Ime ka emume-nsọ nile e jiri ikike ọkwa nchụ-aja mee n’elu ụwa dịrị ire n’ime elu-igwe. A na-arachi emume-nsọ nile mgbe ha natara nnabata nke Mụọ Nsọ nke Nkwa nke bụ Mụọ Nsọ ahụ.
E nyere ha ike ịrachi ma n’elu-ụwa ma n’elu-igwe, OznỌd. 1:8 .
Ndị ahụ nọ n’ime ebube selestịal ka a rachiri site n’aka Mụọ Nsọ nke Nkwa, OznỌd. 76:50–70 .
Elaịja enyefee ọtụghe-ụzọ nile nke ike nrachi n’aka nile nke Joseph Smith, OznỌd. 110:13–16 .
Nke a bụ ike nrachi na nkedo ahụ, OznỌd. 128:14 .
Okwu amụma ahụ e mere ka o guzosiere anyị ike pụtara onye ahụ ịmara na-arachikọrọ ya nye ndụ ebighi-ebi, OznỌd. 131:5 .
Ọgbụgba-ndụ nile na-arachighị site na Mụọ Nsọ nke Nkwa nwere ọgwụgwụ mgbe ndị mmadụ nwụrụ ọnwụ, OznỌd. 132:7 .
Oke ọrụ a ga-arụ n’ime temple nile gụnyere irachi ndị bụ ụmụ nye ndị nile mụrụ ha, OznỌd. 138:47–48 .