Doo-nsọ, Iwu nke Nnyefechasị Hụ kwa Ala-eze Chineke ma-ọbụ Ala-eze Elu-igwe; Usoro njikọta-ọnụ Inyefecha, Ime ka adị nsọ ma-ọbụ ịbụrụ onye ezi-omume. Iwu nke nnyefechasị bụ ụkpụrụ dị nsọ nke ndị nwoke na ndị nwanyị na-eji mkpebi uche onwe ha nyefechasịa oge ha, onyinye-chi nile nke ha na ihe onwunwe ha iji hiwe na iwulite ala-eze Chineke elu. Nyefechasịa nụ onwe unu taa n’aka Onye-nwe, Ọpụ. 32:29. Ndị nile kwere nwekoro ihe nile ọnụ, Ọlndoz. 2:44–45. ha nwekọtara ihe nile onu n’etiti ha, ya mere, enweghị ndị ọgaranya na ndị ogbenye, 4 Nif. 1:3. Onye-nwe wee kọwaa ụkpụrụ nile nke nnyefechasị arịa, OznỌd. 42:30–39 (OznỌd. 51:2–19; 58:35–36). Otu onye a gaghị enwe karịa onye-ọzọ, OznỌd. 49:20. Onye ọbụla ka e nyere oke ha-otu dịka ezi na ụlọ ya ha, OznỌd. 51:3. E hiwere usoro nke ga-eme ka ndị-nsọ hara-otu na nkwekọrịta nke ihe nile nke elu-igwe, na ihe nile nke ụwa, OznỌd. 78:4–5. Onye ọbụla ga-aha otu na nrite-uru nke nhazi dịka ọchịchọ ya na mkpa ya nile sịrị dị, OznỌd. 82:17–19. A ga-ewulite Zaiọn nanị site n’ụkpụrụ nile nke iwu Selestịal, OznỌd. 105:5. Ndị nke Inọk nwere otu obị na otu uche, na biri n’ime ezi-omume, na e nweghị ogbenye n’etiti ha, Moses 7:18.