Ọgbakọ Zuru ọha
Chọọ Kraịst n’Echiche Niile
Ọgbakọ Zuru ọha Ọktoba 2020


Chọọ Kraịst n’Echiche Niile

Ibuso agha megide ọnwụnwa na-achọ irụsi ọrụ ike na ijupụta n’okwukwe. Ma biko mara na Onyenwe anyị dị njikere inyere anyị aka.

N’usoro ịbụ abụ otito ya, Ọbụ abụ kwupụtara:

“O Onyenwe anyị, i chọwo m, ma mata m.

“Ị marawo adịghị ike m na mbuli m, ị ghọtara echiche m site n’ebe dị anya.

“Ị na-edu ụzọ m na ebe ndina m, ma mara nke ọma ụzọ m niile.”1

N’ime usoro nghọta nke abụ a, Ọbụ abụ toro Jizọs Kraịst otito n’ihi ọ maara ihe niile n’ihi na n’ezie Ọ maara akụkụ niile nke mkpụrụ obi anyị.2 N’ịmara ihe niile dị anyị mkpa nke ndụ a, Onye Nzọpụta n’akpọku anyị ịchọ Ya n’ime echiche niile ma jiri obi anyị niile soro Ya.3 Nkea n’ekwe anyị nkwa ahụ na anyị nwere ike gaa ije n’ihé Ya ma na odudu Ya n’egbochi mmetụta nke ọchịchịrị n’ime ndụ anyị.4

Ịchọ Ya n’ime echiche niile na iji obi anyị niile soro Ya na-achọ ka anyị mezie mmụọ anyị na ọchịchọ anyị ịnọrọ n’ụzọ Ya.5 Akwụkwọ nsọ na-akpọ mmezi nkea dịka “iguzo[ro] chim n’ime Onyenwe anyị.”6 Ihe nkea pụtara na anyị ga-aganihu hazie ndụ anyị n’otu ụda ya na oziọma nke Jizọs Kraịst ma lekwasị anya kwa ụbọchị n’ihe niile nke dị mma.7 Nanị mgbe ahụ k’anyị ga enwe ike nata “udo nke Chineke, nke gafere nghọta niile” na nke ga “edebe obi anyị na mmụọ anyị site na” Kraịst Jizọs.8 Onye Nzọpụta n’onwe Ya nyere ndị okenye nke Nzukọ nsọ nọnwa Febụwarị afọ 1831, “Chekwaa ihe ndịa nile n’obi unu nile, ma kwe ka ịdị mkpa nile nke mgbe ebighi-ebi nọrọ n’uche unu niile.”9

N’agbanyeghị mgbalị anyị niile n’aganihu ịchọpụta Onyenwe anyị, echiche n’ekwesịghị ekwesị nwere ike bata n’ime uche anyị. Mgbe ekwere ụdị echiche ndịa ma ọbụma kpọbata ha ịnọrọ, ha nwere ike hazie ọchịchọ niile nke obi anyị ma duba anyị n’ihe anyị ga-abụ n’ụwa nkea ma n’ikpeazụ n’ihe anyị ga-erite na ebighị ebi.10 Okenye Neal A. Maxwell nwere oge o kwusịrị ike ụkpụrụ nkea site n’ikwu, “Ọchịchọ niile … ekpebi usoro nsonazụ niile, tinyekọta ihe kpatara ‘ọtụtụ ka akpọrọ, kama ole ma ole ka ahọọrọ.’”13

Ndị amụma mgbe gboo na nke ugbua echeteworo anyị mgbe niile iguzogide ọnwụnwa iji nwee ike gbanarịa ịda n’ụzọ ime mmụọ ma nwee mgbagwoju anya, nwee mgbaharị uche, na mmegharị anya na ndụ.

Ikwu n’ịma atụ, ịdaba n’ime ọnwụnwa dịka iji magnet n’aga nihu igwe. Ike magnet ahụghị anya na-adọrọ ihe igwe ahụ ma jigide ya n’ike. Ike magnet ahụ n’efu na ya nanị mgbe edowere ihe igwe ahụ n’ebe dị anya. Ya mere, dịka magnet ahụ enweghị ike ọbụla n’ebe igwe ahụ dị anya nọ, dịka anyị n’eguzogide ọnwụnwa, ọ n’efu n’ụzọ ma ike ya megide mmụọ na obi anyị akpọnwụọ ma, ya mere, na omume anyị.

Nkọwa nkea n’echetara m maka otu nhumihe nke onye otú nke Nzukọ nsọ jupụtara n’okwukwe kọọrọ m n’oge gara aga. Onye otu a gwara m na mgbe o tetara n’ụra otu ụtụtụ nnọọ, otu echiche n’adịghị mma ọ n’enwetụbeghị na mbụ ma ọlị n’amaghị ama batara ya n’ime obi. N’agbanyeghị na ọ bịara ya n’ịtụnanya kpam kpam, o mere ihe megide ọnọdụ ahụ na ntabi anya, n’ekwuru onwe ya ma echiche ahụ, “Mba!” ma were ihe dị mma dochie ya idupu uche ya pụọ site n’echiche ahụ n’adịghị mma. Ọ gwara m na dịka o tinyere ohere nhọrọ ya n’ọrụ n’ezi omume, mkpali ahụ n’adịghị mma, bịara n’echeghị eche pụrụ ngwa ngwa.

Mgbe Moronaị kpọkuru ndị mmadụ ikwere n’ime Kraịst na ichegharịa, ọ gbara ha ume iji obi ha niile bịakwute Onye Nzọpụta, wezuga site n’onwe ha ihe niile n’adịghị ọcha. N’ịga n’ihu, Moronaị kpọkuru ha ịrịọ Chineke, jiri mkpebi n’enweghị ịda mba, na ha agaghị adaba n’ime ọnwụnwa.14 Itinye ụkpụrụ ndịa niile n’ime ndụ anyị na-achọ karịa nanị ikwere; ọ na-achọ ibugharị mmụọ na obi anyị nye ụkpụrụ dị nsọ ndịa niile. Ụdịrị mbụgharị a na-achọ mgbalị nke onwe mgbe niile, na mgbakwunye na ndabere na Onye Nzọpụta, n’ihi echiche ndụ anyị anaghị apụ n’onwe ha. Ibuso agha megide ọnwụnwa na-achọ irụsi ọrụ ike na ijupụta n’okwukwe. Ma biko marakwa na Onyenwe anyị dị na njikere inyere anyị aka n’ime mgbali nke onwe anyị niile ma n’ekwe nkwa ngọzi pụrụiche mọbụrụ ma anyị nọgide rụọ ọgwụgwụ.

N’oge ihe isi ike gbara iche mgbe Joseph Smith na ndị nga ibe ya n’ime Liberty Jail enweghị nnwere onwe n’ihe ọbụla banyere echiche ha, Onyenwe anyị wetere ndụmọdụ na nkwa na-enye aka nye ha nke n’erutere anyị niile:

Ka afọ gị nile kwa jupụta na afọ-ọma ndị ikom [na ndị inyom], ma nye-ezi na ụlọ nke okwukwe, na ka ezigbo omume chọọ echiche gị nile mma n’agwụghi agwụ, mgbe ahụ ka nchekwube gị ga-esi ike karịa n’iru Chineke; …

Mmụọ Nsọ Ahụ ga-abụ onye nsiso gị mgbe niile, ma mkpanaka ahụ mkpanaka agbanweghị agbanwe nke ezi omume na eziokwu.13

Site n’ime otu a, echiche dị nsọ ga-ejupụta n’obi anyị ma ezi ọchịchọ ga-edu anyị ruo omume ziri ezi.

Moronaị chetekwaara ndị ya ka ha ghara ikwe oke ọchịchọ jupụta echiche ha.14 Mkpụrụ okwu ahụ oke ọchịchọ pụtara na ọchịchọ dị omimi na ọchịchọ nezighị ezi maka ihe ọbụla.15 Ọ n’achịkọta echiche ọjọọ ọbụla ma ọbụ ọchịchọ ọjọọ nke n’eme mmadụ lekwasị anya nanị maka ọdịmma onwe ya ma ọbụ akụ na ụba nke ụwa karịa ime ihe ọma, inwe ọbị ọma, idebe iwu nsọ nke Chineke na ndị ọzọ. A na ahụkarị ya mgbe ụfọdụ site na agụụ inwe mmekọ kachasị njọ nke mmụọ. Onye Ozi Pọl rụtụrụ aka n’ụfọdụ agụụ ndịa, dịka “adịghị ọcha, ọchịchọ nke anụ ahụ, … ikpọ asị, … iwe ọkụ, esem okwu, anya ụfụ, … na ụdị ndịa.”16 E wezuga akụkụ ọjọọ niile nke oke ọchịchọ, anyị agaghị echefu na onye iro n’eji ya dịka ngwa ọgụ nzuzo na nke aghụghọ megide anyị mgbe ọ na-anwa anyị ime ihe n’ezighị ezi.

Ezi ụmụnne m ndị nwoke na ndị nwanyị, a na m agba ama na dịka anyị na-adabere n’elu nkume nke nzọpụta, Onye Nzọpụta nke mkpụrụ obi anyị niile, ma soro ndụmọdụ nke Moronaị, ike anyị ịchịkọta echiche anyị ga-amụba nke ukwuu. A ga m amasi obi unu ike na uto ime mmụọ anyị ga-etolite n’ụzọ dị ukwuu, na agbanwe obi anyị, na-eme anyị dịka Jizọs Kraịst karịa. Na mgbakwunye, mmetụta nke Mmụọ Nsọ ga ejupụta karịa ma na-aganihu mgbe niile n’ime ndụ anyị. Mgbe ahụ ọnwụnwa nke onye iro, obere obere, ga ada mba n’ike ha megide anyị, nke ga-akpata ndụ jupụtara na ọńụ nwere ezi uche.

Maka ndị ahụ, n’ihi ihe ọbụla, dabara na ọnwụnwa ma n’ebi ndụ ajọ omume, a na m ekwe unu nkwa na enwere ụzọ ịlaghachị azụ, na enwere olile n’ime Kraịst. Afọ ole ma ole gara aga, e nwetere m ohere ileta ezigbo onye otu nke Nzukọ nsọ Ahụ nke Jizọs Kraịst nke Ndị nsọ Ụbọchị ikpeazụ a onye gabigara oge siri ike nke ukwuu na ndụ ya ka o mesiri otu ọkpụrụkpụ mmehie dị egwu. Mgbe m hụrụ ya na mbụ, ọ dịrị m mfe ihụta mwute n’anya ya, tinyere mmuke nke olile anya n’ihu ya. Nzipụta ihụ ya gosipụtara obi dị umeala na nke gbanwere agbanwe. Ọ bụrụwo Onye kwesịrị ike na Kraịst ma ọ natawo nnukwu ngọzi site n’aka Onyenwe anyị. Kosiladị, o kwewo otu mkpụrụ echiche nọchie uche ya, nke dubara na ndị ọzọ. Dịka ọ na-anọgidezi karịa ma na-ahapụ echiche ndị ahụ, mgbe n’eteghị anya ha gbara mgbọrọgwụ n’ime uche ya ma bido ito nke ukwuu n’ime obi ya. N’ikpeazụ o mezuru ajọ echiche ndị ahụ, nke dubara ya ime mkpebi megide ihe niile nke dịrị oke mkpa na ndụ ya. Ọ gwara m na ọbụrụ na o nyeghị echiche nzuzu ndị ahụ ohere na mbido, ọ garaghị adị mfe ịdaba nọnwụnwa nke onye iro—ọnwụnwa ndị nke wetere ọtụtụ mwute n’ime ndụ ya, opekampe na nwa oge.

N’ịdaba nke ọma, dịka nwa mmefu ahụ n’akụkọ amaara ama dị n’ime ozi ọma Luk, ọ ghọtara onwe ya ma teta n’ụra ọjọọ ahụ.17 O megharịrị ntụkwasị obi ya n’ime Onyenwe anyị ma nwete mmetụta ezi nchegharị ma nwee ọchịchọ ịlaghachị n’otu nke Onyenwe anyị n’ikpeazụ. Ụbọchị ahụ ịhụnanya mgbapụta nke Onye Nzọpụta nwere maka anyị metụrụ anyị abụọ. Na njedebe nleta anyị nke n’egbughị oge, mmetụta uche kpugidere anyị abụọ, ma ruo taa, echetere m ụdị ọńụ n’egbuke egbuke dị n’ihu ya mgbe ọ hapụrụ ụlọ ọrụ m.

Ezigbo ndị enyi m, mgbe anyị guzogidere obere ọnwụnwa, nke na-abịa na-atụghị anya na ndụ anyị, anyị dị na njikere ịgbanarị nnukwu mmehie jọrọ njọ nke ukwuu. Dịka Onye isi Spencer W. Kimball kwuru: “Mgbe ụfọdụ ka mmadụ na-adaba n’ime njehie miri emi n’abụghị ibu ụzọ daba n’ime ndị obere, nke na-emepere nke ukwu ụzọ. … Ala dị ọcha [anaghị] na ntabi anya [epu] ahịhịa ahịhịa.”18

Ka ọ na-akwado imezu ọrụ Ya dị nsọ n’elu ụwa, Onye Nzọpụta Jizọs Kraịst gosiri mkpa ọ dị ịnọgide mgbe niile n’ịgbanarị ihe niile nke nwere ike imegharị anyị n’ịmata ebunuche ebighị ebi anyị. Mgbe ọtụtụ agha n’adịghị ire si n’aka onye iro gasịrị, onye gbalịrị ibugharị uche Ya site n’ọrụ Ya, Onye Nzọpụta n’eze wara awa chụpụrụ ekwensu na-asị: “Sị ebe a pụọ, Setan. … Mgbe ahụ ekwensu hapụrụ ya, ma lee, ndị mmụọ ozi bịara ma zie ya ozi.”19

I nwere ike iche, ezi ụmụnne m ndi Nwoke na ndi Nwanyị, ihe nwere ike ime ma ọbụrụ na anyị nara ike na ume sitere na Onye Nzọpụta ma gwa echiche ndị n’ezighị ezi, “Mba” na “Sị ebe a pụọ” ozugbo ahụ ha batara anyị n’uche? Kedụ ihe ga-abụ mmetụ nke ọchịchọ ndị nke obi anyị? Olee otu omume anyị si edebe anyị nso n’ebe Onye Nzọpụta nọ ma kwe mmetụta n’aganihu nke Mmụọ Nsọ n’ime ndụ anyị? A ma m na site n’isoro ọmụmatụ nke Jizọs, anyị ga agbanarị ọtụtụ ọdachị na agwa ndị achọghị nke nwere ike ikpali nsogbu na ekweghị ekwe nke ezi na ụlọ, mmetụta na uche n’adịghị mma, n’ikpe ikpe n’ezighị ezi na mmegbu, bụrụ ohu nye agwa ọjọọ niile, na ihe ọbụla ọzọ nke nwere ike imegide iwu nsọ niile nke Onyenwe anyị.

N’ime ozi Eprel afọ a na-emetụ emetụ pụrụ iche, ezi onye amụma anyị, Onye isi Russell M. Nelson kwere nkwa na ndị niile dị njikere ị “nụrụ Ya”—nụrụ Jizọs Kraịst—ma rube isi nye iwu nsọ Ya niile “ka a ga eji ike ọzọ agbakwụnyere gọzie imegide ọnwụnwa, ndọlị, na adịghị ike” ma na ike anyị inwete mmetụ nke ọńụ ga-abawanye, ọbụna n’oge ọgbaghara nke ugbua na-abawanye abawanye.20

A na m agba ama na nkwa niile ezi onye amụma anyị nyere bụ nkwa ndị Onye Nzọpụta nyere n’Onwe Ya. A na m akpọku anyị niile ị “nụrụ Ya” n’ime echiche niile ma jiri obi anyị niile soro Ya iji nwee ike nwete ike na ume ị si, “Mba” na “Sị ebe a pụọ” n’ihe niile nke nwere ike iwete enweghị obi ụtọ n’ime ndụ anyị. Ọ bụrụ anyị emee otua, a na m ekwe nkwa na Onyenwe anyị ga ezite ike agbakwunyere nye Mmụọ Nsọ Ya ịgba anyị ume ma kasie anyị obi, ma anyị nwere ike bụrụzie ndị nọ n’obi nke Chineke.21

A na m agba aka ebe m na Jizọs Kraịst dị ndụ ma na site na Ya, anyị nwere ike merie mmetụta ọjọọ niile nke onye iro ma tozuo ibi ndụ ebighi ebi anyị na Onyenwe anyị na n’ihu Nna anyị Bi N’eluigwe anyị hụrụ n’anya. A na m agba ama eziokwu ndịa ma jiri ịhụnanya m nwere maka unu ma maka ọmarịcha Onye Nzọpụta anyị ,onye m n’enye aha ya otito, nsọpụrụ, na ịja mma. A na m ekwu ihe ndịa n’aha dị nsọ nke Jizọs Kraịst, amen.

Bipụta