Enyemaka niile nke Ọmụmụ ihe
Buo Amụma, Ibu-amụma


Buo Amụma, Ibu-amụma

Ibu-amụma juputara na okwu nile na edemede nile nwere nkwalite mụọ dị nsọ, nke mmadụ na-anata site na mkpughe site na Mụọ Nsọ. Ọgbụgba-ama maka Jisus bụ mụọ nke ibu-amụma (Mkpu. 19:10). Ibu-amụma nwere ike ịgbasa mgbe gara-aga, ugbua, ma-ọbụ ọdịn’iru. Mgbe mmadụ na-ebu amụma, ọ na-ekwu ma-ọbụ dee ihe ahụ nke Chineke chọrọ ka ọ mara, maka ọ dị mma nke ya ma-ọbụ ọ dị mma nke ndị-ọzọ. Ndị mmadụ n’onwe ha nwere ike ịnata ìbu amụma ma-ọbụ mkpughe maka ndụ nke ha onwe ha.