Ọgbakọ Zuru ọha
Udo, Dere Duu
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2020


Udo, Dere Duu

Onye Nzọpụta na-akuziri anyị otu anyị si enweta udo ma daa jụụ ọbụla mgbe ifufe na-efe nke ọjọọ na gburugburu anyị ma nnukwu ebili mmiri a na-eyi egwu imikpu olileanya anyị.

Mgbe ụmụaka anyị dị ntakịrị, ezi na ụlọ anyị nọrọ mkpụrụ ụbọchị ole na ole n’ebe ọmarịcha ọdọ mmiri. Otu ehihe, ụfọdụ ụmụaka yiri uwe nchekwa ndụ tupu ha esi n’ala ụlọ nke ụgbọ mmiri wụọ wụba n’ime mmiri. Nwa anyị nwanyị nke kachasị nta nọọrọ n’ele anya ma obi akaghị ya, ọ wee kpachara anya na-ele ụmụnne ya. Mgbe ọ masiworo onwe ya obi ike, o jiri otu aka pịchie imi ya wee wụọ. Ozugbo ahụ ka o sere n’elu mmiri ma nwere olu ụjọ wee tie, “Nyerenụ m aka! Nyerenụ m aka!”

Ugbu a, e nweghị ihe egwu ọbụla ọ nọ n’ime ya; uwe nchekwa ndụ ya nọ n’ọrụ ya, ma ọ nọ na-ese n’elu mmiri na nchekwa. Anyị gaara e setịpụ aka ma dọbata ya n’ala ụlọ nke ụgbọ mmiri ahụ na-egbughị oge. Mana n’echiche nke ya, ọ chọrọ enyem aka. Ikekwe ọ gara abụ ajụmoyi nke mmiri ahụ ma ọbụ nhụmiihe ọhụụ nke a. Ka osila dị, o rigotere azụ bata n’ala ụlọ nke ụgbọ mmiri ahụ, ebe anyị jiri akwa nhicha-ahụ dị akọrọ sachie ya ahụ ma too ya maka a tụghị egwu ya.

Na-agbanyeghị ma anyị akawo nka ma ọbụ nwata, enwewo oge ọtụtụ n’ime anyị n’oge nnukwu nsogbu, kwuru okwu dị ka “Nyerenụ m aka!” “Zọpụta m!” ma ọbụ “Biko, za m ekpere m!”

Ụdịrị ihe ahụ mere ndị na-eso ụzọ Jizọs Kraịst n’oge ozi Ya mgbe Ọ nọ ndụ. N’akwụkwọ Mak anyị gụtara na Jizọs “malitere ọzọ ikuzi ihe na-akụkụ oke osimiri: ma ọtụtụ igwé mmadụ zukọtara n’ebe ọ nọ.”1 Igwé ndị mmadụ ahụ bawanyere nke mere na Jizọs “banyere n’ụgbọ”2 wee malite ịgwa ha okwu site n’ala ụlọ nke ụgbọ mmiri. O jiri ihe atụ dị iche iche kụziere ha ihe ụbọchị ahụ niile ka ha nọdụrụ ala n’ikpere mmiri ahụ.

“Ma … mgbe o ruru na [mgbede],” Ọ sịrị ndị na-eso ụzọ Ya, “Bịanụ ka anyị gafee na-akụkụ nke ọzọ. Mgbe ha zipụchara igwé mmadụ ahụ,”3 ha si n’ebe ikpere mmiri ahụ pụọ wee gafewa Oke osimiri nke Galili. Mgbe ọ chọtara ohere n’azụ ụgbọ mmiri ahụ, Jizọs dinara ala ma daba n’ụra ọsịsọ. Mgbe na-adịghị anya “nnukwu oke ikuku mmiri malitere, ebili mmiri amalite ịnye ụgbọ mmiri ahụ nsogbu, ruo na [ọfọdụrụ obere ka] ka ụgbọ ahụ ju”4 na mmiri.

Ọtụtụ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs bụrịị ndị maara nke ha riri n’ọrụ ịkụ azụ ma mara nke ọma ka esi ejide ụgbọ mmiri n’oge oke ikuku mmiri. Ha bụ ndị Ọ tụkwasịrị obi—na-ezie, ndị na-eso ụzọ—Ọ hụrụ naanya. Ha a hapụwo ọrụ ha, ihe ndị ha nwere mmasị na ya, nakwa ezi na ụlọ maka i soro Jizọs. Okwukwe ha nwere n’ebe Ọ nọ pụtara ihé site na ha onwe ha ị nọ n’ụgbọ mmiri ahụ. Ma ugbu a ụgbọ ha nọ n’etiti oke ebili mmiri ruo na imikpu na mmiri.

Anyị amaghị oge o were ha ịgba mbọ ijide ụgbọ mmiri ahụ ị na-ese n’elu oke ikuku mmiri ahụ, mana n’ịtụ egwu ha kpọtere Jizọs, na-asị:

“Nna anyị ukwu, ị chọrọ ka anyị laa n’iyi?”5

“Onyenwe anyị, zọpụta anyị: anyị na-aga ịla n’iyi.”6

Ha kpọrọ Ya “Nna anyị ukwu,” nke ahụ bụ ihe Ọ bụ. Ọ bụkwa Jizọs Kraịst, Ọkpara Chineke, Nna nke eluigwe na ụwa, Onye-okike nke ihe nile site na mmalite.”7

Foto, oyiyi
Udo, dere duu

Site n’ebe Ọ nọ n’ime ugbọ mmiri ahụ, Jizọs bilitere wee baara ifufe ahụ mba ma sị oke osimiri ahụ na-eme mkpọtụ, “Udo, dere duu. Ifufe ahụ [kwụsịrị], ebe niile wee daa jụụ.”8 Dịka Onyeisi Nkuzi Mgbe niile, Jizọs gara nihu kụziere ndị na-eso ụzọ Ya ihe site n’ụzọ ajụjụ abụọ dị mfe ma nwee ịhụnaanya. Ọ jụrụ:

“Gịnị mere unu ji atụ oke egwu?”9

Ebee ka okwukwe unu nọ?”10

E nwere ihe eji bụrụ mmadụ, ọbụla ọnwụnwa, mgbe anyị hụtara onwe anyị n’ime nnwale, nsogbu, ma ọbụ mkpagbu itiku, “Nna anyị ukwu, ọ ga-amasị Gị anyị ịla n’iyi? Zọpụta m.” Ọbụladị Josef Smit rịọrọ arịrịọ site na ụlọ mkpọrọ ahụ dị egwu sị, “O CHINEKE, olee ebe ị nọ? Olee ebe ụlọ-ntu n’ekpuchita ebe nzuzo gị nọ?”11

O doro anya na, Onye Nzọpụta nke ụwa ghọtara adịghị ike nke anụ ahụ anyị, n’ihi na Ọ na-akuziri anyị otu anyị si enwe udo ma daa jụụ ọbụla mgbe ifufe na-efe nke ọjọọ na gburugburu anyị ma nnukwu ebili mmiri a na-eyi egwu imikpu olileanya anyị.

Maka ndị ahụ a maara okwukwe ha nke ọma, okwukwe dị ka nke ụmụntakịrị, ma ọbụlarịị okwukwe nke kachasị nta,12 Jizọs na-akpọku gị, na-asị: “Bịakwutenụ m.”13 “Kwerenụ na aha m.”14 Mụtanụ ihe gbasara m, ma gee ntị n’okwu m nile.”15 N’obi dị nro ka ọ na-akpọku na-asị, “Chegharịanụ ma [mee] baptizm n’aha m ,”16 “Hụrịtanụ onwe unu naanya; dị ka m siri hụ unu naanya,”17 ma “Na-echetanụ m mgbe niile.”18 Jizọs nyere mmasi obi ike, na-akọwa na: “Ihe niile ndị a ka m gwara unu, na site na m unu nwere ike inweta udo. Na ụwa unu ga enwe mkpagbu: ma na nwee nụ ańụrị; E-merie-la m ụwa”1

A na m eche na ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ n’ụgbọ ahụ ifufe mmiri na-ebugharị, dị ka a tụrụanya ya, nọrọ na-ele ka oke ebili mmiri ahụ si akụbata n’ala ụlọ nke ụgbọ mmiri ha ma ha a na-ekupụsị mmiri ahụ. A na m ahụta ha ka ha na-ejide eriri ya na agba mbọ eme ihe yiri njikwakata nke obere ụgbọ ha. Ebumnuuche ha bụ ịnya ndụ oge ahụ, ma ha jiri obi ọcha ha rịọ maka enyem aka.

Ọtụtụ n’ime anyị adịghị iche n’ụbọchị nke anyị a. Ihe ndị mere na nsonso a na gburugburu ụwa nakwa na mba anyị niile, ogbe niile na ezi na ụlọ niile e bokwasịwo anyị nnwale ndị anyị na-atụghị anya ha. N’oge ndị e nwere ọgbaaghara, enwere ike nwa okwukwe anyị ọnwụnwa ruo n’ebe ndidi na nghọta anyị apụghị ibuli. Ihe egwu na-abịakarị nwere ike imegharị anyị anya, mee anyị echefuo ịdịmma nke Chineke, wee si otu a mee ka ihe anyị na-atụanya ya belata ma pụọ n’uche anyị. Mana ọ bụkwa n’ọnọdụ ihe isi ike ndị a ka okwukwe anyị nwere ike iji nwee nnwale ma gbasiekwa ike.

Na-agbanyeghị otu ọnọdụ anyị siri dị, anyị nwere ike kpachara anya gbaa mbọ iwulite na ịmụba okwukwe anyị n’ime Jizọs Kraịst. Ọ na enwe mgbam ume mgbe anyị chetara na anyị bụ ụmụ Chineke na Ọ hụrụ anyị naanya. Okwukwe anyị ga-eto eto ma anyị jiri okwu Chineke rụọ ọrụ ma tinye olileanya na ịrụsi ọrụ ike nime ya, ma gbalịsie ike anyị i soro nkuzi nile nke Kraịst. Okwukwe anyị na-amụba mgbe anyị họọrọ ikwere karịa inwe obi abụọ, ịgbaghara karịa ikpe ikpe, ichegharị karịa inupụ isi. A na-asacha okwukwe anyị ya adị mma mgbe anyị jiri ndidi dabere n’ụgwọ ọrụ dị mma na ebere na amara nke Mesaya Dị Nsọ.20

“Ebe okwukwe a bụghị ịmazucha ihe niile nke ọma,” Okenye Neal A. Maxwell sịrị na, “ọ na-eweta ntụkwasị obi dị omimi na Chineke, onye ọmụma ihe ya zuru oke!”21 Ọbụla n’oge ọgbaaghara, okwukwe e nwere nime Kraịst siri ike ma ọ n’aghị anyụ anyụ. Ọ na-enyere anyị aka ayọchasị ihe mmegherị anya na-abaghị uru. Ọ na-agba anyị ume ịganiihu n’ụzọ nke ọgbụgbandụ ahụ. Okwukwe na-edu anyị imeri ịda mba ma nyere anyị aka izute ọdịniihu na mkpebi iguzosiike. Ọ na-akwalite anyị ịrịọ maka nzọpụta na enyem aka mgbe anyị kpere ekpere nye Nna nʼaha nke Ọkpara Ya. Mgbe ọ dị ka azaghị ihe ndị anyị rịọrọ na-ekpere, okwukwe anyị nke kwụrụ chịm n’ime Jizọs Kraịst na-eweta ndidi, umeala, na ike ikwu okwu ndị a na nsọpụrụ, “Ka e mee uche gị.”22

Onyeisi Russell M. Nelson akụziwo na:

“Anyị e kwesịghị ikwe ka ụjọ anyị merie okwukwe anyị. Anyị nwere ike imeri ụjọ ndị ahụ site n’ịkwadosị okwukwe anyị ike.

Jiri ụmụ gị bido. … Mee ka ha hụta okwukwe gị, ọbụla mgbe mnwale siri ike dakwasịrị gị. Mee ka okwukwe gị dabere n’elu Nna nke Eluigwe dị ịhụnaanya na Ọkpara Ọ Hụrụ naanya, Onyenwe anyị Jizọs Kraịst. … Kụziere nwata nwoke ma ọbụ nwata nwaanyị ọbụla dị anyị n’obi na ha bụ ụmụ Chineke, e kere na oyiyi Ya, ma nwee ebumnuuche dị nsọ na ike ime ihe dị mma. Onye ọbụla a mụrụ nwere ihe ndị chere ya aka mgba ọ ga-agabiga na okwukwe ọ ga-ewulite.”23

Na nso nso a ka m nụrụ ka ụmụaka abụọ gbara afọ anọ kọwapụtara okwukwe ha n’ime Jizọs Kraịst mgbe ha zara ajụjụ a “Kedụ otu Jizọs Kraịst na-esi enyere gị aka?” Nwata nke mbụ sịrị, Amaara m na Jizọs hụrụ m naanya n’ihi na Ọ nwụrụ maka m. Ọ hụkwara ndị toro eto naanya.” Nwata nke abụọ sịrị, Ọ na-enyere m aka mgbe obi na-adịghị m ụtọ ma ọbụ mgbe m nwere obi ọjọọ. Ọ na-enyekwara m aka mgbe m na-emi emi.”

Jizọs mara ọkwa, “Ya mere, onye ọbụla nke chegharịrị ma bịakwute m dị ka nwantakịrị, ya ka m ga-anabata n’ihi na alaeze Chineke bụ nke ndị dị otu a.”24

“N’ihi na Chineke hụrụ ụwa n’anya nke ukwuu nke na o nyere Ọkpara ọ mụrụ naanị ya, ka e wee ghara ibibi onye ọ bụla nke nwere okwukwe na ya, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”25

Na nso nso a, Onyeisi Nelson kwere nkwa “na ụjọ belatara ebelata na okwukwe bara ụbara ga-esote” mgbe anyị “malitere ọhụrụ ọzọ na-eziokwu ị nụ, ịńa ntị, ma chee ntị nke ọma na okwu nke Onye Nzọpụta.”26

Foto, oyiyi
Jizọs na-abịajụ oke osimiri

Ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, ọnọdụ aka mgba ndị chere anyị n’ihu ugbu a abụghị ebe ikpeazụ, ebighị ebi anyị na-aga. Dị ka ndị otú Nzukọ nsọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, anyị ewekwasịwo onwe anyị aha nke Kraịst site na ọgbụgba ndụ. Anyị nwere okwukwe nime ike nke mgbapụta Ya ma nwee olileanya nime nnukwu nkwa Ya niile dị oke ọnụ. Anyị nwere ihe niile iji ńụrịa ọńụ, n’ihi na Onyenwe anyị na Onye Nzọpụta anyị maara nke ọma nsogbu anyị niile, ihe ndị na-akpa anyị, na ihe ndị na-ewute anyị. Dị ka Jizọs si nọnyere ndị na-eso ụzọ Ya n’oge gara aga, Ọ nọ n’ụgbọ anyị! A na m agba ama na O nyefewo ndụ Ya ka mụ na gị ghara ịla n’iyi. Ka anyị nwee ike tụkwasị Ya obi, rube isi na iwu nsọ Ya niile, jiri okwukwe nụ ka Ọ na-asị, “Udo, dere duu.”27 Site na aha edoro nsọ na nke di nsọ nke Jịzọs Kraịst, amen

Bipụta