziọma na-agbata nke mkpughe.

A na m akpọku unu, ezi ụmụnne m nwanyị, ka unu hiwe ebe obibi nke bụ ebe a na-enwe nchekwa. Ma a na m akpọgharị oku maka unu ịmụbawanye nghọta unu nke ike ọkwa nchụ-aja na nke ngọzi na ọgbụgba-ndụ nile nke tempụl. Inwe ebe nchekwa nke unu nwere ike ịgbaba ga enyere unu aka iji okwukwe nabata ọdịniihu.

Ụkpụrụ nke Abụọ: Kwado obi unu ịtukwasị Chineke obi.

Anyị ebidola ọrụ dị ukwuu ịgbati ndụ na ike nke Tempụl Salt Lake.

Foto, oyiyi
Ọrụrụ nkeTempụl Salt Lake

Ụfọdụ jụrụ maka mkpa ọdị ịrụ ụdị ọrụ ahụ. Ka osina dị, mgbe Salt Lake Valley nwere ala ọma jijiji dị 5.7 na mmalite afọ nke a, tempụl a kwesiri inye nsọpụrụ mara jijiji ruo ebe opi ahụ nọ na elu onye mụọ ozi Moronaị akpụrụ akpụ dara!16

Foto, oyiyi
Mmụọ ozi Moronaị na opi dara ada

Dịka ntụ ala nke Tempụl Salt Lake ga esirịrị ike ịnagide oke ihe ọjọọ eke nile, ntụ ala nke ime mmụọ anyị ga esirịrị ike. Ma, mgbe oyiri ala ọma jijiji nke ụwa kwara ndụ anyị aka, anyị nwere ike kwụrụ “kwụsie ike ma bụrụ akwa a kwụrụ” n’ihi okwukwe anyị.17

Onye-nwe-anyị kuziri anyị otu anyị ga esi mụbaa okwukwe anyị site na ịchọ “ọmụmụ ihe, ọbụna site n’ịmụ ihe na kwa site n’okwukwe.”18 Anyị na agbaa okwukwe anyị nime Jizọs Kraịst ume mgbe anyị na agbasi mbọ ike idobe iwu nsọ Ya nile ma “na echeta ya oge nile.“19 Ịga nihu, okwukwe anyị na amụba mgbe ọbụla anyị tinyere na ọrụ okwukwe anyị nime Ya. Nke ahụ bụ ihe mmụta ihe site na okwukwe pụtara.

Na ịma atụ, mgbe ọbụla anyị nwere okwukwe irube isi na iwu nile nke Chineke—ọbụnaghị mgbe uche nke mmadụ na akọ anyị ọnụ—ma-ọbụ mgbe ọbụla anyị gbanahụrụ mmemme ma-ọbụ echiche nile na akwado imebi-ọgbụgba-ndụ, anyị na etinye na ọrụ okwukwe anyị n’ọrụ, nke na-emecha mụbawanye okwukwe anyị.

Ịga nihu, ihe ole na ole na ebuli okwukwe elu karịa ka imikpu onwe anyị nime Akwụkwọ nke Mọmọn mgbe niile na-eme. Onweghị akwụkwọ ọzọ na eji ụdịrị ike na nghọta dị otu a agba ama banyere Jizọs Kraịst. Ndị amụma ya, dịka Onye-nwe-anyị ji kwalite mụọ ha, hụrụ ụbọchị anyị ma họrọ ozizi na eziokwu nile ga enyere anyị aka karịchaa. Akwụkwọ nke Mọmọn bụ odudu ịpụ ndụ anyị nke ụbọchị ikpeazụ a.

Na ezi ya, nchekwa anyị kachasị na abịa dịka anyị na abịa nso-nso na-ebe Nna anyị nke Elu-igwe na Jisọs Kraịst nọ! Ndụ na enweghị Chineke bụ ndụ jupụtara na ụjọ. Ndụ nwere Chineke bụ ndụ jupụtara na udo. Nke a bụ n’ihi ngọzi nile nke ime mmụọ na adịrị ndị nwere okwukwe. Ịnata mkpughe nke onwe bụ otu nime ngọzi ndị ahụ kachasị ukwuu.

Onye-nwe-anyị ekwewo nkwa na ọ bụrụ na anyị arịọ, anyị nwere ike ịnata “mkpughe na elu mkpughe,”20 A na m ekwe nkwa na dịka unu na ewuli ike ịnata mkpughe, Onye-nwe-anyị ga eji nduzi bara ụba maka ndụ unu gọzie unu ma nye unu onyinye nke Mmụọ nsọ na- enweghị njedebe.

Ụkpụrụ nke Atọ: Akwụsịkwala ime Nkwadobe.

Ọbụnaghị mgbe ihe nile gara nke ọma, Ọchịagha Moronaị nọgidere na ịkwado ndị ya. Ọ kwụsịghị ma ọlị. O hapụghị ịdị na njikere.

Onye iro akwụsị ịgba mgba. Ya mere, anyị enweghị ike kwụsị ime nkwado! Ka anyị kacha nwee ndabere onwe—nke anụ ahụ, nke obi, ma na nke ime mmụọ—anyị ga-aka adị na nkwado imeri atụmatụ ọjọọ niile nke Ekwensu.

Ụmụnne m nwanyị, unu nwere ike iwu ebe nchekwa maka onwe unu na ndị unu hụrụ nanya. Ịga nihu, unu nwere onyinye nsọ na enyere unu aka iwulite okwukwe nime ndị ọzọ na ụzọ ndị siri ike.21 Ma unu akwụsịkwala. Unu gosipụtara nke a ọzọ na afọ a.

Biko, gaanụ niihu! Ịnọ na njikere unu na ichekwa ebe obibi unu na itinye okwukwe nime obi nke ndị unu hụrụ nanya ga eweta ihe nrịta maka ọgbọ nile na abịa.

Ụmụnne m nwanyị m hụrụ na anya, anyị nwere ọtụtụ ihe a ga elekwasi anya! Onye-nwe-anyị dobere unu ebe a ugbu a maka Ọ mara na unu nwere ike ịgabiga mgbakwoju anya nke ngwụcha ụbọchị ikpeazụ ndị a. Ọ mara na unu ga amụta ịdị mma nke ọrụ Ya ma nwee mmasị na inye aka weta ya na mmezu.

Anaghị m asi na ụbọchị ndị nọ na ihu ga adị mfe, kama a na m ekwe unu nkwa na ọdịniihu ga adị ebube maka ndị dị na njikere ma nọgide na akwado ịbụ nkwa ọrụ n’aka nke Onye-nwe-anyị.

Ụmụnne m nwanyị, ka anyị hara nanị idi oge nke a. Ka anyị were okwukwe nabata ọdịnihu! Oge nsogbu bụ ohere ọma nye anyị iji too nime mụọ. Ọbụ oge mgbe ike anyị nwere ike gaa mie emi karịa mgbe ihe dị mma.

A na m ekwe nkwa na dịka anyị na emepụta ebe aga enwe nchekwa, kwado obi anyị ịtụkwasị Chineke obi, aa akwụsịghị ime nkwado, Chineke ga agọzi anyị. Ọ ga “anapụta anyị; ee, nụzọ dị ukwuu nke mere na ọ [ga] enye anyị udo na mkpụrụ obi anyị, ma [ga] enye kwa anyị nnukwu okwukwe, ma …mee kwa ka anyị [nwere ike] nwee olile-anya maka nnapụta anyị n’ime ya.“22

Dịka unu na akwado iji okwukwe nabata ọdịnihu, nkwa nile ndị a ga abụ nke unu! A na m agba ama, na ngosi nke ịhụnanya makaunu na obi si ike m nimeunu, naha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.

Bipụta