Owuwe-ihe-ubi Akwụkwọ nsọ nile oge ụfọdụ na-eji okwu ahụ owuwe-ihe-ubi n’ụdị iji tụnyere iwebata ndị mmadụ n’ime Nzukọ-nsọ nke bụ ala-eze Chineke n’elu ụwa ma-ọbụ ruo n’oge ikpe, dịka ọbịbịa nke ugboro abụọ nke Jisus Kraịst. Owuwe-ihe-ubi agabigawo, ọkọchị agwụsịwo, ma anyị onwe anyị azọpụtaghi anyị, Jer. 8:20 (OznỌd. 56:16). Owuwe-ihe-ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole, Mat. 9:37. Owuwe-ihe-ubi bụ ọgwụgwụ nke ụwa, Mat. 13:39. Mkpụrụ ọbụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-eweta n’ihe ubi, Ndị-Gal. 6:7–9 (OznỌd. 6:33). Ubi chara-acha na-echere owuwe-ihe-ubi, OznỌd. 4:4. Owuwe-ihe-ubu agwụsịwo, ma mkpụrụ-obi unu nile enwetaghị nzọpụta, OznỌd. 45:2. Oge owuwe-ihe-ubi a biawo, ma okwu m ka a ga-emezuriri, OznỌd. 101:64.