Jisus Kraịst bụ nnukwu Onye-mgbapụta nke mmadụ n’ihi na ya, site n’aja mgbaghara mmehie ya, kwụrụ ụgwọ maka mmehie nile nke mmadụ ma mee ka o kwe omume bụ mbilite n’ọnwụ nke ndị mmadụ dum.
I ga-akpọ aha ya Jisus n’ihi na ya onwe ya ga-azọpụta ndị ya site na mmehie ha nile, Mat. 1:21 .
Ọkpara nke mmadụ bịara ka o were ndụ ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ, Mat. 20:28 (1 Tim. 2:5–6 ).
Onye-nwe Chineke nke Israel eletawo ma gbapụtawo kwa ndị ya, Luk 1:68 .
E mere ka anyị na Chineke dị na udo ọzọ site n’ọnwụ nke Ọkpara ya, Ndị-Rom 5:10 .
Jisus Kraịst nyere onwe ya n’ihi anyị, ka o wee gbapụta anyị site n’oke ajọọ omume nile, Taịtọs 2:13–14 .
Jisus Kraịst sachara anyị site na mmehie anyị nile n’ime ọbara ya, Mkpu. 1:5 .
Mgbapụta na-abịa n’ime na site na Mesaịa dị Nsọ, 2 Nif. 2:6–7, 26 .
Ọkpara ahụ ewerewo n’isi onwe ya ajọọ omume nile nke ndị mmadụ na njehie ha nile, gbapụta ha, ma metazuo ọchịchọ nile nke ikpe ziri-ezi, Mosa. 15:6–9, 18–27 .
Kraịst bịara ịgbapụta ndị a ga-eme baptism baa na nchegharị, Alma 9:26–27 .
Ọ ga-abịa n’ime ụwa ịgbapụta ndị ya, Alma 11:40–41 .
Mgbapụta na-abịa site na nchegharị, Alma 42:13–26 .
Jisus Kraịst bịara ịgbapụta ụwa, Hil. 5:9–12 .
Kraịst wee gbapụta mmadụ site n’ọnwụ nke anụ arụ na nke mụọ, Hil. 14:12–17 .
Mgbapụta na-esi na Kraịst bia, 3 Nif. 9:17 .
Abụ m onye ahụ a kwadoro site na ntọ-ala nke ụwa, Ita 3:14 .
Onye-nwe, onye mgbapụta gị tara ahụhụ n’anụ arụ, OznỌd. 18:11 .
Kraịst tara ahụhụ n’ihi mmadụ nile ma ọbụrụ na ha ga-echegharị, OznỌd. 19:1, 16–20 .
Ụmụ-ntakịrị abụrụwo ndị a gbapụtara site n’Ọkpara ahụ A Mụrụ Nanị Ya, OznỌd. 29:46 .
Ezipụwo m Ọkpara nke m Mụrụ Nanị Ya n’ime ụwa maka mgbapụta nke ụwa, OznỌd. 49:5 .
Kraịst bụ ìhè ahụ na Onye-mgbapụta nke ụwa, OznỌd. 93:8–9 .
Joseph F. Smith hụrụ n’ọ̀hụ́ mgbapụta nke ndị nwụrụ anwụ, OznỌd. 138 .