Ọgbakọ Zuru ọha
Ụmụnne ndị nwanyị n’ime Zayọn.
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2020


Ụmụnne ndị nwanyị n’ime Zayọn.

Unu ga-abụ nnukwu ike nime ọrụ nke mkpokọta Izrel ma n’ime mwulite nke ndị mmadụ nke Zayọn.

Ụmụnne ndị nwanyị m hụrụ n’anya, ọ bụụrụ m ngọzị ikwu okwu n’omarịcha oge nke akụkọ-ala nke ụwa a. Ụbọchị ọbụla, anyị n’abịaru nso ruo na mmemme ebube ahụ mgbe Ọnye nzọpụta, Jizọs Kraịst, ga-abịa ọzọ n’ụwa. Anyị maara ụfọdụ ịhe egwu nke ga-eme tupu ọbịbịa Ya, kama obi anyị n’ejupụta n’ọñụ ma n’obisike n’ihi anyị makwaara nkwa ebube niile nke a ga-emezu tupu Ọ bịaghachi.

Dịka ụmụ ndị nwanyị ahụrụ n’anya nke Nna nke Igwe, ma dịka ụmụ ndị nwanyị nke Zayọn Jizọs Kraịst n’ime alaeze Ya,1 ị na-arụ ọrụ dị mkpa maka oge ebube nke nọ n’ihu. Anyị maara na Onye nzọpụta ga-abịakwuru ndị mmadụ ndị akpọkọtaworo ma kwado ibi ndụ dịka ndị mmadụ ahụ si bie ndụ n’ime nnukwu obodo nke Inọk. Ndị mmadụ ahụ n’ebe ahụ dị n’otu n’ime okwukwe ha n’ime Jizọs Kraịst ma ha adịwo ụcha kpam kpam nke mere ejiri kpọrọ ha jee eligwe.

Nkea bụ nkọwa nke Zayọn kpughere gbasara maka ịhe g’eme ndị mmadụ nke Ịnọk ma ịhe g’eme n’ime ọgbọ ikpeazụ nke uju oge nkea:

“Na n’ụbọchị ahụ ga-abia nke ụwa ga-ezu ike, mana tutu ụbọchị ahụ elu-igwe niile ga-adị ojii, na akwa mgbochi nke ọchịchịrị ga-ekpuchi ụwa, na elu-igwe niile ga-ama jijiji, na kwa ụwa; na oke mkpagbu ga-adị n’etiti ụmụ nke mmadụ, mana ndị nke m ka m ga-echekwa;

“Na ezi-omume ka m ga-ezidata site n’ime elu-igwe; na ezi-okwu ka m ga-ezipụ gaa site n’ime ụwa,ịgba ama banyere Onye nke m Mụrụ Nanị ya; mbilite n’ọnwụ ya site na ndị nwụrụ-anwụ; e, na kwa mbilite n’ọnwụ nke mmadụ niile; na ezi-omume na ezi-okwu ka m ga-eme ka ha zachaa ụwa dịka e ji ide mmiri, ikpokọta ndị nke m a họpụtara site n’akụkụ anọ niile nke ụwa, gaa n’ebe ahụ nke m ga-akwadobe, otu nnukwu Obodo dị Nsọ, ka ndị m wee kee ihe-okike n’úkwù ha niile, na na-elepụ anya maka oge nke m ga-abịa;n’ihi n’ebe ahụka ụlọ ofufe m ga-adị, a ga-akpọ kwa ya Zayọn, Jerusalem Ọhụrụ.

“Na Onye-nwe wee sị Inọk: Mgbe ahụ ka gị onwe gị na nnukwu obodo gị dum ga-ezute ha ebe ahụ, anyị ga-anabata kwa ha n’obi anyị; ha ga-ahụ kwa anyị, na anyị ga-adakwasị n’olu ha niile, ha ga-adakwasị kwa n’olu anyị niile, na anyị ga-esutu ọnụ onye ọbụla na ibe ya;

“Na n’ebe ahụ ka ebe obibi m ga-adị, na ọ ga-abụ Zayọn, nke ga-abịa site n’ime ihe niile e kere-eke nke m meworo, na maka n’oghere nke otu puku afọ ka ụwa ga-ezu-ike.”2

Unu, ụmụnne ndị nwanyị, ndị ụmụ ndị nwanyị unu, ndị ụmụ-ụmụ ndị nwanyị unu, ma ndị nwanyị ndị unu zuworo ga-esonye ndịa ahụ wulitere obodo nke ụmụ mmadụ ahụ, ndị ga-esonye n’ime njikọ eziomume, ha na Onye nzọpụta. Unu ga-abụ nnukwu ike nime ọrụ nke mkpokọta Izrel ma n’ime mwulite nke ndị mmadụ nke Zayọn, ndị ga-ebi n’udo nime Jerusalem nke Ọhụrụ.

Zayọn esiwo site n’aka ndị amụma Ya, kweere unu nkwa nkea. Na mbido afọ nke Otú Enyemaka, Onye amụma Josef Smit gwara ndị ụmụnne nwanyị, “Ọ bụrụ na unu bie ndụ ruru ogo unu, ndị mmụọ ozi aghaghị ị bụụrụ ndị enyemaka unu.3

Ịhe niile unu kwesịrị ị bụ nọ nime unu, ma a na-akwado unu maka ha.

Onyeisi Gordon B.Hincley kwuru:

“Unu ụmụnne ndị nwanyi … anọghị ọnọdụ nke abụọ nime atụmatụ nke Nna maka añụrị ebighiebi na ọnọdụ mma Ọ nwere maka ụmụ Ya. N’ezie unu dị oke mkpa nime atụmatụ nke ahụ.

“Ma unu esoghi ya, atụmatụ ahụ agaghị enwe isi. “Ma unu esoghi ya, atụmatụ niile ahụ ga-enwe ọtụtụ mgbọchi. …

“Ọnye ọbụla nime unu bụ nwa nke nwanyị nke Chineke, onye enyere onyinye dị nsọ nihi ọmụmụ ya.”4

Onye amụma anyị ugbua bụ Onyeisi Russell M. Nelson, akọwawo ụdị ọrụ unu ga-arụ maka nkwado nke ọbịbịa nke Onye nzọpụta:

“Ọ gaghị ekwe omume ị matacha mmetụta nke … ndị iyom nwere, ọbụghị nanị n’ezinụlọ niile, makwa na Nzukọ nsọ nke Zayọn, dịka ndị nwunye, ndị nne, ndị nne nke ukwu; dịka ụmụnne ndị nwanyị, na ndị daa-nne; dịka ndị nkuzi na ndị ndu; nkekanke,dịka ndị ọmụmatụ na ndị nchekwa nke okwukwe siri ike.

“Nkea abụrụwo eziokwu n’ime ogbo niile nke ozi ọma kemgbe ụbọchị niile nke Adam na Iv. N’agbanyeghi ndị iyom nke ọgbọ nkea dị iche site na ndị iyom nke ọgbọ ndị ọzọ n’ihi ọgbọ nkea dịkwa iche ya na ndị ọzọ. Ịdị iche nkea n’ewete ụfọdụ uru nakwa oké n’ọrụ.”5

Ọgbọ nkea dị iche n’ihi Ọnyenwe anyị g’eduru anyị k’anyị dịrị na nkwado ịdịka obodo-ukwu nke ịnọk ahụ. Ọ kọwawo site n’ọnụ ndị ozi na ndị amụma Ya, otu mgbanwe ahụ ga-eme ka a dịrị ka ndị mmadụ nke Zayọn ga-esi adị.

Okenye Bruce R. McConkie kuziri:

“Ụbọchị [Ịnọk] bụ oge ajọọ omume na ajọọ ịhe, ụbọchị ọchịchịrị na oke nnupụ isi, ụbọchị agha na mbibi, ụbọchị n’akpọbata ịsachapụ ụwa site na mmiri.

“N’agbanyeghi nkea, Ịnọk kwesịrị ike n’okwukwe. Ọ ‘hụrụ Zayọn,’ ma kwurịtara okwu ya na Onyenwe, ‘ihu na ihu’ dịka otu onye na onye ọzọ na-ekwurịta. (Mozis 7:4.) Zayọn zipụrụ ya ka ọ ga kwupụta nchegharị nye ụwa, wee nye ya iwu-nsọ ka ọ ga na-eme ‘baptizim n’aha nke Nna, na nke Ọkpara nke jupụtara n’amara na ezi-okwu, na Mụọ Nsọ, nke na-agba ama banyere Nna na Ọkpara ahụ.’ (Mozịs7:11.) Ịnọk gbara ndụ ma kpọkọọ igwé mmadụ ndị kwere ekwe n’ezie, ha dum mesịrị bụrụ ndị kwesịrị ike n’ọkwukwe kpakpam nke mere ‘Zayọn bịara binyere ndị ya, ma ha wee biri n’ezi-omume.’ ma e wee si n’elu gọzie ha. ‘Ma Zayọn wee kpọọ ndị ya Zayọn, n’ihi na ha nwere otu obị na otu uche, ma biri ndụ n’ime ezi-omume; ma e nweghị ogbenye n’etiti ha.’ (Mosis 7:18.) …

“Mgbe Zayọn kpọsiworo ndị Ya ndị Zayọn, akwụkwọ nsọ kwuru na Ịnọk ‘wuru otu nnukwu obodo nke akpọrọ Nnukwu Obodo nke Ịdị-nsọ, ọbụna Zayọn;’ na o wee ruo na ‘eweliworo ya elu baa n’ime elu-igwe’ ebe ‘Chineke natara baa n’obi nke ya onwe ya; na site mgbe ahụ ka okwu ahụ̀ jiri pụọ gawa na-asị Zayọn Agbafuwo.’ (Mozis 7:19, 21, 69.) …

“Zayọn nkea eweliworo elu ba n’ime eligwe ga-aloghachi … mgbe Onye nweanyị ga-akpọghachi Zayọn ọzọ, ma ndị niile bi na ya ga-esonye ndị nke Jerusalem ọhụrụ ahụ, nke a ga-ehiwezi n’oge ahụ.”6

Ọ bụrụ na nkea mere na mbụ bụ mbido akụkọ, n’oge Onye nzọpụta ga-abịa, ndị umu ya ndị nwanyị ndị dobeworo ọgbụgbandụ ha na Chineke gbara nke ọma ga-akarị ọkara ọnụogụgụ ndị ahụ kwadoro onwe ha ịnabata Ya mgbe Ọ ga-abịa. Nagbanyeghi otu ọnụ ọgụgụ ya ha, ịhe niile itiiri iji wulite ịdị n’otu n’etiti ndị mmadụ akwadoro maka Zayọn ga-akarị okara ya.

A ga m agwa unu ịhe mere m jiri kwere na ọ g’adị otua. Akwụkwọ nke Mọmọn kọrọ akụkọ maka ndị mmadụ ndị ọzọ bụkwa ndị Zayọn. Ị chetara na ọ bụ mgbe Onye nzọpụta biliri n’ọnwụ kụziworo ha, hụkwa ha nanya ma gọzie ha ka ekwuru: “na e nweghị ndọrọ-ndọrọ nʼala ahụ, n’ihi ịhụ-n’anya nke Chineke nke bi nʼime obi niile nke ndị ahụ.”7

Ahụmihe nkem akụziwo m na ụmụ ndị nwanyị nke Nna nke Igwe nwere onyinye eji egbo ndọrọ-ndọrọ, ma nke eji ewulite eziomume nihi ịhụnanya ha nwere n’ebe chineke nọ, ma nihi ịhụnanya Chineke nke ha na-etinye nime ndị ha na-ejere ozi.

A hụrụ m nkea n’afọ ntorobịa m, n’oge ahụ ngalaba ụka-nta anyị n’agbakọ nime ụlọ anyị mgbem bụ nwata. Mụ na nwanne m nwoke bụ nanị ndị ji ọkwa nchụ aja nke Erọn, nna m bụ nanị ya ji ọkwa nchụ aja nke Melkizedek. Onye isi Otú Enyemaka bụ onye ọhụrụ agbanwere, onye ije ozi ya nime Nzukọ nsọ ya n’ewe di ya iwe. Ndị otú anyị bụ ndị nwanne nwanyị kara nka, ndị n’eweghi onye ji ọkwa nchụ aja nime ebe obibi ha. A hụrụ m otu nne m na ndị nwanne nwanyị ahụ si ebulikọta ma n’elekota onwe anya ha esepụghị aka. A mataziwom taa na enyerem ohere ịhụtụ otu mbido Zayọnu si adị.

Nkuzị enyere m banyere mmetụta ndị iyom siri ike n’okwukwe, gakwara nihu nime ngalaba ụka-nta nke Nzukọ nsọ dị n’obodo Albuquerque, New Mexico. A hụrụ m ka nwunye onyeisi ngalaba ụka-nta ahụ, nwunye onyeisi district ahụ, na onyeisi Otú Enyemaka si anabata onye ọbịa ọbụla na onye agbanwere ọhụrụ. N’ụbọchị Sọnde m hapụrụ Albuquerque, mgbe afọ abụọ m n’ekiri mmetụta nke ndị nwanne nwanyị ahụ gasịrị , ekepụtara stek mbụ n’ebe ahụ. Ugbua Ọnye nweanyị edebewo otu tempụl n’ebe ahu.

Ebe ọzọ m jere bụ Boston, ebe m jere ozi nime otú ndiisi nke district, anyị n’ahụ maka ọtụtụ ngalaba ụka nta di nime steeti abụọ. Enwere ọtụtụ ndọrọ-ndọrọ nke ndị n’egbo ya mgbe ọbụla bụ ndị iyom nwere ịhụnanya ma dịrịkwa mgbaghara, ndị nyere aka mee obi niile siri ike dị nro. N’ụbọchị Sọnde m hapụrụ Albuquerque, onye otú nke Ndiisi nke Mbụ bịara hazie stek mbụ n’obodo Massachusetts. Enwekwara otu tempụl n’ebe ahụ ugbua, nke dị nso n’ebe onye isi district ahụ bibụụrụ na mbụ. Akpọghachiri ya azụ mgbe ọ dara mba n’ije ụka, emesịa a kpọ ya ka ọ jee ozi dịka onyeisi stek, emesịa ọ jeekwa ozi dịka onyeisi mishọn, nkea mere nihi mmetụta nke nwunye ya dị ike n’okwukwe na ịhụnanya.

Ụmụnne ndị nwanyị, ọ bụụrụ unu ngọzị ị bụ ụmụ ndị nwanyị nke Chineke ma enyere unu onyinye pụrụ iche nihi nkea. Unu batara njem nke ndụ anụ arụ nkea jiri ikike nke mmụọ iji zulite ndị ọzọ, ma iji bulie ha elu ruo ịhụnanya ma ịdị ọcha nke ga-eme ka ha tozuo oké ibikọta ọnụ nime obodo nke Zayọn ahụ. Ọ bụghị ihe mberede na Otú enyemaka, otú mbụ nke Nzukọ nsọ nkea, bụkwanụ otú arọpụtara maka ụmụ ndị nwanyị nke Nna nke Igwe, ka motto ha bụ “Afọ ọma anaghị Ada ada.”

Afọ-ọma bụ ihụnanya nke Jizọs Kraịst na enweghi ntụkpọ. Ọ bụ okwukwe enwere na Ya, tinyekwara ihe ndapụta niile nke Aja mgbaghara mmehie Ya, ga-eme ka unu, ndị unu hụrụ n’anya ma ndị unu n’ejere ozi tozuo oké irite onyinye ukwu ahụ nke g’eme ka-ebiri nime obodo nke Zayọn ahụ a na-ale anya ya kemgbe ụwa ma nke ekwere na nkwa. Ebe ahụ unu ga-abụ ụmụnne ndị nwanyị n’ime Zaion, ebe Ọnye nweanyị ga-ahụ unu n’anya ma hụkwa ndị ahụ unu gọziri n’anya.

A na m agba ama na unu bụ ndị alaeze nke Onye nweanyị n’’ụwa nkea. Unu bụ ụmụ ndị nwanyị nke Nna nke Igwe dị ịhụnanya, onye zipụrụ unu bịa nụwa nkea ma nyekwa unu ọtụtụ onyinye nke unu kwere nkwa na unu ga-eji ya gọzie ndị ọzọ. A na m ekwe unu nkwa na Onye nwe ga-eduru unu n’aka site n’ike nke Mụọ Nsọ. Ọ g’eje ije n’ihu unu dịka unu na-enyere Ya aka ị kwado ndị Ya ị bụrụ ndị Zayọn ekwere na nkwa. A na m agba-ama n’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.

Bipụta