Ọchịchịrị nke Mụọ Hụ kwa Ajọọ, Ajọọ omume Ajọọ-omume ma-ọbụ amaghị-ama nke ihe nile nke mụọ. Ahụhụ na-adịrị ha bụ ndị na-etinye ọchịchịrị n’ọnọdụ ìhè, Aịsa. 5:20 (2 Nif. 15:20). Ọchịchịrị ga-ekpuchi ụwa, ma oke ọchịchịrị ga-ekpuchi ndị mmadụ ahụ, Aịsa. 60:2. Jisus ga-enye ha ìhè bụ ndị na-anọdụ n’ọchịchịrị, Luk 1:79. Ìhè ahụ na-amụke n’ime ọchịchịrị, ma na ọchịchịrị ahụ ejideghi kwa ya, Jọn 1:5 (OznỌd. 45:7). Yipụ ọrụ nile nke ọchịchịrị ma yiri ihe ize-ndụ nke ìhè, Ndị-Rom 13:12. Unu esola ọrụ nile nke ọchịchịrị na-amịghị mkpụrụ na-enwekọ ihe, Ndị-Efe. 5:8–11. N’ihi na unu ajụghị ajụjụ ewebataghị unu n’ime ìhè mana unu ga-alarịrị n’iyi n’ọchịchịrị, 2 Nif. 32:4. Setan na-agbasa ọrụ nile nke ọchịchịrị, Hil. 6:28–31. Ike nile nke ọchịchịrị na-emegide elu ụwa, OznỌd. 38:8, 11–12. Ụwa nile na-asụ ude n’okpuru ọchịchịrị na mmehie, OznỌd. 84:49–54. Ọbụrụ n’anya unu ga-elekwasị nanị n’otuto nke m, ọchịchịrị a gaghị adị n’ime unu, OznỌd. 88:67. Ọrụ nile nke ọchịchịrị malitere iwere ọnọdụ n’etiti ụmụ ndịkom nile nke mmadụ, Moses 5:55.