Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2020 Nzukọ nke ụtụtụ Satọde Nzukọ nke ehihe Satọde Nzukọ nke ehihe Satọde Henry B. EyringNkwado nke Ndi Ji Ikike Zuruọha, Ndi Iri Asaa Mpaghara, na Ndi Ọrụ ZuruọhaOnye-isi Eyring ga-agụpụta Ndi Ji Ikike Zuru-ọha, Ndi Mpaghara Iri-Asaa, na Ndi-isi Enyem-aka Zuruọha maka ntuli-aka nkwado unu. D. Todd ChristoffersonObodo ndị Na-adịgideOkenye Christofferson n’akụzi na eziokwu nke Chineke n’egosi ụzọ eji enwete ọñụ nke onwe, ma ịdị mma nke obodo ugbua ma nwete udo na ọñụ n’ụwa n’abịa-abịa. Steven J. LundỊnwe ọńụ nime KraịstNwanne-nwoke Lund na-akuzi na ụmụaka na eto eto nwere ike chọta ọńụ nime Kraịst site na inyere ndị ọzọ aka na ụzọ ọgbụgba-ndụ ahụ site na ihe omume nke ụmụntakịrị na ndị ntorobia. Gerrit W. GongMba nile, Agbụrụ nile, na Asụsụ nileOkenye Gong kọwara ka nkwa nile nke Chineke maka ịgọzi mba nile si na emezu, na ụzọ ndị dị nta ma dị mfe, na gburugbru ụwa. W. Christopher WaddellE nwererịị AchịchaBishọp Waddell na-akuzi na anyị kwesịrị ịchọ nkwalite nke mmụọ ma dabere na ụkpụrụ niile nke ozi ọma iji nwe ndabere nke onwe. Matthew S. HollandOnyinye Kachasị ukwuu nke Ọkpara ahụOkenye Holland na-akọwa otu ntaram ahụhụ na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst nwere ike isi tụgharịa nhụjuanya nke njọ na nsogbu yọọ ọńụ. William K. JacksonOmenala nke KraịstOkenye Jackson na-akuzi na anyị niile nwere ike ịńụrị ọńụ na omenaala nke ụwa anyị n’otu n’otu mgbe anyị bụkwa otu n’ime ozi ọma nke Jizọs Kraist. Dieter F. UchtdorfChineke Ga Eme Ihe Echeghị echeOkenye Uchtdorf na-akụzi na dịka anyị na-anagide nnwale nile, ịhunanya Chineke ma ngọzi nile nke oziọma ga-enyere anyị aka ị ga n’ihu ma ịgbago elu ruo ebe anyị atụghi anya. General Women’s Session General Women’s Session Sharon EubankSite na Inwekọrịta Mmetụta Anyị Enweta Ike si n’aka ChinekeNwanne nwanyị Eubank na-akụziri anyị otu anyị ga-esi akacha nweta udo n’etiti onye na ibe ya ma si otu ahụ nweta ike karịrị akarị site n’aka Chineke. Becky CravenDebe Mgbanwe ahụNwanne nwanyị Craven na-akuzi na site na Jizọs Kraịst, anyị nwere ike mee mgbanwe n’adịgide ma dịrịzie karịa dịka Ya. VidioVidio: Ìhè Ahụ Na-amụke na ỌchịchịrịVidio dị nro ahaziri site n’ọtụtụ nke dị iche iche nke ndị inyom gburugburu ụwa na-ekere òkè n’ụdị ije ozi, ịma aka, na njikọ dị iche iche. Cristina B. FrancoIke Ọgwụgwọ nke Jizọs KraịstNwanne nwanyị Franco na-akuziri anyị na site na Aja mgbaghara mmehie nke Jizọs Kraịst, anyị niile nwere ike nwee mmezi ma nweta ọgwụgwọ. Henry B. EyringỤmụnne ndị nwanyị n’ime Zayọn.Onye Isi Eyring na-akuzi na ndị nwanyị nwere ezigbo ọrụ nime ọrụ nke mkpokọta Izrel ma n’ime mwulite nke ndị mmadụ nke Zayọn, ndị ga-ebi n’udo nime Jerusalem nke Ọhụrụ. Dallin H. OaksNọrọ N’ezigbo Ọn̄ụOnyeisi Oaks na-akuzi na n’ihi ozi ọma anyị nwere ike ịnọrọ n’ezigbo ọńụ, ọbụna n’etiti aka mgba na ihe isi ike niile. Russell M. NelsonWere Okwukwe Nabata ỌdịnihuOnyeisi Nelson na akuzi na anyị kwesịrị ịdị na njikere na anụ ahụ, ime mụọ, na mkpụrụ obi maka ọdịnihu. Nzukọ nke ụtụtụ Sụnde Nzukọ nke ụtụtụ Sụnde M. Russell BallardYa mere Mụrụnụ anya, ma Kpee ekpere Mgbe niileOkenye Ballard n’akụziri anyị maka ịkpe ekpere maka nchekwa na udo nke ala anyị, ezinụlọ anyị ma ndị ndu ndị Nzukọ-nsọ. Lisa L. HarknessUdo, Dere DuuNwanne nwanyị Harkness na-akuzi na dị ka Onye Nzọpụta mere oke ifufe mmiri nke Oke osimiri Galili e dere jụụ, Ọ pụrụ inyere anyị aka nweta mgbam ume na udo n’etiti mnwale niile. Ulisses SoaresChọọ Kraịst n’Echiche NiileOkenye Soares na-akuzi na idebe echiche na ọchịchọ anyị niile n’ụzọ dị mma n’enyere anyị aka gbanarịa ọnwụnwa. Carlos A. GodoyE kwere m na Ndị Mmụọ oziOkenye Godoy na akuzi na Onye-nwe-anyị mara mkpa anyị nile ma Ọ ga ezite ndị mmụọ ozi ga enyere anyị aka. Neil L. AndersenAnyị Na-ekwu maka KraịstOkenye Andersen na-agba anyị ume kanyị mụọ maka Ọnye nzọpụta karịa ma kwuo maka Ya n’ebe obibi, n’ebe nzukọ-nsọ, na soshal midia, ma nime mkparịta ụka ụbọchị anyị nile. Russell M. NelsonKa Chineke MerieOnyeisi Nelson na-akọwa Izrel gbara ndụ ụbọchị ikpeazụ a dịka ndị ahụ n’ekwe ka Chineke merie n’ime ndụ ha. Ọ na-akpọku anyị ime Chineke bụrụ mmetụta kachasị mkpa nke ndụ anyị. Nzukọ nke ehihe Sọnde