Ndị Nne na Nna Hụ kwa Nna n’anwụ anwụ; Nne Ndị nna na nne nile. Ndị di na nwunye nile tozuru oke ndị a rachiworo nke ọma n’alụlụ di na nwunye n’ime temple nke Chineke nwere ike imezu ọrụ dịịrị ha dịka ndị nne na nna gazuo n’ebighi-ebi. Ụmụ na-erubere nụ ndị mụrụ unu isi, Ndị-Efe. 6:1–3 (Ndị-Kọl. 3:20). Adam na Iv bụụrụ nne na nna mbụ nke anyị, 1 Nif. 5:11. Ọbụbụ-ọnụ ahụ ga-abụ ihe a ga-aza n’isi ndị mụrụ unu, 2 Nif. 4:6. Kụziere nne na nna na ha garịrị echegharị ma na-aga eme ha baptism, Moro. 8:10. Ndị nne na nna ka e nyere iwu ka ha kụziere ụmụ ha ozi-ọma, OznỌd. 68:25. Ụmụ-ntakịrị nile nwere ihe ruru ha n’ebe nne na nna ha nọ, OznỌd. 83:4. A gaghị aza azịza mmehie nile nke ndị nne na nna n’elu isi nile nke ụmụ ha, Moses 6:54.