Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ala-eze Chineke ma-ọbụ Ala-eze Elu-igwe


Ala-eze Chineke ma-ọbụ Ala-eze Elu-igwe

Ala-eze nke Chineke n’elu ụwa bụ Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a (OznỌd. 65). Nzube nke Nzukọ-nsọ ahụ bụ ikwadobe ndị-otu ya nile ibi ndụ ruo mgbe nile n’ime ala-eze Selestịal ma-ọbụ ala-eze nke elu-igwe. Otu-o’sila-dị, akwụkwọ-nsọ nile oge-ụfọdụ na-akpọ Nzukọ-nsọ ala-eze nke elu-igwe, nke pụtara na Nzukọ-nsọ bụ ala-eze nke elu-igwe dị n’elu ụwa.

Nzukọ nke Jisus Kraịst nke Ndị-nsọ Ụbọchị-Ikpeazụ a bụ ala-eze Chineke n’elu ụwa, mana ugbua o jedebere na ala-eze nke nwere ikike n’ihe nile nke okpukpe-chi. N’oge Jisus ga-abịa chịa otu puku afọ, ala-eze nke Chineke ga-abụ ma nke ndọrọ-ndọrọ ọchịchị na nke nwere ikike n’ihe nile nke okpukpe-chi.

Bipụta