Ọgbakọ Zuru ọha
Obodo ndị Na-adịgide
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2020


Obodo ndị Na-adịgide

Ọ bụrụ n’anyị nile zuo ezuo, ma ndị agbataobi anyị ezuo ezuo n’igba mbọ ihazi ndụ anyị dịka otu eziokwu nke Chineke siri dị, ezi agwa niile nke achọsịrị ike na obodo ọbụla ga-abawanye.

Nkea bụ ọmarịcha otú abụ ndị na-abụ maka ọmarịcha Ọnye nzọpụta.

N’afọ 2015, Otú Mba Ụwa nabatara ịhe a kpọrọ “Atụmatụ afọ 2030 maka Mmepe obodo Na-adịgide.” A kọwara ya dịka “ntọala gbasara ụwa niile, maka udo na ịba ụba nke ndị mmadụ, na maka ụwa nke-a, ma ugbua nakwa ọdịniihu.” Ebumnuche Atụmatụ maka Mmepe obodo ruru 17 nke a chọrọ ịmezu n’afọ 2030, ha bụ enweghi ụbiam, enweghi agụrụ, agụmakwụkwọ bụ ịgba, oke na ne ị ha otu, miri dị ọcha na idobe ezi ọcha, ma rụ nwere ugwu.1

Ukpuru maka mmepe obodo n’adịgide bụ nke dị mma ma dịrịkwa oke mkpa. Tụmadị nke kacha mkpa, kosiladị, bụ ajụjụ ndị a n’ajụ maka obodo ndị ga-anọgide ruo ọdịnịhu. Kedụ ịhe ndị n’eme ka obodo baa ezi ụba, ịhe n’ewulite añụrị, ọganihu, udo, ịdị-mma n’etiti ndị bi n’ime ya? Anyị nwere ndekọta dị n’ime akwụkwọ-nsọ opekatampe maka obodo abụọ gbara ụdị mbọ a. Gịnị ka anyị ga-amụta n’aka ha?

Na gboo, nnukwu petrak ahụ na onye amụma Inọk kwusara oziọma nke eziomume ma “o wuru otu nnukwu obodo nke a kpọrọ, Nnukwu Obodo Dị nsọ, ọbụna Zayọn.”2 Edere na “Onyenwe anyị wee kpọọ ndị ya Zayọn, n’ihi na ha nwere otu obị na otu uche, ma biri n’ime ezi-omume; ma e nweghị ogbenye n’etiti ha.”3

“Ma Onyenwe anyị gọziri ala ahụ, e wee gọzie ha n’elu ugwu ukwu niile, na ebe niile dị elu, ha mere nke ọma.”4

Ndị agbụrụ ahụ bibụrụ na Western Hemisphere na gboo akpọrọ ndị Nifaị na ndị Laman bụkwa ndị ọmụmatụ ọzọ a maara nke ọma maka obodo nke n’enwe ọganihu. Mgbe Ọnye nzọpụta biliteworo n’ọnwụna ozi a na-ekwu maka ya o jere n’etiti ha, “ha biri ndụ nʼọnọdụ iwu-nsọ nke ha nataworo site nʼaka Onyenwe anyị Chineke ha, nọgide nʼobubu-ọnụ na ekpere, na nʼizukọ ugboro-ugboro ma nʼikpe ekpere ma nʼịnụ okwu nke Onyenwe anyị. …

“Ma e nweghị ntaji-anya, ma-ọbụ esemokwu, ma-ọbụ nnukwu ọgba-aghara, ma-ọbụ ịgba akwụna ma-ọbụ okwu-ụgha, ma-ọbụ igbu-mmadụ, ma-ọbụ ụdị ọchịchọ nke anụ-arụ ọbụla; ma nʼezie e nweghị ike inweta ndị nwere an̄ụrị karịa ndị ahụ nʼetiti ndị niile e keworo site nʼaka nke Chineke.”5

Obodo ndịa dị n’ime ọmụmatụ abụọ ndịa nwetere nkwado site na ngọzị nke eluigwe n’ihi ọmụmaatụ ha tinyere n’idobe iwu dị ukwu abụọ ndịa: “Ị ga-eji obi gi niile, jiri mkpụrụ-obi gi niile, ma jiri uche gi niile hụ Onyenwe gị Chineke gị nanya,” ma “ị g’ahụ onye agbatobi gị n’anya dịka onwe gị.”6 Ha rubeere Chineke isi n’ime ndụ nke onwe ha, ma ha tikọtara onwe ha aka, i gbo mkpa nke anụ-arụ na nke ime mmụọ ha. Dịka okwu ndị dị na Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile sịrị dị, ọbodo ndịa bụ nke “onye ọbụla na-achọ ọdịmma nke onye agbata-obi ya, ma na-eme ihe niile jiri anya lekwasị nani n’otuto nke Chineke.”7

Kama ọ dị mwute, dịka Okenye Quentin L. Cook kwuru nụtụtụ a, na ụdị obodo nke-a akọwara n’ime 4 Nifaị nke Akwụkwọ nke Mọmọn anọgideghi gafee afọ narị abụọ ya. Ọ dịghị mfe ị mee ka nlezi anya nke obodo dịgide, ma obodo n’eme nke ọma nwere ike ịda n’oge ọbụla m’ọbụrụ na ha hapụ ezi agwa ndị nke n’ebute udo na ọganịhu. Maka nke-a, mgbe ha rara onwe ha nyefee ọnwụnwa nke ekwensu, ndị mmadụ “malitere ikewasị nʼọkwa nʼọkwa; ma ha malitere iwu nzukọ-nsọ niile nye onwe ha inweta uru, ma malite ịgọnarị ezigbo nzukọ-nsọ nke Kraịst .”8

“O wee ruo na mgbe narị afọ atọ gafeworo, ma ndị Nifaị ma ndị Leman abụrụwo ndị ajọọ-omume karịa otu dịka ibe ya.”9

Mgbe afọ otu narị ọzọ bịara na njedebe, nde kuru nde mmadụ anwụwo n’ihi agha, ma obodo-ukwu ha nke-a dịbụ n’otu ka ewedatara ala wee bụrụ agbụrụ n’alụkọrịtara onwe ha ọgụ.

Mgbe ọbụla m chere maka nke-a, ya na ọmụmatụ obodo ndị ọzọ n’eme nke ọma, ndị nke mesịrị daa, echere m na ọ dị mma ikwu na mgbe ndị mmadụ hapụrụ ị nye Chineke nkọwa ndụ ha ma bido ịtụkwasị obi na “aka anụ arụ,” Nsogbu nọ nso. Ịtụkwasị obi na aka anụ arụ bụ ịgbasị nkịtị nye Odee ahụ dị nsọ, onye depụtara oké nile ma ugwu nile nke mmadụ ekere eke, ma nyefe oge anyị niile maka ịchọ ụba, ike, na otito nke ụwa (ma mgbe ahụ na-akwa emo ma na-emegide ndị ahụ sooro omume dị iche). Kosiladị, ndị ahụ bi n’obodo ndị na-adịgide na-achọ, dịka Eze Benjamin si kwuo i “to n’ọmụma nke ebube nke ya onye kere [ha], ma-ọbụ n’ọmụma nke ihe ndị ziri ezi na ezi-okwu.”10

Ezi na ulọ na okpukperechi bụ ihe ndị dị oke mkpa kemgbe maka itinye n’ime ndi mmadụ ma n’ime obodo, ezi agwa nke n’ewulite obodo ga-anogide. Ezi agwa ndịa gbara mgbọrọgwụ n’ime akwụkwọ nsọ bụ ịkwụwa aka ọtọ, ị nabata oké n’ọrụ, ị za ajụjụ, obi ọmịiko, alumalụ di na nwunye, ma mmekọrịta dị ọcha nke agbamakwụkwọ, nsọpụrụ nye onye ọzọ , ya na akụ onye ọzọ, ije ozi, na mkpa na ugwu dị n’ịrụ ọrụ, tinyekwara ndị ọzọ.

Onyeisi Edịtọ Gerard Baker dere otu ịhe na mbido afọ nkea n’ime Wall Street Journal iji kwanyere nna ya ugwu, Frederick Baker, na mmemme ncheta otu 100 afọ nna ya gbara. Baker tụpụtara na ịhe nwere ike ị me nna ya ji ebi ogologo ndụ mana ọ mesịrị tinyekwa uche nke a:

“N’ihi anyị niile g’achọ ị maa ihe enwere ike ị mee iji bie ogologo ndụ, a na m eche mgbe ụfọdụ na ọ ka anyị mma itinye oge ị mata ịhe enwere ike ịmee iji bie ndụ ọma n’ime oge ndụ ọbụla enyere anyị. Lee, obi kara m na amara m ihe nna m mere.

“A mụrụ ya n’oge mgbe ịhe ejiri mara ndụ bụ ịrụ ọrụ, n’abụghị nke enyere enye; oge onye ọbụla n’etinye aka imezi obodo, n’abụghị nke nanị ịhe otu onye g’erite. Ukpuru nke n’akwalite agwa n’oge ahụ bụ, ọnye ọbụla n’ime ha mara na ha jị ụgwọ—ha ji ezi na ụlọ, Chineke, na obodo ha.

“N’oge ihe jupụtara ya bụ ọtụtụ ezinụlọ ndị kewara ekewa, nna m bụ di hụrụ nwunye ọ lụrụ kemgbe afọ 46 n’anya, ezi nna nye ụmụ isii ya. Mgbe ọ kacha nọrọ anyị nso m’ọbụ dịrị anyị oke mkpa bụ mgbe nne na nna m n’eri uju n’ihi ọnwụ otu nwa ha. …

“Ma n’ime oge mgbe okpukperechi bụzi ịhe anakpọchaghị ịhe, nna m ebiwo ndụ dịka ezigbo onye Catholic kwesiri ike, onye nkwenye o nwere na nkwa niile nke Kraịst kwụụrụ chịm. N’ezie, mgbe ụfọdụ, a na m eche na obiri ogologo ndụ n’ihi akwadoro ya nke ọma karịa ọnye ọbụla m hụworo maka ị nabata ọnwụ ya.

“A bụwo m nwoke agọziri agọzi—agọziri site na ezi agụmakwụkwọ, ezinụlọ m dị mma, ọganịhụ nke ụwa nke m n’ekwesighị ịnwete. Mana n’agbanyeghi nganga na obi ekele m nwere, a gaghị eji ya ama atụ ya na nganga na obi ekele m nwere maka nwoke onye, n’emeghi oke mkpọtụ, n’achọghị ịhe nrite nke ya m’ọbụ ka ekelee ya, onye gawara n’ihu—kemgbe afọ narị ugbua—ị mee kwa ọrụ niile dịịrị ya, ị mezu oké ya niile ma, n’emesịa ị nwete ọñụ nke ibi ndụ eziomume.”11

Mkpa okpukperechi di, ya na mkpa okwukwe dị, agbadatawo n’ime ọtụtụ mba kemgbe afọ ole n’ole gara-aga. Ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ n’abawanye, ndị chere na nkwenye na Chineke adịzighị mkpa iji wulite ezi agwa n’ime ndụ mmadụ m’ọbụ n’ime obodo ndị dị na ụwa taa.12 Echere m na anyị niile ga-ekwekọrịta na ndịa na-ekwenyere na okpukperechi nwere ike, ma bụrụkwa ndị mmadụ nwere ezi agwa. Anyị agaghị ekweta, kosiladị, na ịhe a n’eme n’ihi akachukwu adịghị na ya. Ịhe m n’ekwu maka ya bụ ìhè nke Kraịst. Onye nzọpụta kwupụtara, “Ma na a bụ m ezi ìhè ahụ nke na-enye mmadụ niile na-abịa n’ime ụwa ìhè.”13 M’anyị ọ mara maka ya m’ọbụ anyị amaghị, nwoke na nwanyị ọbụla, ma nwata nke nkwenye ọbụla, nke ebe ọbụla, ma nke oge ọbụla nwere Ihé nke Kraịst n’ime ya, ma n’ihi nke-a ha nwere mmụọ n’agwa ha ịhe ziri ezi na nke ọjọọ.14

N’agbanyeghi nkea, mgbe ọbụla mmadụ kwuru na mkparamagwa dị mma esighi na iwu Chineke pụta, ọ n’egbujipụ ahịhịa site na mgbọrọgwụ ya. Ịdabere nani n’elu omenala ezughi oké imee ka ezi agwa dịgide na obodo. Mgbe mmadụ jiri onwe ya mere chi onwe ya ma chọwa nanị ịhe ndị n’enye ya ọñụ, ịhe ndapụta si na omume nke-a, ga apụta ihé nwantiti oge.

Obodo ọbụla n’ịmatụ, nke nanị ịhe ga-egbochi akwam iko bụ, ya bụrụ na onye ahụ achọghị, bụ obodo bidoro rewe ure. Akwam iko, ịgba n’ezi, na ịmụ ụmụ site na ime ọkwa,15 na ikpacha anya tee ime bụ ụfọdụ mkpụrụ ọjọọ nke n’etopụta site n’ime mmehie nke na akwaram-iko agharaghara. Ịhe ndị ndapụta ndị ọzọ nke n’emegide atụmatụ ịmezi obodo kọnọgide bụrụ obodo dị mma bụ, ọnụ ọgụgụ ụmụaka a na-azulite n’ime ụbịam ma n’ihi enweghi ndị nna g’enye ezi ọzụzụ, rụọ na ụmụ-ụmụ ha; nanị ndi iyom n’ebuzi ibu nke ekwesịrị ibukọta ọnụ; ma ụlọ-akwụkwọ ọtụtụ ịhe kọrọ ka ahapụziri nke-a, ka ha mejụpụtazie ịhe ndịa ahụ a n’emeteghi n’ezinụlọ.16 Ịhe ndị ọzọ agbakwụnyere n’ime ọrịa nkea dị n’obodo bụ mgbawa obi na obi ịlọ mmiri nke ụfọdụ ndị mmadụ n’enwe—mbibi nke uche na obi nke n’abịakwasịrị ndị mere mpụ ma tinyere ndị aka ha dịkwa ọcha.

Nifaị kwupụtara:

“Ahụhụ dịrị onye ahụ na-an̄a-ntị n’ozizi niile nke ndị mmadụ, ma gọnarị ike nke Chineke, na onyinye nke Mụọ Nsọ! …

“… Ahụhụ na-adịrị ndị niile n’ama jijiji, ma iwe na-ewe ha n’ihi ezi-okwu nke Chineke!”17

Nke dị iche na nke-a, ọzi ọñụ anyị nye ụmụaka anyị ma nye mmadụ niile bụ na “eziokwu nke Chineke” n’egosi ụzọ nke ka mma, m’ọbụ dịka Pọl kwuru, “ụzọ kachasị mma,”18ụzọ esi enwete ọñụ nke onwe, ma ịdị mma nke obodo ugbua ma nwete udo ebighi-ebi tinyekwa ọñụ n’ụwa n’abịa-abịa.

Eziokwu nke Chineke, bụ eziokwu ndịa ahụ nọ n’okpuru atụmatụ Ya nke añụrị Ọ nwere maka ụmụ Ya. Eziokwu ndịa bụ, na Chineke dị ndụ; na Ọ bụ Nna nke Igwe nke mmụọ anyị; na, dịka ịhe ngosipụta ịhụnanya Ya, Ọ nyewo anyị iwu niile nke n’edu ruo ị nwete ọñụ zuru oké n’ime Ya; na Jizọs Kraịst bụ Okpara nke Chineke, ma bụrụ Ọnye Mgbapụta anyị; na, Ọ tara ahụhụ, ma nwụọ, iji sachapụ mmehie anyị mọbụrụ n’anyị chegharịa; na Ọ biliri n’ọnwụ, iji kwee ka mmadụ niile nwete Mbilite n’ọnwụ; ma, n’anyị niile ga-eguzoro n’ihu Ya ka ekpe anyị ikpe, nke pụtara ị zaa ajụjụ maka ndụ anyị.19

Afọ itolu n’ime ịhe akpọrọ “ọchịchị nke ndị ikpe,” nime Akwụkwọ nke Mọmọn, onye amụma Alma rituru n’ọkwa ya dịka Onye isi ọka ikpe k’ọnye oge ya n’uju dịka onye isi Nzukọ-nsọ. Ebumnuche ya bụ ikwugide nganga, mmegide okwukwe, ma anya ukwu nke n’etolite n’etiti ndị mmadụ, ma tụmadị n’etiti ndị otú Nzụkọ-nsọ ahụ.20 Dịka Okenye Stephen D. Nadauld chọpụtara, “Mkpebi obi nke [Alma] abụghị iwepụtakwa oge ọzọ ị tụpụta iwu maọbụ hụ na ha doberịrị ha iji mee ka edozie agwa ndị ya, kama ọ bụ ka o kwuoro ha okwu nke Chineke, ikuzi ozizi ma ka nghọta ha nwere maka atụmatụ nke mgbapụta duru ha ịgbanwe agwa ha.”21

Enwere ọtụtụ ịhe anyị nwere ike ị mee dịka ndị agbata obi ma dịka ndị obodo iji sonye na ọganihu na ndịgide nke obodo anyị bi n’ime ya, ma n’ezie, ọrụ ije ozi dịkasị mkpa nke nọ anyị n’aka g’abụ ikuzi na ibi ndụ anyị dịka eziokwu ndị ahụ dị n’ime atụmatụ ukwu nke Chineke maka mgbapụta sịrị dị. Dịka ekwupụtara ya n’okwu niile nke abụ ahụ:

Okwukwe nke ndị nnanna anyị, anyị g’ahụ n’anya

Ma enyi, ma onye iro n’ime esemokwu anyị niile,

Ma kwusakwara gị okwuchukwu, dịka otu ịhụnanya siri mara,

Site n’okwu ebere ma ndụ eziomume.22

Ọ bụrụ n’anyị nile zuo ezuo, ma ndị agbata obi anyị nile ezuo ezuo n’ime mkpebi obi niile anyị ma chekwa ndụ anyị site n’eziokwu nke Chineke, ezi agwa niile nke achọsịrị ike na obodo ọbụla ga-abawanye.

N’ịhụnanya Ya, Nna anyị bi N’igwe nyere anyị Ọkpara Ya Ọ Mụrụ Nanị Ya Jizọs Kraịst, k’anyị wee nwe ndụ ebighị ebi.23

“[Jizọs Kraịst] anaghị eme ihe ọbụla ma ọbụghị na ọ ga-abara ụwa uru; n’ihi na ọ hụrụ ụwa n’anya, ọbụna na ọ tọgbọrọ ndụ nke ya ka o wee kpọta mmadụ niile n’ebe ọ nọ. Ya mere, onweghị onye ọbụla o nyere iwu ka ọ ghara iketa oke na nzọpụta ya.

“Lee, ọ na-akpọku onye ọbụla, na-asị: Si n’ebe m nọ pụọ? Lee, a sị m unu, Mba; mana ọ na-asị: Bịakwutenu m unu nsọtụ niile nke ụwa, zụrụ mmiri-ara ehi na mmanụ-an̄ụ, na-ejighi ego, na na-enweghị ọnụ ahịa.”24

Nkea k’anyị n’ekwupụta “n’obi nke ihe dị-mkpa, na mụọ nke ịdị nwayọ”25ma n’aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Hụba-ama

  1. See “The 17 Goals,” United Nations Department of Economic and Social Affairs website, sdgs.un.org/goals.

  2. Mozịs7:19.

  3. Mozịs7:18.

  4. Mozịs7:17.

  5. 4 Nifaị 1:12, 16.

  6. Matiu 22:37–39.

  7. Ozizi na ọgbụgba-ndụ niile 82:19.

  8. 4 Nịfaị 1:26.

  9. 1 Nịfaị 1:45.

  10. Mosaia 4:12.

  11. Gerard Baker, “A Man for All Seasons at 100,” Wall Street Journal, Feb. 21, 2020, wsj.com.

  12. See Ronald F. Inglehart, “Giving Up on God: The Global Decline of Religion,” Foreign Affairs, Sept./Oct. 2020, foreignaffairs.com; see also Christine Tamir, Aidan Connaughton, and Ariana Monique Salazar, “The Global God Divide,” Pew Research Center, July 20, 2020, especially infographic “Majorities in Emerging Economies Connect Belief in God and Morality,” pewresearch.org.

  13. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 93:2;lee kwa Moronai 7:16, 19

  14. See Boyd K. Packer, “The Light of Christ,” Liahona, Apr. 2005, 10; see also D. Todd Christofferson, “Truth Endures,” Religious Educator, vol. 19, no. 3 (2018), 6.

  15. In giving this example, I am speaking of potential adverse consequences to children as “bitter fruit” and not of the children themselves. Every child of God is precious, and every life has priceless value regardless of the circumstances of birth.

  16. See, for example, Pew Research Center, “The Changing Profile of Unmarried Parents,” Apr. 25, 2018, pewsocialtrends.org; Mindy E. Scott and others, “5 Ways Fathers Matter,” June 15, 2016, childtrends.org; and Robert Crosnoe and Elizabeth Wildsmith, “Nonmarital Fertility, Family Structure, and the Early School Achievement of Young Children from Different Race/Ethnic and Immigration Groups,” Applied Developmental Science, vol. 15, no. 3 (July–Sept. 2011), 156–70.

  17. 2 Nifaị 28:26, 28.

  18.  Ndị 1 Kọrịintị 12:31.

  19. Lee Alma 33:22.

  20. Lee Alma 4:6–19.

  21. Stephen D. Nadauld, Principles of Priesthood Leadership (1999), 13; see also Alma 31:5.

  22. “Faith of Our Fathers,” Hymns, no. 84.

  23. Lee Jọn 3:16.

  24. 2 Nifaị 26:24–25; lee kwa 2 Nifaị 26:33.

  25. Ozizi na Ọgbụgba-ndụ niile 100:7.