Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Ibu-ọnụ, Obubu-ọnụ


Ibu-ọnụ, Obubu-ọnụ

Ị kpachara anya hapụ iri ihe oriri ma-ọbụ ịn̄ụ ihe on̄un̄ụ n’ihi ime ka a bịa Chineke nso na rịọta ngọzi ya nile. Mgbe ndị mmadụ n’onwe ha na ọgbakọ nile na-ebu ọnụ, ha ga-kwa ekpe ekpere ka ha ghọta uche obi Chineke na nwe kwa ike ito eto karia n’ike nke mụọ. Ndị nile kwere ekwe n’ezie na-eme obubu-ọnụ oge nile.

N’ime Nzukọ-nsọ taa, otu ụbọchị izu-ike kwa ọnwa ka a na-edota iche n’ihi obubu-ọnụ. N’ime oge nke a, ndị otu Nzukọ-nsọ na-aga na-erighi nrị ma-ọbụ n̄ụọ mmiri ruo iri awa abụọ-na-anọ. Mgbe ahụ ha na-enye ego ahụ nke ha gaara emefu maka nri ahụ na ihe oriri ndị ahụ nile na Nzukọ-nsọ. Ego nke a ka a akpọrọ onyinye obubu-ọnụ. Nzukọ-nsọ na-eji onyinye ọbụbụ-ọnụ ahụ nyere ndị ogbenye na ndị chọrọ enyem-aka aka.