Ọgbakọ Zuru ọha
Ya mere Mụrụnụ anya, ma Kpee ekpere Mgbe niile
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2020


Ya mere Mụrụnụ anya, ma Kpee ekpere Mgbe niile

Taa, A na m akpọ ka ekpee ekpere karịrị nke ahụ maka ndị niile bi na mba ụwa ọbụla.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na nwanyị, n’izu-ụka ikpeazu nke ikwusa ozi ọma Ya n’ụwa, Jizọs kuziri ndị n’eso Ya ị “mụrụ anya, ma n’ekpe-ekpere mgbe niile,ka ị wee tozuo oké ị gbanarị ịhe niile ndị ahụ ga-abịa na mmezu, ma guzoro n’iru Nwa nke Mmadụ.”1

N’ime ịhe niile “ndị ga-abịa na mmezu” tupu Ọbịabịa nke Abụọ Ya bụ “agha niile na asịrị agha niile[,] … ụnwụ, ma ajọọ ọrịa, ma ala ọma jijiji, n’ebe dị iche iche.”2

N’ime Ozizi na Ọgbụgba ndụ niile, Onye nzọpụta kwuru, “Ma ihe niile ga-adị n’ọgba-aghara; … n’ihi na ụjọ ga-adakwasị mmadụ niile.”3

N’ezie, anyị bi ndụ n’oge mgbe ịhe niile nọ n’ime ọgbaghara. Ọtụtụ ndị mmadụ na-atụ ọdịnịhu ụjọọ, ma ọtụtụ obi echigharịwo pụọ n’okwukwe ha nwere n’ime Chineke ma n’ime Ọkpara Ya Jizọs Kraịst.

Ozi niile na-apụta ugbua jupụtara na akụkọ ọgbaghara. A na-ebuso ezi omume agha n’ikuku nke intanet. Ebe ili niile, nzukọ-nsọ niile, ụlọ ekpere ndị alakụba, ụlọ ekpere ndị juu, ma ịhụ arụsị niile ka a na-emebisi.

Ọrịa zuru-ụwa erusiwo nsọtụ ụwa niile—nde kwuru nde mmadụ ebutewo ọrịa ahụ, ihe karịrị otu deri ndị mmadụ anwụwo. Mmemme ntụrụgo ụmụakwụkwọ, ofufe niile nke nzụkọ nsọ, ije ozi nke mgbasa oziọma, ma ọtụtụ mmemme ndị ọzọ dịrị mmadụ mkpa ka akwụsịworo. Ọzọ kwa, ọtụtụ ndị mmadụ ka ahapụrụ ma ha anọrọ nanị ha.

Ịhe isi ike nke mkpata ego ebuteworo ọtụtụ ndị mmadụ nsọgbu, tụmadị ụmụ nke Chineke ndị nwere nnukwu adịghị ike nke ọrụ na ahụ isi ike.

Anyị a hụwo ndị mmadụ ka ha ji obi ha niile n’aga njegharị iwe nke udo, ma anyị ahuwokwa ndị igwé mmadụ iwe n’ewe n’eje ngagharị mmebisi ịhe.

N’otu oge ahụ, anyị ka na-ahụ ọtụtụ esemokwu gburugburu ụwa niile.

A na m eche mgbe ụfọdụ maka unu ndị ahụ na-ata ahụhụ, nchegbu, na-atụ ụjọ ma n’enwe mmetụta ma ọbụ nanị ha nọ. A na m agba onye ọbụla n’ime unu umee na Onyenwe anyị maara unu, ma Ọ maara maka nchegbu unu, obi mwute unu, ma Ọ hụrụ unu n’anya—n’otu n’otu, ịhụnanya nke dị ime ma dị ebighi ebi.

Abalị ọbụla mgbe m na-ekpe ekpere, A na m arịọ Onyenwe anyị ka ọ gọzie ndị niile bu ibu arụ nke iru uju, ufu, ị nọ nanị, na ọbi mwute. A ma m na ndị ndu Nzukọ nsọ ndị ọzọ n’ekpekwa ụdị ekpere nkea. Obi anyị, ma n’otu n’otu ma mgbe etikọtara ya ọnụ, na echeta unu, ma ekpere anyị niile n’ekpe banyere unu n’eru Chineke ntị.

N’afọ gara-aga, A nọrọ m ụbọchi ole n’ole na mpaghara northeast nke United States, n’eje eleta ebe niile metụtara akụkọ-ala nke Amerika na nke Nzukọ-nsọ, n’enwekọrịta ọgbakọ ole n’ole mụ na ndị mgbasa oziọma na ndị otú anyị, n’eje eletakwa ndị ndu ọchịchị-ala na ndị azumahịa.

N’ụbọchi Sọnde 20 nke ọnwa Oktoba, e kwuurum igwé mmadụ okwu ndị gbakọrọ n’akụkụ Boston Massachusetts. Dịka m na-ekwu okwu, ọ metụrụ m n’obi i kwu, “A na m arịọ unu … ka unu kpeere obodo anyị ekpere, kpeere ndị ndu anyị, ndị obodo anyị, ma ezinụlọ niile nke bi n’ime nnukwu obodo nkea achọtara site n’aka Chineke.”4

Ekwukwara m na Amerịka na ọtụtụ mba ụwa ndị ọzọ, dịka otu ọ dịbụrụ na mbụ, nọ n’etiti okporo ụzọ nke nsọgbu, ma ha chọsịrị ekpere anyị n’ike.5

Arịrịọ m nkea esọghị n’ime okwu m kwadoworo na m ga-ekwu. Okwu ndị ahụ bịara m n’obi mgbe mmetụta nke Mụọ kpaliri m ị kpoku ndị ahụ nọ ebe ahụ ka ha kpeere obodo ha na ndị ndu ha ekpere.

Taa, A na m akpọ ka ekpee ekpere karịrị nke ahụ maka ndị niile bi na mba ụwa ọbụla. N’agbanyeghi otu isi ekpe, m’ọbụ onye ị na-ekpere, biko jiri okwukwe gi—n’agbanyeghi ịhe okpukperechi gị bụ—ma kpeere obodo gị ma ndị n’achị ala gị ekpere. Dịka m kwuru n’ọnwa Oktoba gara-aga na Massachusetts, anyị guzoro taa n’etiti okporo ụzọ nsogbu kemgbe ụwa a bidoro, ma mba ụwa niile chọsịrị ike mkpali na odudu nke sị n’igwe. Nke a agbasaghị ndọrọ-ndọrọ ọchịchị m’ọbụ iwu. Nkea bụ maka udo na ọgwụgwọ nke nwere ike ịbịara mkpụrụ obi ọbụla, ma bịakwara mkpụrụ obi nke mba-ụwa ọbụla—nnukwu obodo ha, ndị nke mepere emepe, ma ndị n’emepeghi emepe—site n’aka Nwaeze nke Udo, onye ọgwụgwọ niile si n’aka ya, Onyenwe anyị Jizọs Kraịst.

Kemgbe ọnwa ole n’ole gara-aga, ọ n’emetụ m n’obi na ụzọ kacha mma iji nye aka n’ọnọdụ nkea ụwa nọ na ya, bụ ka mmadụ niile dabere karịa n’elu Chineke ma chigharia obi ha niile lekwasị Ya site n’ezi ekpere. Ị nwe obi umeala na ịchọ mkpali nke si n’igwe maka ịnagide m’ọbụ merie ịhe cheere anyị n’ihu ga-abụ ụzọ kacha izi ezi na nke nwere nchekwa eji aga n’ihu ma gafee oge nsogbu ndịa n’atụghi ụjọọ

Akwụkwọ nsọ n’egosipụta ekpere niile nke Jizọs kpere tinyekwa nkuzi Ya niile banyere ekpere n’oge nkwusa oziọma Ya n’ụwa. Ị ga echeta Ekpere nke Onyenwe anyị ahụ:

“Nna anyị nke bi n’elu-igwe, ka e doo aha gị nsọ.

“Ka Ala-eze gị bia “Ka e mee ọchịchọ gị n’ụwa dịka ọ dị n’elu-igwe.

“Nye anyị nrị taa nrị nke ụbọchị taa.

“Ma gbaghara anyị ụgwọ niile anyị ji, dịka anyị si na-agbaghara ndị ji anyị ụgwọ.

“Ma edubakwala anyị n’ime ọnwụnwa, kama zọpụta anyị n’aka ajọ ihe: N’ihi na nke gị ka ala-eze bụ, ma ike, ma otuto, ruo mgbe niile. Amen.”6

Ekpere ọma nkea, nkea ana-ekpekarị n’ime otú niile ndi n’eso Kraịst, mere ka o doo anya na ọ bụ ịhe ziri ezi i kpeere “Nna nke bi n’igwe” maka azịza banyere ihe n’enye anyị nsogbu. Ya mere k’anyị kpee ekpere maka odudu nke si n’igwe.

A na m akpoku anyị k’anyị kpee ekpere mgbe niile.7 Kpee ekpere maka ezinụlọ gị. Kpee ekpere maka ndị ndu mba niile. Kpee ekpere maka ndị ahụ nwere obisike ma nọrọ n’ihu agha maka ibuso ọrịa niile metụrụ obodo, ọchịchị, na ihe dị si n’ahụ nke metụtara mmadụ niile nke ụwa: ndị bara ọgaranya na ndị dara ogbenye, ndị dị nta na ndị okenye.

Onye nzọpụta kuziri na anyị aghaghị ịkpere onye ọbụla anyị chọrọ ị kpere ekpere. Ọ kwuru, “Hụ ndị iro unu n’anya, gọzie ha bụ ndị na-akọcha unu, na-emere ndị kpọrọ unu asị ihe ọma, ma na-ekpere ndị na-eji unu eme ihe nleda-anya ma na-esogbu unu ekpere.”8

N’elu obe nke Calvary, ebe Jizọs nwụrụ n’ihi mmehie anyị, ọ gosikwara ihe Ọ kuziri mgbe Ọ kpere, “Nna gbaghara ha; n’ihii ha amaghị ihe ha n’eme.”9

Iji obi dị ọcha kpeere ndị ahụ nwere ike ị bụ ndị iro anyị ekpre, n’egosipụta nkwenye anyị, na Chineke nwere ike ị gbanwe obi anyị niile na obi ndị ọzọ niile. Ụdị ekpere ahụ na-agba ume nye mkpebi obi nke anyị mere maka ị mee ịhe ọbụla dị mkpa n’ime ndụ anyị, n’ime ezinụlọ anyị ma n’ime obodo anyị niile.

N’agbanyeghi ebe i bi, asụsụ ị na-asụ, m’ọbụ mgba ọbụla cheere gị n’ihu, Chineke na-anụ ma na-aza ekpere niile gị n’ụzọ nke Ya ma n’oge nke Ya. N’ihi anyị bụ ụmụ Ya, anyị nwere ike ị bịakwute Ya maka enyemaka, nkasị obi, ma i nwogharị ọchịchọ obi anyị maka ị mee ọbụna otu ịhe dị mma n’ime ụwa nkea.

Ikpe ekpere maka ikpe ziri ezi, udo, ndị ogbenye, ndị ọrịa ezuchaghị oké. Mgbe anyị sekpuru ala n’ekpere, anyị kwesịkwara isi n’ikpere anyị bilie ma mee ịhe ọbụla anyị nwere ike ị mee iji nye aka—ị nyere ma onwe anyị ma ndị ọzọ aka.10

Akwụkwọ nsọ jupụtara n’ọmụmatụ nke ndị mmadụ nke okwukwe ndị tikọtara ekpere ya na ị mee ịhe anya n’ahụ, iji mee otu ịhe dị mma n’ime ndụ ha ma n’ime ndụ ndị ọzọ. N’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, iji maa atụ, anyị na-agụ maka Ịnọs. Ndị mmadụ ahuwo na “ọtụtụ ebe n’ime akwụkwọ nkea na-akọwa maka otu ekpere, m’ọbụ ọtụtụ ekpere, ma ịhe fọziri n’ebe ndị ọzọ n’ekwuzi maka ịhe ọ mere n’ihi ọsịsa niile nke ọ nwetere.”11

Anyị nwere ọtụtụ ọmụmatụ gosipụtara ụzọ ekpere jiri mee otu ịhe dị mma n’ime akụkọ mere eme nke Nzụkọ nsọ anyị, nke bidoro mgbe Joseph Smith kpepụtara ekpere mbụ n’ime ọdọ osisi nke nọ n’akụkụ ụlọ osisi nke nne na nna ya n’oge udummiri nke afọ 1820. Mgbe ọ nọ na-achọ mgbaghara na odudu nke ime mmụọ, ekpere Joseph meghere eluigwe niile. Taa, anyị bụ ndị na-erite uru dị n’ime ekpere nke Joseph Ọnye amụma nakwa ekpere Ndị nsọ ndị nwoke na nwanyị ndị kpere ekpere ma mee ịhe iji nye aka hiwe Nzukọ nke Jizọs Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a.

Mgbe ụfọdụ a na m eche maka ekpere niile nke ndị iyom kwụsịrị ike n’okwukwe, dịka Mary Fielding Smith, ọnye, jiri ike nke Chineke duo ezinụlọ ya site ma mmegide nke obodo Illinois bata n’ime nchekwa nke ndagwurugwu ebe ndị ezinụlọ ya nweteziri ọganirụ nke mụọ ma nke ụwa. Mgbe ọ kpesiworo ekpere n’ikpere ya, ọ rụsịrị ọrụ ike iji megide mnwale ya niile ma gọzịe ezinụlọ ya.

Ekpere ga-ebuli anyị ma mee k’anyị bịakọta ọnụ dịka mmadụ, dịka ndị ezinụlọ, dịka nzukọ nsọ, ma dịka ndị ụwa. Ekpere ga-akpali ndị sayensi ma nyere ha aka ịchọta ọgwụ mgbochi niile ma ọgwụ niile nke ga-akwụsị ọrịa nke zuru ụwa. Ekpere ga-akasị ndị ahụ onye ha nwụrụ obi. Ọ ga-eduru anyị ị mata ịhe anyị g’eme maka nchekwa nke onwe anyị.

Ụmụnne ndị nwoke na nwanyị; a na m arịọ unu ka unu bawanye na mkpebi unu nwere banyere ekpere. A na m arịọ unu ka unu kpee ekpere n’ime ime ụlọ unu, mgbe unu na-aga ije kwa ụbọchị, n’ime ebe obibi unu, n’ime ngalaba ụka unu, ma mgbe niile, n’ime obi unu niile.12

N’aha ndị ndu nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị Ikpeazụ a, anyị na-ekele unu maka ekpere unu n’ekpe maka anyị. A na m arịọ unu ka unu kpee ekpere k’anyị nwe ike ị nata mkpali nke mụọ na mkpughe maka ị du Nzukọ nsọ n’oge nsogbu ndịa.

Ekpere nwere ike ị gbanwo ndụ anyị niile. Ọ bụrụ na anyị kpee ezi ekpere, anyị nwere ike iwulite ma ị nyere ndị ọzọ aka ị mee kwa otu ahụ.

A ma m ike nke dị n’ekpere site na nhumụhe nke onwe m. Oge n’etebeghi aka, nanị m nọ n’ụlọ ọrụ m. Otebeghi aka ndị dọkịnta chawara m aka maka ị gwọ m ọrịa. Aka m dị ojii ma na-achakwa igwe igwe, ma ọ na-afụkwa m ụfụ. Dịka m nọdụ ala na tebụlụ m, enweghi m ike ị chee maka ịhe ndị dị oke mkpa n’ihi ụfụ nkem n’enwete.

Esekpuru m n’ala ma rịọ Onyenwe anyị maka enyemaka ị tinye obi m n’ọrụ ka m nwe ike mezuo ọrụ dịịrị m. E biliri m ọtọ ma laghachi n’akwụkwọ niile tọgbọrọ n’elu tebụlụ m. Na ntabi anya, uchem alaghachi ma ịhe niile doro m anya, ma m nwere ike mezuo ịhe niile dị mkpa cheerem n’ihu.

Ọgbaghara nke nọ n’ime ụwa taa nwere ike ịdịka ọ n’emegide anyị dịka anyị na-eche maka ọtụtụ ịhe nsogbu ndịa. Mana ọ bụ ịgba ama m nke dị nkọ na ọ bụrụ n’anyị kpee ekpere ma rịọ Nna nke Igwe maka ngọzị na odudu niile nke dịịrị anyị mkpa, anyị ga-abịa mara otu a g’esi agọzị ezinụlọ anyị, ndị agbatobi, ndị ọbodo ma ọbụna mba-ụwa niile nke anyị bi n’ime ya.

Onye nzọpụta kpere ekpere ma emesịa Ọ “gagharịrị ebe ọbụla n’eme ịhe ọma”13 site ị nye ndị ogbenye nri, ịgba ume ma kwado ndị ahụ nọ na mkpa, igosi ịhụnanya, ị gbaghara mmehie, ị nye udo, na ezumike nye ndị ahụ ga-abịakwute Ya. Ọ na-agakwa n’ihu n’esetịpụtara anyị aka ya.

A na m akpoku ndị otú Nzukọ nsọ niile, ma ndị agbatobi anyị ma ndị enyi ndị okpukperechi ndị ọzọ gburugburu ụwa, ka ha mee dịka Onye nzọpụta si kuziere ndị n’eso ya: “Ya mere Mụrụnụ anya, ma n’ekpe-ekpere mgbe niile”14maka udo, maka nkasị obi, maka nchekwa, maka ohere iji jekọrịtara onwe anyị ọzi.

N’ezie ọ bụ nnukwu ike dị na ekpere, ma taa ụwa chọsịrị ike ekpere anyị nke nwere okwukwe na Chineke ma n’ime Ọkpara Ya Ọ Hụrụ n’anya! K’anyị cheta ma nwe obi ekele n’ihi ike nke ekpere. Na aha nke Jizọs Kraịst, amen.

Bipụta