Dịka e jiri ya n’ime akwụkwọ-nsọ nile, oge nile ụfọdụ ozi nke a nụrụ anụ nke Onye-nwe kwuru ma-ọbụ ndị oje-ozi ya nile. Olu-okwu nke Mụọ ahụ nwekwara ike ịbụ nke na-anaghị anụ anụ ma e duziri ya ụzọ n’ebe obi ma-ọbụ uche dị.
Ndị ezi-omume na-eso olu-okwu nke Onye-ọzụzụ-atụrụ ọma, Jọn 10:1–16 .
Onye ọbụla nke sitere n’ezi-okwu ahụ na-anụ olu okwu m, Jọn 18:37 .
Erubere m isi n’olu-okwu nke mụọ ahụ, 1 Nif. 4:6–18 .
O nwere olu-okwu bịaruru m, na-asị, Inọs, mmehie gị ka a gbagharaworo gị, Inọs 1:5 .
Ọ bụ olu-okwu dị nwayọ nke dị nwayọ zuru-oke, ma ọ dụpuru ọbụna ruo n’ime mkpụrụ-obi, Hil. 5:29–33 (3 Nif. 11:3–7 ).
Ma-ọbụ site n’olu-okwu nke m ma-ọbụ site n’olu-okwu nke ụmụ odibo m, ọ bụ otu ihe ahụ, OznỌd. 1:38 .
Ihe ọbụla ha ga-ekwu mgbe ha nwere nkwalite nke Mụọ Nsọ, ga-abụ olu-okwu nke Onye-nwe, OznỌd. 68:2–4 .
Mkpụrụ-obi ọbụla nke na-erube isi n’olu okwu m, ga-ahụ iru m ma mata na abụ m, OznỌd. 93:1 .