Anya-ukwu Hụ kwa Ntaji-anya Dịka e jiri ya n’akwụkwọ nsọ nile Ịnwe anya-ukwu bụ ịtajiri mmadụ anya ma-ọbụ inwebiga agụụ ihe oke. Gị enwela anya ukwu, Ọpụ. 20:17 (Deut. 5:21; Mosa. 13:24; OznỌd. 19:25). Onye nke na-akpọ anya-ukwu asị na-eme ka ụbọchị ya nile dị ogologo, Ilu 28:16. Ha wee tụkwasị anya-ukwu n’ubi ahụ nile ma wee nara ha n’ike, Maịka 2:2. Lezienụ anya ka unu ghara inwe anya-ukwu, Luk 12:15. Iwu ahụ kwuru, Gị enwela anya-ukwu, Ndị Rom 7:7. N’ụbọchị ndị ikpe-azụ ndị mmadụ ga-abụ ndị anya-ukwu, 2 Tim. 3:1–2. Mgbe Leban hụrụ arịa anyị, o wee nwee agụụ ibukọrọ ya, 1 Nif. 3:25. Ị gaghị enwe anya-ukwu n’ebe arịa gị nọ, OznỌd. 19:26. Kwụsị inwe anya-ukwu, OznỌd. 88:123. E nwela anya-ukwu na nke ahụ bụ nke nwanne gị, OznỌd. 136:20.