Onye-isi Nduzi
Otu akara maka onye-ọrụ isi oche nke otu ọgbakọ. Onye-isi nduzi nke Nzukọ-nsọ bụ onye-amụma, ọhụ-ụzọ, na onye-mkpughe (OznỌd. 21:1; 107:91–92) na ndị òtù nke Nzukọ-nsọ ga-akpọ onye-amụma nke Nzukọ-nsọ n’akara ahụ “Onye-isi nduzi” (OznỌd. 107:65). Ọbụ ya bụ nanị onye nwere ikike n’elu ụwa iji ọtụghe-ụzọ nile nke ọkwa nchụ-aja ahụ rụọ ọrụ
Ndị-isi nile nke ọnụ-ọgụgụ-juru-aka nile nke ọkwa nchụ-aja na ọgbakọ nile ndị ọzọ nke Nzukọ-nsọ nwekwara ike inwe akara nke onye isi nduzi.