Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Daniel


Daniel

Onye bụ isi omume nke akwụkwọ nke Daniel n’ime Testament Ochie; Onye-amụma nke Chineke, na onye nwere nnukwu okwukwe.

Onweghị ihe a matara banyere ndị mụrụ ya, na-agbanyeghị na ọ pụtara ìhè dịka o si n’agbụrụ ndị eze (Dan. 1:3). A dọkpụụrụ ya n’agha gaa Babịlọn, ebe o nwetara aha Belteshaza (Dan. 1:6–7). Daniel na mmadụ atọ ọzọ a dọkpụụrụ n’agha ekwenyeghị eri nrị eze ahụ maka ihe gbasara okpukpe-chi (Dan. 1:8–16).

Daniel nwetara iru-ọma nke Nebukadneza na Darius site n’ike ịkọwa nrọ nile o nwere (Dan. 2;4). Ọ gụkwara na tụgharịa ihe aka dere na mgbidi (Dan. 5). Ndị iro ya gbara izuzu megide ya na wee tụba ya n’ime ọlụlụ ọdụm nile, mana Onye-nwe chekwara ndụ ya (Dan. 6).

Akwụkwọ Daniel

Akwụkwọ ahụ nwere nkewa abụọ. Isi nile nke 1–6 bụ akụkọ nile banyere Daniel na mmadụ atọ ahụ ya na ha so. Isi nile nke 7–12 bụ ọ̀hụ́ nile nke amụma nke Daniel hụrụ. Akwụkwọ ahụ na-akụzi mkpa ọ dị ịbụ ezi-okwu nye Chineke, ma na-esite na-ima atụ kọwaa na Onye-nwe na-agọzi ndị kwesịrị ntụkwasị obi.

Otu ntinye dị mkpa nke akwụkwọ ahụ bụ nkọwa nke nrọ Eze Nebukadneza. N’ime nrọ ahụ ala-eze nke Chineke n’ụbọchị ndị ikpe-azụ ka e zipụtara dịka otu nkume nke e bepụtara site n’otu nnukwu ugwu. Nkume ahụ ga-agbada gaa n’iru ruo mgbe o jupụtara ụwa nile (Dan. 2; hụ kwa OznỌd. 65:2).