Ọgbakọ Zuru ọha
Mba nile, Agbụrụ nile, na Asụsụ nile
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2020


Mba nile, Agbụrụ nile, na Asụsụ nile

Anyị nwere-ike ịbụ, na-ụzọ nke anyị, akụkụ nke mmezu amụma na nkwa Ya nile—akụkụ nke ozi-ọma na-agọzi ụwa.

Ụmụnne m nwoke na ụmụnne m nwanyị m hụrụ n’anya, A arụrụ m ọrụ na nso nso a nrachi na tempụl, soro ntuzi aka niile gbasara COVID-19. Ndị soro di na nwunye ahụ, ndị lọtarala ọrụ nke mgbasa ozi-ọma, bụ ndị nne na nna ha na ụmụ nne ha niile. Nke ahụ adịghị mfe. Nwụnye ahụ bụ nwa nke itolu nime ụmụ iri. Ụmụnne ya itolu nọrọọ ọdụ otu ha siri tọọ, site na nke okenye ruo nke nta, na-enye ohere ka ọ dị.

Ezi na ụlọ ahụ na-agbalị ịbụ ezi ndị agbata obi ebe ọbụla ha birila. Ka osina dị, otu obodo anabataghị ha— maka na, nne nke nwụnye sịrị na, ezi na ụlọ ha bụrịị ndị otu Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị-Nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a.

Ezinaụlọ ahụ gbalịrị ihe nile inwe ndị enyi na ụlọ-akwụkwọ, nenye aka, na ime ka anabata ha, kama onweghị isi. Ezi na ụlọ ahụ kpere-ekpere ọtụtụ oge ka obi ha jụrụ.

Otu abalị, ezi na ụlọ ahụ nwere mmetụta na azala ekpere ha, nụzọ na-atụghị anya. Ụlọ ha gbara ọkụ ma redaruo ala. Kama enwere ịhe ọzọ mere. Ọkụ ahụ melatara obi ndị agbataobi ha.

Ndị agbataobi ha nile na ndị ụlọ-akwụkwọ nọ ebe ahụ chịkọtara uwe, akpụkpọ-ụkwụ, na ihe ndị ọzọ dị mkpa na ezinaụlọ ahụ, ndị ihe nile funahụrụ. Obi-ọma mepere ụzọ inwe nghọta. Ọ bụghị ụzọ ezi na ụlọ ahụ tụrụ-anya ma-ọbụ chee ịnata ọzịza nye ekpere ha. Ka osina dị, ha nwere obi ekele maka ihe ha mụtara site na nhụmihe ike ahụ na ọziza ekpere nke metụtara n’obi n’ụzọ na-atụghị anya.

N’ezie, maka ndị nwere obi okwukwe na anya eji ahụ ụzọ, obi ebere nke Onyenwe anyị na-apụta ihe n’oge ihe aka-mgba nile dị na ndụ. I were okwukwe zute aka-mgba nile ma ịchụ-aja na eweta ngọzi nile nke eluigwe. Nime ndụ a, ihe nwere ike funahụ anyị ma-ọbụ anyị echere obere oge maka ihe ụfọdụ, mana emesịa anyị ga achọta ihe kachasị mkpa.1 Nke ahụ bụ nkwa Ya.2

Ọkwa nke ugboro abụọ n’afọ anyị mara na afọ 2020 jiri nkwa siri-ike etinyere bido na “Chineke hụrụ ụmụ Ya n’anya n’ime mba niile nke ụwa.”3 Nye onye ọbụla nime anyị nime mba niile, agbụrụ niile, asụsụ ọbụla, na ndị mmadụ,4 Chineke na-ekwe nkwa, na-agba-ndụ ma kpọọ anyị ịbịa keta oke ọńụ na ịdịmma Ya na uju.

Ịhụnanya nke Chineke maka mmadụ nile bụ ihe ekwesịrị ike nime akwụkwọ-nsọ nile.5 Ịhụnanya ahụ gụnyekọtara ọgbụgba-ndụ nke Ebreham, ịkpọkọta ụmụ Ya gbasasịrị,6 na atụmatụ nke ọńụ Ya nime ndụ anyị.

Nime ezi-na-ụlọ nwere okwukwe enweghị ndị ọbia, enweghị ndị bịara-abịa,7 enweghị ọgaranya na ogbenye,8 enweghị “ndị mbịarambịa.” Dịka “ndị so keta oke ha na ndị-nsọ,“9 a kpọrọkuru anyị ịgbanwe ụwa ka ọka mma, site nime puta, otu onye, otu ezi na ụlọ, otu agbataobi na otu oge.

Nke a na-eme mgbe anyị biri ndụ ma gbasaa ozi-ọma. Na mmalite nke ọgbọ nke a, Onye-amụma Josef natara amụma pụrụ iche na Nna nke Eluigwe chọrọ ka onye ọbụla ebe ọbụla chọpụta ịhụnanya nke Chineke ma hụ ike Ya ito-eto ma gbanwee.

Foto, oyiyi
Ebe obibi ezinaụlọ Smith

A natara amụma ahụ ebe a, na ebe-obibi nke ezi na ụlọ Smit na Palmyra, New York.10

Foto, oyiyi
Okenye na Nwanne nwanyị Gong nime ebe obibi Smith

Arụchara na afọ 1998, ebe-obibi Smit ka arụgharịrị na ntọala ọkpụtọrọkpụ ya. Ogo ụlọ nrahụ ụra ya nọ n’ụlọ elu nke abụọ ahụ nọchikwara otu ohere ahụ dị 18- site na 30- site na 10 foot (5.5 site na 9 site na 3m) ebe Moronaị, dịka onye ozi nwere ebube si naka Chineke, bịakwutere Josef nta na mgbede nke Septemba 21, 1823.11

I chetara ihe Onye-amụma Josef kọwara:

“[Moronaị] sịrị … Chineke nwere ọrụ m ga-arụ; na-kwa aha m ka a ga-anụ maka ihe ọma na ihe ọjọọ na-etiti mba nile, agbụrụ nile na asụsụ nile…

“[Moronaị] sịrị na e nwere akwụkwọ nke edebere, … na uju nke Ozi ọma na-adịgide mgbe nile dị nime ya.”12

Ebe a ka anyị kwụsịtụrụ. Anyị na-akpọ isi ala enye Chineke Nna nke Ebighi-ebi na Okpara Ya, Jizọs Kraist, ọbụghị Onye-amụma Josef ma-ọbụ nwoke ma ọbụ nwanyị ọbụla dị ndụ.

Mana tụlee otu amụma nile Chineke na-enye ndị odibo Ya si na-emezu.13 Ụfọdụ na emezu ọsịsọ, ụfọdụ mgbe emechara, kama ha nile na emezu.14 Dịka anyị na-ege ntị nye mụọ nke amụma nke Onyenwe anyị, anyị nwere-ike ịbụ, na-ụzọ nke anyị, akụkụ nke mmezu nke amụma na nkwa Ya nile—akụkụ nke ozi-ọma ahụ na-agọzi ụwa.

Na afọ 1823, Josef bụrụụ nwanta nwoke gbara afọ 17 a na-amaghị-ama bi na ọnụmara zoro-ezo nime mba nweere onwe ya ọhụrụ. Asị na ọbụghị eziokwu, olee ka ọ ga esi chee ikwu na ya ga-abụ ngwa-ọrụ n’ọrụ Chineke ma tụgharịa asụsụ site na onyinye na ike nke Chineke akwụkwọ-nsọ dị nsọ a ga-amata ebe ọbụla?

N’ihị ya, maka na ọbụ eziokwu, mụ na gị nwere-ike gbaa aka-ebe na amụma ahụ na emezu ọbụnaghị dịka a na-akpọ anyị oku inye-aka ka o mezuo.

Ụmụnne m nwoke na ụmụnne m nwanyị, n’ofe ụwa nile, onye ọbụla nime anyị nọ nime ọgbakọ zuru-ọha nke Ọktoba 2020 so n’etiti mba nile, agbụrụ nile,asụsụ nile e kwuru maka ya.

Taa, ndị otu Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a bi na mba na ala dị 196, nwere stek Nzuko nsọ dị 3,446 dị na 90 n’ime ha.15 Anyị nọchiri anya ma ogologo ala ma isi ebe ike ya nọ.

Na afọ 1823, onye gara eche na nime afọ 2020 a ga-enwe ala atọ nke ọbụla nime ha nwere ndị otu Nzukọ-nsọ karịrị otu nde—United States, Mexico, na Brazil?

Ma-ọbụ mba 23 nke ọbụla n’ime ha nwere ihe karịrị 100,000 ndị otu Nzukọ-nsọ— atọ nime North America, iri na anọ nime Central na South America, otu nime Europe, anọ nime Asia na otu nime Africa?16

Onyeisi Russell M. Nelson na-akpọ Akwụkwọ nke Mọmọn “ọrụebube dị ịtụnanya.”17 Ndị aka-ebe ya gbara ama, “Ka mba nile, agbụrụ nile, asụsụ nile, na mmadụ nile mara.”18 Taa, enwere ọgbakọ zuru-ọha na asụsụ dị 100. Onyeisi Nelson agbawo ama nke Jizọs Kraịst na ozi-ọma Ya eweghachitere na mba 138 ma na-aga nihu.

Ejiri kọpị akwụkwọ 5000 nke ebipụtara na afọ 1830 mbipụta nkea mbụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn, ebipụtala nde 192 kọpị niile ma ọbụ mpaghara Akwụkwọ nke Mọmọn na asụsụ dị 112. Ntụgharị asụsụ nke Akwụkwọ nke Mọmọn nọkwa ebe nile na digital. Ntụgharị asụsụ Akwụkwọ nke Mọmọn na aganiihu ugbua gụnyere asụsụ ụwa dị 23 nke ihe karịrị nde mmadụ 50 na-asụ, achịkọta ya ọnụ olu ndị nke ruru 4.1 njeri mmadụ.19

Site na ụzọ dị nta ma dị mfe—nke a kpọrọ onye ọbụla n’ime anyị ịrụ ọrụ—ihe dị ukwuu na-abịa na mmezu.

Na ịmatụ, na ọgbakọ stek e mere na Monroe, Utah, nwere ọnụ ọgụgụ dị 2,200, a jụrụ m mmadụ ole gaarala ọrụ mgbasa ozi-ọma. Ọfọrọ ihe nta aka niile ala elu. Nime afọ ole na ole dị nso, site na otu stek ahụ, ndị mgbasa ozi-ọma dị 564 agala ọrụ mgbasa ozi-ọma nime stetị 50 dị na U.S. na ala 53—na kọntinent ọbụla ewepụ Antarctica.

Ikwu okwu gbasara Antarctica, ọbụnaghị nime Ushuala, nọ na ndịda kpọnyere ọnụ na Argentina, A hụrụ m ebe amụma mezuru dịka ndị mgbasa ozi-ọma anyị gbasara ozi-ọma nke Jizọs Kraịst eweghachitere nime ebe akpọrọ “nsotu niile nke ụwa.”20

Foto, oyiyi
Ihe esere ese site naka vọlum nile Ndị-nsọ

Ihe esere-ese na mkpuchi vọlum akwụkwọ anọ anyị nke Ndị-nsọ21 gosipụtara ihe zuru ụwa uru nke ibi ndụ ozi-ọma na abịakwuta ndị-nsọ nwere okwukwe ebe nile. Akụkọala Nzukọ-nsọ anyị dabeere na ndụ ọgbụgba ama ebiri na njem ozi-ọma nke onye otu ọbụla, tinyere Mary Whitmer, nwanne nwanyị nwere okwukwe Moronaị gosiri epekele nile nke Akwụkwọ nke Mọmọn.22

Foto, oyiyi
Magazin ọhụrụ niile nke Nzukọ

Ka ọ na apụta nime Jenụwarị 2021, magazin ọhụrụ atọ nke Nzukọ-nsọ anyị zuru ụwa— Friend, For the Strength of Youth, na Liahona— na akpọ mmadụ nile ịbata ma nwe nhụmihe na ịgbaa ama nime ogbe nke okwukwe anyị zuru ụwa.23

Ụmụnne m nwoke na ụmụnne m nwanyị, dịka anyị na amụba okwukwe anyị nime Nna nke Elu-igwe na Jizọs Kraịst, nata ngọzi nile ahụ nọ nime ibi ndụ nke eziokwu nke ozi-ọma eweghachitere na ọgbụgba-ndụ nile dị nsọ, ma mụọ, chee echiche, ma gbasa ozi banyere Mweghachi naga nihu, anyị na arụ ọrụ imezu ibu-amụma.

Anyị na agbanwe onwe anyị na ụwa na ụzọ ozi-ọma na agọzi ndụ ebe ọbụla.

Otu nwanne nwanyị si Afrịka kwuru, “Ọrụ ọkwa nchụaja nke di m na eme ya ịnwe ndidi na obiọma karịa. Ma a na m abụkwa ezigbo nwụnye na nne karịa.”

Onye ọkacha mara ịzụ ahịa nụwa nime Central America kwuru na tupu ọ chọta ozi-ọma nke Chineke eweghachitere, ọ nara ebi ndụ na enweghị isi na okporo ụzọ. Ugbua ya na ezinaụlọ ya achọtala ejiri-mara, nzube, na ikike.

Nwata nwoke nime South America na azụ ọkụkọ ma na ere akwa ha iji nye aka zụta windo maka ụlọ nke ezi na ụlọ ya na-arụ. Ọ na ebu ụzọ kwụọ otu ụzọ na ụzọ iri ya. Ọ ga ahụ ka windo nile nke elu-igwe si emepe.

Nime Akụkụ Anọ nile, otu ogbe nime southwestern United States, ezinaụlọ Ndị nwe America kụrụ ọhịa rose ka otoo nime ọzara, ọdịmárá nke okwukwe ozi-ọma na ndabere onwe.

Onye nyara ndụ nke agha dị egwu, nwanne nwoke nọ nime Southeast Asia ka obi daramba na ụwa enweghị isi. Ọ chọtara olile-anya nime nrọ ebe nwa klas ya mbụ jiri efere oriri-nsọ ma gbaa ama nke emume nsọ nzọpụta na a Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst.

Nna nke Elu-igwe na akpọku anyị ebe ọbụla inwe mmetụta nke ịhụnanya Ya, ịmụta ma too site na ịgụ akwụkwọ, ịrụ ọrụ na-enye ugwu, ije ozi ndabere onwe, na usoro nile nke ịdị mma na ọńụ anyị na ahụ nime Nzukọ-nsọ Ya eweghachitere.

Dịka anyị na atụkwasị Chineke obi, mgbe ụfọdụ site na arịrịọ nime oge ihe siiri anyị ike, anyị na amụta na Ọ mara anyị ma hụkwa anyị nanya karịa ka anyị mara ma-ọbụ hụ onwe anyị nanya.

Nke a bụ ihe mere anyị ji chọọ enyem aka nke Chineke ikewapụta ikpe-ziri ezi na-anọgide, iha notu, akpaghị oke, na udo nime ebe obibi na ogbe anyị nile. Omume, ọnọdụ na ihe onwunwe anyị kachasị mma, dị omimi, na abịa mgbe anyị nwere mmetụta ịhụnanya mgbapụta nke Chineke, chọọ amara na ọrụ ebube nile site na Aja mgbaghara mmehie nke Ọkpara Ya, ma hiwe mmekọrịta ndị na anọgide site na ọgbụgba-ndụ nile dị nsọ.

Ịdị mma na amamihe nke okpukpe chi bụ ihe achọrọ nime ụwa nke taa jọgburu onwe ya na njọ. Olee ụzọ ọzọ anyị nwere-ike iji kpọlite, kwalite mụọ, ma wulie mụọ nke mmadụ?24

Foto, oyiyi
Ịkụ osisi nime Haiti
Foto, oyiyi
Ịkụ osisi nime Haiti
Foto, oyiyi
Ịkụ osisi nime Haiti

Ịkụ osisi nime Haiti bụ nanị otu nime narị kwuru narị ọmụma atụ nke ndị mmadụ ịbịakọta ọnụ ime ihe ọma. Ogbe ahụ, tinyere ndị otu Nzukọ nsọ anyị dị 1,800, ndị tụrụ osisi ahụ, bịakọrọ ọnụ ịkụ osisi ruru 25,000.25 Arụmarụ ọtụtụ afọ nke ịkụgharị osisi emeela ka akụọ osisi karịrị 121,000. Ọ na akwado ịkụ iri puku kwuru iri puku karịa.

Mbọ nke a ejikọtara ọnụ wetara ndo, jide aja, belata iju mmiri na abịa na-ọdịniihu. O mere agbataobi nile a maa mma, rụlite ogbe, tajụọ akpịrị, ma zụọ mkpụrụ-obi. Ọbụrụ na ịjụọ ndị Haiti onye ga aghọrọ mkpụrụ si na osisi nile ndị a, ha na asị, “Onye ọbụla agụụ ji.”

Ọnụ ọgụgụ ndị nọ na ụwa ruru pecentị iri asatọ bụ ndị okpukpe chi.26 Ogbe nile nwere ndị okpukpe chi na aza oku mgbe ọbụla enwere ihe ọjọ mere, dịka mgbe achọrọ nri, nchekwa, ọmụmụ ihe, ịgụ akwụkwọ, na ọzụzụ inweta ọrụ. Na ofe ụwa nile, ndị otu anyị,ndị enyi, na Nzukọ-nsọ na enye ogbe nile nkwado nye ndị gbatara ọsọ ndụ na ala ha ma nye ha mmiri, ịdị ọcha, ihe eji ebugharị ndị esighị ike, ngwa ịhụ ụzọ—otu onye, otu ọnụmara, otu osisi na otu oge.27 Ebe ọbụla, anyị na achọ ịbụ ndị ezi nne na nna na ndị ezi mmadụ, ịrụ ọrụ nime ebe agbataobi anyị nile na otu anyị nile, tinyere site na Enyem aka nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a.28

Chineke nyere anyị ohere ịhọrọ—na ịza ajụjụ omume. Onyenwe anyị kwupụtara, “Mụ, Onye-nwe-anyị bụ Chineke, na eme ka unu nwere onwe unu, ya mere [unu] nwere onwe unu n’ezie.”29 Nime ịma ọkwa “ntọhapụ nye ndị adọkpụrụ na agha,”30 Onye-nwe-anyị kwere nkwa na Aja mgbaghara mmehie Ya na ụzọ nke ozi-ọma nwere-ike kubie agbụ nke ime mmụọ na nke anụ ahụ .31 Na obi ebere, inwere onwe nke mgbapụta a rutekwara ndị nwụrụ anwụ.

Afọ ole na ole gara-aga, onye nchụaja nime Central America gwara m na ya na amụ maka “emume baptism maka ndị nwụrụ-anwụ “nke Ndị-Nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ.” “O dị ka okwesịrị ekwesị,” onye nchụaja ahụ kwuru, “na Chineke ga enye onye ọbụla ohere ịnata baptism, agbanyeghị mgbe ma-ọbụ ebe ha biiri, ewezuga ụmụntakịrị, ndị ’ndụ nime Kraịst.’32 Ọnye ozi Pọl,“onye nchụ-aja hụtara, “ikwu banyere ndị nwụrụ-anwụ na eche ime baptism na mbilite na ọnwụ.”33 Emume-nsọ nnọchi anya nke tempụl kwere mba nile nkwa, agbụrụ nile, na asụsụ nile na onweghị onye kwesịrị “ịbụ ohu nke ọnwụ, nke ala-mụọ, ma-ọbụ ili ahụ.”33

Dịka anyị na achọta Chineke, mgbe ụfọdụ ọzịza atụghị anya ya nye ekpere na ewepụ anyị na ezi, webata anyị na ogbe, chụfuo ọchịchịrị site na mkpụrụ-obi anyị, ma duo anyị ịchọta ebe mgbaba nke mụọ ma soro na ịdị mma nke ọgbụgba-ndụ Ya nile na ịhụnanya na anọgide.

Ihe dị ukwuu ọtụtụ mgbe na ebido nke nta, kama ọrụ ebube nile nke Chineke na apụta ihe kwa ụbọchị. Obi jupụtara anyị na ekele maka onyinye dị nsọ nke Mụọ Nsọ, Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst, na ozizi Ya ekpughere, emume-nsọ nile,na ọgbụgba-ndụ nile ahụrụ nime Nzukọ-nsọ Ya eweghachiri, akpọrọ aha Ya.

Ka anyị were ọńụ nabata ịkpọ oku nke Chineke ịnata na inye aka mezuo nkwa na ngọzi niile e buru na amụma nime mba nile, agbụrụ nile, na asụsụ nile, A na m ekpe ekpere, naha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.

Bipụta