Inye ndị-ọzọ mmata, nke ka nke banyere ezi-okwu nile nke ozi-ọma, na duzie ha ga n’ezi-omume. Ndị ahụ na-akụzi ozi-ọma ahụ kwesịrị ka Mụọ ahụ tụziere ha aka. Ndị nne na nna nile bụ ndị nkụzi nime etiti ezi na ụlọ nke aka ha. Ndị-nsọ kwesịrị ịchọ dịkwa na njikere ịnabata ntụzi-aka nile sitere n’aka Onye-nwe na ndị ndu ya nile.
Anyị matara n’Ị bụ onye ozizi sitere n’ebe Chineke nọ bịa, Jọn 3:2 .
Gị onye na-ezi mmadụ ibe gị ihe ị dịghị ezi onwe gị? Ndị-Rom 2:21 .
Akụziiri m ihe n’ụdị mmụta nke nna m, 1 Nif. 1:1 (Inọs 1:1 ).
Ndị nchụ-aja na ndị nkụzi ga-akụzirịrị ihe site na-ịrụsi ọrụ ike ma-ọbụ ha ga-aza mmehie nke ndị ahụ̀ n’isi nke onwe ha, Jekọb 1:18–19 .
N̄aa m ntị ma meghee ntị unu nile, Mosa. 2:9 .
Unu ga-akụziri ụmụ unu ịhụrịta onwe ha n’anya na ijerịtara onwe ha ozi, Mosa. 4:15 .
Atụkwasịla onye ọbụla obi ịbụ onye-nkụzi unu ma obụghị ma-ọbụ onye nke Chineke, Mosa. 23:14 .
Onye-nwe wụpụtara mụọ ya n’elu ihu nile nke ala ahụ ịkwado obi ha nile ịnabata okwu ahụ, Alma 16:16 .
Ha kụziri ihe jiri ike na ikike sitere na Chineke, Alma 17:2–3 .
A kụziworo ha site n’aka ndị nne ha nile, Alma 56:47 (Alma 57:21 ).
Ma ọ bụrụ na ha chọrọ amamihe a ga-akụziri ha, OznỌd. 1:26 .
Unu kụzikọrịtara onwe unu dịka ọkwa-ọrụ nke ahụ m nyere unu, OznỌd. 38:23 .
Kụzie ụkpụrụ nile nke ozi-ọma m, nke dị n’ime Bible na Akwụkwọ nke Mọmọn, OznỌd. 42:12 .
A ga-akụziri unu site n’elu, OznỌd. 43:15–16 .
Ndị nne na nna ga-akụziri ụmụ ha, OznỌd. 68:25–28 .
Unu ga-akụzi otu onye nye ibe ya ozizi ahụ nke ala-eze, OznỌd. 88:77–78, 118 .
Họpụta n’etiti unu onye-nkụzi, OznỌd. 88:122 .
Ị kụzirịghị ụmụ gị ìhè na ezi-okwu, ma nke a bụ ihe kpatara nsogbu gị nile, OznỌd. 93:39–42 .
Ọ bụghị unu onwe unu na-ekwu kama-ọbụ Mụọ ahụ na-ekwu n’ime unu, Mat. 10:19–20 .
Ọ bụ na obi anyị ekpoghị ọkụ n’ime anyị, mgbe ọ na-emeghere anyị akwụkwọ-nsọ nile? Luk 24:32 .
Ozi-ọma ahụ ka a na-ekwusa site n’ike nke Mụọ ahụ, 1 Ndị-Kọ 2:1–14 .