Ọchịchọ nke anụ-arụ Hụ kwa Inwe mmetụta, Nke mmetụta Inwe agụụ na-ezighị-ezi siri ike maka ihe. Achọsila ịma-mma ya ike n’obi gị, Ilu 6:25. Onye ọbụla lekwasịrị nwanyị anya, inweso ya agụụ ọchịchọ nke anụ arụ, a kwaworị iko, Mat. 5:28 (3 Nif. 12:28). Ndịkom rere-ọkụ na-agụụ ọchịchọ nke anụ arụ n’arụ ibe ha, Ndị-Rom 1:27. Ha ga-ekpokwasi ndị-ozizi nye onwe ha dịka ọchịchọ nke anụ arụ ha siri dị, 2 Tim. 4:3–4. Leban hụrụ arịa anyị, ma nwee agụụ ibukọrọ ya, 1 Nif. 3:25. Kwụsị ịgaso ọchịchọ nile nke anụ arụ nke anya gị abụọ, Alma 39:3–4, 9. Onye ahụ nke na-ele nwanyị anya ka agụụ ya wee gụọ ya, ga-agọnarị okwukwe ahụ, OznỌd. 42:23. Kwụsị site n’ọchịchọ agụụ nile nke anụ arụ, OznỌd. 88:121.