Ịshmel, Nwa-nwoke nke Abraham Hụ kwa Abraham; Hega N’ime Testament Ochie, otu nwa-nwoke nke Abraham na Hega, odibo nwanyị Sera bụ onye Ijipt (Jen. 16:11–16). Onye-nwe kwere ma Abraham na Hega nkwa na Ịshmel ga-abụ nna nke otu mba dị ukwuu (Jen. 21:8–21). Ọgbụgba-ndụ ahụ sitere na Aịsak bịa kama Ịshmel, Jen. 17:19–21 (Ndị-Gal. 4:22–5:1). Chineke goziri Ịshmel na ọ ga-amụ nnukwu ọmụmụ, Jen. 17:20. Ịshmel nyere aka lie Abraham, Jen. 25:8–9. Ụmụ ndịkom iri na abụọ nke Ịshmel ka e nyere aha, Jen. 25:12–16. Ịshmel wee nwụọ, Jen. 25:17–18. Ịsọ kpọọrọ nwa Ịshmel nwanyị Mahalat ka ọ bụrụ nwunye ya, Jen. 28:9.