Ozi-ọma nile
Ndekọta akụkọ anọ ahụ ma-ọbụ ọgbụgba-ama nile nke ndụ Jisus n’arụ na-anwụ anwụ na ihe mere eme nile gbasara ije-ozị ya nke dị n’ime akwụkwọ anọ mbụ dị n’ime Testament Ọhụrụ. Ebe ndị dere ha bụ Matiu, Mak, Luk, na Jọn, ha bụ ndekọta aka-ebe nile nke ndụ Kraịst. Akwụkwọ nke 3 Nifaị n’ime Akwụkwọ nke Mọmọn dị kwa n’ọtụtụ ụzọ nile ka Ozi-ọma anọ ndị a nke Testament Ọhụrụ.
Akwụkwọ nile nke Testament Ọhụrụ ka e debuuru na asụsụ Grik. Okwu Grik maka ozi-ọma pụtara “akụkọ ọma.” Akụkọ ọma ahụ bụ na Jisus Kraịst achụwo aja mmehie nke ga-agbapụta mmadụ nile site n’ọnwụ na kwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka ọrụ ya nile siri dị (Jọn 3:16; Ndị-Rom 5:10–11; 2 Nif. 9:26; Alma 34:9; OznỌd. 76:69).
Nkwekọrịta nke ozi-ọma nile
E nwere ike itule ka nkuzi nile nke Onye Nzọpụta dị n’ime Matiu, Mak, Luk, na Jọn si yie otu na ibe ya na kwa mkpughe ụbọchị ikpe-azụ a n’ụzọ na-eso:
Nkwekọrịta nke ozi-ọma nile
Ihe-Omume |
Matiu |
Mak |
Luk |
Jọn |
Mkpughe Ụbọchị-Ikpeazụ |
---|---|---|---|---|---|
Akụkọ agbụrụ nile nke Jisus | |||||
Ọmụmụ nke Jọn ome baptism | |||||
Ọmụmụ nke Jisus |
1 Nif. 11:18–20; 2 Nif. 17:14; Mosa. 3:5–8; Alma 7:10; Hil. 14:5–12; 3 Nif. 1:4–22 | ||||
Ibu amụma nile nke Simeon na Ana | |||||
Ị ga-leta temple (Ngabiga) | |||||
Mmalite nke ije-ozị Jọn | |||||
Ime baptism nke Jisus | |||||
Ọnwụnwa nile nke Jisus | |||||
Testament nke Jọn ome baptism | |||||
Mmemme ọlụlụ di na nwunye dị na Kena (Ọlu ebube mbụ nke Jisus) | |||||
Ime ka temple dị ọcha nke mbụ | |||||
Nhụkọrịta nke Nikodemus | |||||
Nwanyị Samerịa nọ na wel | |||||
A jụrụ Jisus na Nazaret | |||||
Ndị na-akụ azụ ka a kpọrọ ịbụ ndị na-akụta mmadụ | |||||
Ọrụ-ebube nke azụ ijupụta n’ime ụgbụ e ji egbu azụ | |||||
I kulite nwa ada nwanyị Jairọs | |||||
Ọgwụgwọ nke nwanyị nwere oruru-ọbara | |||||
Ọkpụkpọ nke Iri na Abụọ ahụ | |||||
Nkulite nke nwa nwoke nke nwanyị di ya nwụrụ | |||||
Ite ụkwụ abụọ Kraịst mmanụ | |||||
Ime ka ebili-mmiri daa jụụ | |||||
Ọkpụkpọ nke Iri asaa ahụ | |||||
Ịchụpụ ìgwè ndị mụọ na-adịghị ọcha baa n’ime ìgwè ezi | |||||
Okwu Chukwu e kwuru n’elu Ugwu | |||||
Ịtụ-ilu nile nke Jisus bụ mkpirisi akụkọ nile nke na-atụle ihe dị iche n’etiti ihe efu, ma-ọbụ ihe omume nye ezi-okwu. Jisus jiri ha ọtụtụ mgbe iji kuzie ezi-okwu nile nke mụọ. | |||||
Ọ gha mkpụrụ: | |||||
Ata nile | |||||
Mkpụrụ osisi mustard | |||||
Ihe na-eko achịcha | |||||
Akụ dị n’ime ubi | |||||
Ọla pel nke oke ọnụ-ahịa | |||||
Ụgbụ onye ọkụ-azụ | |||||
Nna-nwe-ụlọ | |||||
Atụrụ furu-efu | |||||
Mkpụrụ-ego furu-efu | |||||
Nwa nwoke mmefu | |||||
Onye odibo na-enweghị obi ebere | |||||
Ezi Onye Sameria | |||||
Onye-ọrụ na-ezighị-ezi | |||||
Lazarọs na onye ọgaranya | |||||
Onye-ikpe na-ezighị-ezi | |||||
Ezi Onye-ọzụzụ atụrụ ọma | |||||
Ndị-ọrụ n’ime ubi-vine | |||||
Pound nile | |||||
Ụmụ ndị nwoke abụọ | |||||
Ndị ọrụ ubi ajọọ omume | |||||
Ọlụlụ nwunye nke nwa nwoke eze | |||||
Ụmụ agbọghọ iri na-amaghị nwoke | |||||
Talent nile | |||||
Atụrụ na ewu nile | |||||
Inye puku mmadụ ise ihe oriri | |||||
Jisus jere ije n’elu mmiri | |||||
Ịgba-ama nke Pịta maka Kraịst | |||||
E kwere Pịta nkwa ọtụghe-ụzọ nile nke ala-eze | |||||
Okwu Chukwu nke achịcha nke ndụ | |||||
Ịgwọ nwoke kpuru isi n’ụbọchị Sabat | |||||
Mnwọgharị; e nyefere ọtụghe-ụzọ nke ọkwa nchụ-aja | |||||
Ngọzi nke ụmụ-ntakịrị | |||||
Ekpere nke Onye-nwe-anyị | |||||
E weghachiri Lazarọs | |||||
Nbanye nke mmeri | |||||
A chụpụrụ ndị na-agbanwe ego site na temple | |||||
Onyinye nwanyị isimkpe | |||||
Okwu n’elu Ọbịbịa nke Ugboro Abụọ | |||||
Ọgwụgwọ nke ndị ekpenta iri | |||||
Oriri ngabiga nke ikpeazụ Jisus; e hiwere oriri-nsọ; ndụmọdụ e nyere Iri na Abụọ ahụ; ịsacha ụkwụ nke ndị na-eso ụzọ | |||||
Ahụhụ Jisus tara na Getsamane | |||||
Jisus bụ vine ahụ | |||||
Irara nye n’ụzọ aghụghọ nke Judas mere | |||||
Ịbịa zaa ikpe n’iru Kaiafas | |||||
Ịbịa zaa-ikpe n’iru Paịlat | |||||
Ịbịa zaa ikpe n’iru Herọd | |||||
A pịara Jisus ụtarị ma kwaa ya emo | |||||
Ịkpọgbu n’obe ahụ | |||||
Mbilite n’ọnwụ ahụ | |||||
Mpụta ìhè nke Jisus nye ndị na-eso ụzọ nile | |||||
Mpụta ìhè nke Jisus nye Tomas | |||||
Irigo n’elu |