Amọn, nwa-nwoke nke Mosaịa Hụ kwa Mosaịa, Nwa-nwoke nke Benjamịn; Ndị Antai-Nifaị-Lihaị; Ụmụ ndịkom nke Mosaịa N’ime Akwụkwọ nke Mọmọn, nwa-nwoke nke Eze Mosaịa jere ozi igbasa-ozi-ọma; Onye mgbalịsike ya nyere aka ịgbanwe ọtụtụ mkpụrụ obi nye Kraịst. Ọ bụbuuru onye na-ekweghị-ekwe, onye chọrọ ka o bibie Nzukọ-nsọ, Mosa. 27:8–10, 34. Mụọ-ozi pụtara gosi ya onwe ya tinyere ndị òtù ya, Mosa. 27:11. O chegharịrị ma malite ikwusa Okwu Chineke, Mosa. 27:32–28:8. Ọ jụrụ ịkpọ ya eze ma kama ya a gaa n’ala ndị Leman ikwusa Okwu Chineke, Alma 17:6–9. Buo ọnụ ma kpee ekpere maka nduzi, Alma 17:8–11. E kere ya agbụ kpụgara ya Eze Lamonai, Alma 17:20–21. Ọ zọpụtara igwe ewu na atụrụ nile nke Lamonai, Alma 17:26–39. Kwusaa ozi-ọma nye Eze Lamonai, Alma 18:1–19:13. O kelere Chineke ma an̄ụrị karịkwara ya ike, Alma 19:14. Ndị nile ọ gbanwere a dapụghị, Alma 23:6. Nwere an̄ụrị na-ịbụ ngwa ọrụ n’aka nile nke Chineke na-ịkpọta ọtụtụ puku bịa n’ezi-okwu, Alma 26:1–8 (Alma 26:1–37). Duru ndị Antai-Nifaị-Lihai ruo na nchekwa, Alma 27. Nwere mmetụta an̄ụrị dị ukwuu mgbe o zutere ụmụnne ya, Alma 27:16–18.