Ịdị n’out Hụ kwa Chineke, Chukwu Ị bụrụ otu n’echiche, ọchịchọ, na nzube, nke mbụ nye Nna anyị n’Elu-igwe na Jisus Kraịst, na mgbe ahụ nye Ndị-nsọ ndị ọzọ. Ọ dị mma bụ mbikọ nke ụmụnne ibikọ n’otu, Abụọma 133:1. Mụ onwe m na Nna m bụ otu, Jọn 10:30 (OznỌd. 50:43). Jisus kpere ekpere ka mmadụ nile bụrụ otu dịka ya na Nna ya bụ otu, Jọn 17:11–23 (3 Nif. 19:23). Ana m arịọ unu ka nkewa nile ghara ịdị n’etiti unu kama ka unu zuo oke na njikọ n’otu, 1 Ndị-Kọ 1:10. Nweenụ mkpebi n’otu uche na n’otu obi, dị n’otu n’ihe nile, 2 Nif. 1:21. Ndị-nsọ kwesịrị inwe obi ha nile e jikọtara ọnụ n’ịdị n’otu, Mosa. 18:21. Jisus kpere ekpere maka ịdị n’otu n’etiti ndị Nifaị na-eso ụzọ ya, 3 Nif. 19:23. Ndị na-eso ụzọ ahụ jikọtara onwe ha ọnụ na nnukwu ekpere na obubu-ọnụ, 3 Nif. 27:1. Nna ahụ, Ọkpara, na Mụọ Nsọ bụ otu, OznỌd. 20:27–28 (OznỌd. 35:2; 50:43). Ọ bụ ọrụ dịịrị gị ijikọta gị na ezi Nzukọ-nsọ, OznỌd. 23:7. Ihe ọbụla unu ga-arịọ n’okwukwe, jikọta onwe unu n’otu n’ekpere, unu ga-anata, OznỌd. 29:6. Ọbụrụ na unu abụghị otu unu abụghị kwa nke m, OznỌd. 38:27. Onye-nwe wee kpọọ ndị ya Zaịọn, n’ihi na ha nwere otu obị na otu uche, Moses 7:18.