Ime ka a dị mma ma-ọbụ arụ idịkwa ike ọzọ, na na arụ ana-ahụ anya na na nke mụọ. Akwụkwọ-nsọ nile nwere ọtụtụ ịma-atụ nile nke ọgwụgwọ ọrụ ebube nile nke Onye-nwe na ndị odibo ya nile.
Abụ m Onye-nwe nke na-eme ka arụ dị gị ike, Ọpụ. 15:26 .
Neaman wee sunye onwe ya n’ime Osimiri-Jọdan ugbo asaa ma e wee gwọọ ya, 2 Ndez. 5:1–14 .
N’uhiri nke ụtarị ya ka e jiri mee ka arụ anyị dị ike, Aịsa. 53:5 (Mosa. 14:3 ).
Anyanwụ nke ezi-omume ga-awa na-eji ọgwụgwọ na nku ya, Mal. 4:2 .
Jisus gwọrọ nrịrịa nile dị iche iche, Mat. 4:23 (Mat. 9:35 ).
O nyere ha ike ịgwọ nrịrịa nile dị iche iche, Mat. 10:1 .
O zitawo m ikwusa ọgwụgwọ ọrịa nye ndị nwere obi e tiwara etiwa, Luk 4:18 .
A gwọrọ ha site n’ike nke Nwa-atụrụ nke Chineke, 1 Nif. 11:31 .
Ọbụrụ na gị ekwere na mgbapụta nke Kraịst, e nwere ike ịgwọ gị, Alma 15:8 .
Ọ gwọrọ ha, onye ọbụla, 3 Nif. 17:9 .
Onye ahụ nke nwere okwukwe n’ime m na-a ga-agwọ ya, a ga-agwọ ya, OznỌd. 42:48 .
N’aha m ha ga-agwọ ndị ọrịa, OznỌd. 84:68 .