Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ndị-ikpe, Akwụkwọ nke


Ndị-ikpe, Akwụkwọ nke

Otu akwụkwọ di n’ime Testament Ochie. Akwụkwọ nke Ndị-ikpe gbasara ndị Israel site na ọnwụ nke Joshua ruo na ọmụmụ nke Samuel.

Isi nile nke 1–3 bụ mmalite nye akwụkwọ nke Ndị-ikpe. Ha na-akọwa sị n’ihi na ndị Israel a chụpụghị ndị-iro ha (Ndikp. 1:16–35), ndị Israel ga-atarịrị ahụhụ ihe ndị a butere: nfunarị nke okwukwe, alụlụ di na nwunye ha na ndị na-ekweghị ekwe, na ife arụsị. Isi nile nke 3–5 na-akọ uche Debora na Berak nwetara site n’ihe mere, ndị bụ ndị napụtara Israel site n’aka ndị Kenean. Isi nile nke 6–8 bụ uche na-akwalite okwukwe nke Gideon nwetara, onye nke Onye-nwe gọziri ka o napụta Israel site n’aka ndị Midian. N’isi nile nke 9–12 ọtụtụ ndịkom dị iche iche fere-ofufe dịka ndị-ikpe n’Israel, kachasịa n’ime igọnarị-okwukwe na okpuru ọchịchị aka ike. Isi nile nke 13–16 na-ekwu maka mbilite na ọdịda nke onye-ikpe nke ikpe-azụ, Samson. Isi nile nke ndị ikpe-azụ 17–21, ka e nwere ike ikọwa nke ọma dịka ihe mgbakwụnye nke na-ekpughe imi-emi nke mmehie nile nke Israel.

Bipụta