Ọgbakọ Zuru ọha
Onyinye Kachasị ukwuu nke Ọkpara ahụ
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2020


Onyinye Kachasị ukwuu nke Ọkpara ahụ

Site na Jizọs Kraịst, anyị nwere ike gbanarịa mgbu niile nke kwesịịrị omume njehie anyị niile ma merie mgbu ndị n’ekwesịghị nke ọghọm niile nke ndụ.

Mgbe m naara agụ Akwụkwọ nke Mọmọn maka otu ọmụmụ ihe Bịa, Soro M n’ọkọchị gara aga, okwu Alma juru m anya na mgbe ọ bịara mata nke ọma banyere njọ ya, “enweghị ihe ọbụla kachasị ukwuu ma dịkachaa njọ dịka mgbu [ya] niile dịịrị.”1 A na m ekwupụta, okwu nke mgbu ahụ kachasị ukwuu nwetere uche n’otu aka n’ihi agha m lụrụ n’izu ụka ahụ nke okwute akụrụ dị milimita-asaa. Enwebeghị mgbe otu mmadụ hụtara ụdị “nnukwu ihe” mgbe ụdị ihe “ntakịrị dị mfe” dị otua “bịara na mmezu.”2

Asụsụ nke Alma pụtakwara ihé nye m n’ihi mkpụrụ okwu ahụ kachasị ukwuu, na ntụgharị asụsụ Bekee nke Akwụkwọ nke Mọmọn, n’ezie kọwara ihe niile nke mara oke mma ma ọbụ nke dị ebube n’enweghị atụ. N’ịmaatụ, Joseph Smith chetara na onye mmụọ ozi Moronaị yinyere uwe nwụda nke “kachasị ukwuu n’ịdị ọcha,” “ịdị ọcha karịrị ihe ọbụla nke ụwa [ọ] hụbere.”3 Ma kachasị ukwuu nwere ike kọwapụta ihe dị oke ike ọbụna ihe ndị jogburu onwe ha. Ya mere Alma na ọkọwa okwu ndị ọzọ kọwara mgbu kachasị ukwuu dịka “ntara ahụhụ,” “kugburu akụgbu,” na “sogburu” ruo na “ogo kachasị elu.”4

Ngosipụta nke Alma na-akpali iche echiche maka otu eziokwu na oge ga-eru mgbe, anyị ga-enweterịrị mgbu nile nke njọ nile anyị mere. Ikpe ziri ezi na-achọ ya ma Chineke N’onwe Ya agaghị agbanwe ya.5 Mgbe Alma chetere njọ ya “niile”—kacha nke ndị ahụ mebiworo okwukwe ndị ọzọ—mgbu ya bịara karịa nke ukwuu, ma uche nke iguzoro n’ihu Chineke jupụtara ya “n’ujọ n’enweghị nkọwa.” Ọ gụrụ ya “ifu efu ma na mmụọ ma na mmadụ.”6

Kosiladị, Alma kwuru na ihe niile bidoro ịgbanwe oge “uche ya dakwasịrị n’ọbịbịa nke otu Jizọs Kraịst eburu na amụma … ịgba aja mgbaghara mmehie nke njọ niile nke ụwa,” ma o “bere akwa n’ime obi [ya]: O Jizọs, gị Ọkpara nke Chineke, meere m ebere.” N’otu echiche ahụ na otu arịrịọ ahụ, Alma wee jupụta n’ọńụ “kachasị ukwuu” “dịkwa ka mgbu [ya] siri dị.”7

Anyị agaghị echefu ma ọlị na nzube nke nchegharị bụ iwere ụfọdụ nhujuanya ma gbanwe ya ị bụ ọmarịcha ihe. Ekele dịrị “ịdị mma nke n’adịghị egbu oge” Ya8 na oge ahụ anyị nabịakwute Kraịst—n’egosipụta okwukwe na Ya na ezi mgbanwe nke obi—ibu arụ nke njọ anyị n’ebido ịpụ n’ahụ anyị gawa na nke Ya. Nkea ga adị ire n’ihi Ya onye n’enweghị njọ tara ahụhụ nke mgbu n’enweghị ọgwụgwụ na nkọwa”9 nke njọ ọbụla n’ime ụwa nke okike Ya, maka okike Ya niile—ntaram ahụhụ dị ukwuu, ọbara agbapụtasịa site n’obere ohere niile nke ahụ Ya. Site nhumihe si n’aka ya na nke onwe Onye Nzọpụta na-adọ anyị aka na ntị, nakwụkwọ nsọ nke ugbua, na anyị amaghị otu “kachasị ukwuu” “ntaram ahụhụ” anyị ga-adị mọbụrụ ma anyị echegharịghị. Mana site na obi sara mbara n’enweghị atụ Ọ nakwa akọwazi na “Mụ, Chineke, atawo ahụhụ ndịa niile maka mmadụ niile, ka ha wee nwee ike ghara ịta ahụhụ mọbụrụ na ha ga-echegharị”10—nchegharị nke nekwe anyị “detụ ọnụ” “nnukwu ọńụ” Alma detụrụ ọnụ.11 Nanị maka ozizi nkea, “E guzooro m n’oke ịtụnanya.”12 Ma, n’ụzọ ijuanya, Kraịst n’enye nnọọ karịa.

Mgbe ụfọdụ mgbu kachasị ukwuu na-abịa n’abụghị site na njọ kama site na njehie amaghị ama, omume nke ndị ọzọ, ma ọbụ ike karịrị ike anyị. N’oge ndịa niile, i nwere ike kwaa akwa dị ka Ọbụ abụ ezi omume:

“Obi m nọ n’oke ihe mgbu n’ime m: ma ụjọ nke ọnwụ adakwasiwo m.

“… Ụjọ ejidewo m.

“… A sị nnọọ na m nwere nku dị ka nduru! M ga-efepụ gaa biri n’ebe ọzọ.”13

Sayensị ahụ ike, ndụmọdụ ọkacha mara, ma ọbụ mmezi iwu nwere ike belata ụdị ntaram ahụhụ a. Mana mara na, onyinye niile dị mma—tinyekọta ndịa—si naka Onye Nzọpụta abịa.14 N’agbanyeghị ihe ndị kpatara mgbu na obi mgbawa anyị kachasị njọ, ụzọ kachasị elu nke enyem aka bụ otu ụzọ ahụ: Jizọs Kraịst. Nanị Ya ji ike zuru ezu na mmanụ ọgwụgwọ iji metazie njehie niile, mezie ihe niile n’ezighị ezi, melata etozughị oké niile, mezie ọnya niile, ma webata ngọzi niile gburu oge ịbịa. Dịka ndị aka ebe niile nke ochie, a na m agba ama na “anyị nwere nabụghị nnukwu onye nchụaja na-apụghị imere anyị ebere nadịghị ike anyị,”15 kama Onye Mgbapụta ịhụnanya onye na-agbadata site n’oche eze Ya dị n’elu ma gaa n’ihu “na-ata ahụhụ na mkpagbu niile na ọnụnwa niile nke ụdị ọbụla … , ka ya wee mara … otu esi enyere ndị ya aka.”16

Maka onye ọbụla taa nwere ihe mgbu dịkasị ike ma ọbụ pụrụ iche mere ya adị gị ka enweghị onye ga-aghọta ha, i nwere ike iji okwu. Enwere ike agaghị enwe onye otu ezi na ụlọ, enyi, ma ọbụ onye ndu ọkwa nchụaja—otu ọbụla esi enwe mmetụta ọsọ ọsọ ma dị mma—onye maara kpọmkwem ihe ị na-ahụta ma ọbụ nwere ezi nkọwa iji nyere gị aka nwete ọgwụgwọ. Mana mara nkea: enwere Otu onye mazuru nhumihe gị, onye “dị ike karịa ụwa niile”17 na onye dị “njikere ime ebe ọ dị ukwuu karịa ihe niile ị na-arịọ ma ọbụ na-eche.”18 Usoro ahụ ga-emezu n’ụzọ nke Ya na n’oge nke Ya, mana Kraịst guzooro na njikere mgbe niile ịgwọ akụkụ niile nke mgbu gị.

Dị ka i n’ekwe Ya ime otu ahụ, ị ga-amata na ahụhụ gị abụghị n’efu. N’ikwu banyere ọtụtụ dike kachasị nke Baịbụlụ na iru uju ha, Onye Ozi Pọl kwuru na “Chineke … weteere ha ụfọdụ ihe ndị dị mma nye ha n’ime ntaram ahụhụ ha, nihi ewezuga ntaram ahụhụ ha agaghị etozu oké.”19 Ị hụrụ, ezi ọdịdị nke Chineke na ebumnuche nke ndụ anyị n’elu ụwa bụ ańụrị,20 mana anyị agaghị abụ ndị tozuru oké nke ọńụ dị nsọ ma enweghị nhumihe ndị na anwale anyị, mgbe ụfọdụ ruo anyị n’ụmị. Pọl kwuru na ọbụna Onye Nzọpụta n’onwe Ya ka emere “itozuo oké [ma ọbụ izu oké] site na ntaram ahụhụ.”21 Ya mere chee nche megide ntaka nke setan na ọ bụrụ na ị bụ ezigbo mmadụ, ị ga-ezere ụdị mnwale ndị ahụ.

I kwesịkwara ịgọnarị okwu asị ahụ gbasara na ahụhụ gị nile n’otu ụzọ n’egosi na ị nọghị n’etiti okirikiri ndị ahọrọ ahọ nke Chineke, onye n’esi na ọnọdụ ngọzi nkea fe na nkea. Kama, were onwe gị dịka otu Jọn Onye Mkpughe n’ezie si hụta gị na mkpughe dị ebube ya nke ụbọchị ikpeazụ a. N’ihi na Jọn hụrụ “nnukwu igwé mmadụ nke n’enweghị onye ga-agụtali, nke mba niile, na abụrụ niile, na ndị mmadụ, na asụsụ niile [ndị] guzooro n’isi oche eze, na nihu Nwa atụrụ ahụ, eyiwere uwe ọcha, … [onye] jiri olu ike bee akwa, na-asị, Nzọpụta nye Chineke anyị.”22

Mgbe ajụrụ ajụjụ: “Gịnị bụ ihe ndịa nke ahaziri n’uwe ọcha? ma ebe ka ha si bịa?” Jọn natara azịza ahụ, “Ndịa bụ ndị si na oke ihe mkpagbu ahụ pụta, ma ha asawo kwa uwe nwụda ha, ma meekwa ka ọ na-acha ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ.”23

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwanyị, ịta ahụhụ n’ezi omume n’enyere gị aka itozu oké, karịa iwepụ gị pụọ site na, ndị Chineke họọrọ. Ma ọ na-eme ka nkwa ha bụrụ nkwa gị. Dịka Jọn kwupụtara, “agụrụ agaghị agụ gị ọzọ, m’ọbụ akpịrị akpọ gị nkụ; m’ọbụ anyanwụ achagbuo [gị], m’ọbụ ekpomo-ọkụ ọbụla. “N’ihi Nwa-atụrụ ahụ, onye nke nọ n’etiti oche-eze ahụ ga-enye [gị] nri, ma ọ ga-eduba [gị] n’ime mmiri niile nke ndụ: ma Chineke ga-ehicha anya-mmiri niile site na anya [gị].”24

“Ma agaghị enwe ọnwụ ọbụla ọzọ, ma ọbụ iru uju, ma ọbụ ibe akwa, ma ọbụ inwe mgbu ọbụla.”25

A na m agba aka ebe nye unu na site n’ịma mma mgbe na mgbe nke Jizọs Kraịst na Aja mgbaghara mmehie Ya, anyị nwere ike gbanarịa ahụhụ niile kwesịịrị ekwesị nke omume ndahie anyị niile ma merie ahụhụ niile n’ekwesịghị ekwesị nke ọghọm nke ndụ. N’okpuru ntụzi aka Ya, akaraka gị dị nsọ ga abụ otu ihe ebube n’enweghị atụ na ọńụ n’enweghị nkọwa—ọńụ dị ukwuu na nke pụrụ iche nye gị, ntụ gị onwe gị ga-abụrụzi mma “karịa ihe ọbụla nke ụwa a.”26 Na i nwere ike detụ ọnụ ańụrị nke ugbua ọnụ ma jupụta na ya mgbe niile, a na m akpọku unu ime ihe Alma mere: kwe ka obi gị jigide ike na onyinye kachasị ukwuu nke Ọkpara ahụ dịka ekpughere site n’oziọma Ya n’ime, Nzukọ nsọ Ya dị eziokwu dị ndụ. Site na aha nke Jizọs Kraịst, amen

Bipụta