Ọnọdụ nke ịkwụsị ọgan’iru onye ma bụrụ onye egbochiri ụzọ ịba n’iru nke Chineke na otuto ya. Ọmụma ikpe ọkụ ala-mụọ dị na ogo dị iche iche. Ndị nile na-enwetaghị uju nke mbuli elu Selestịal ga-enwe njedebe n’ogo na ọgan’iru ha, na ohere ha nile, ma ha ga-enwe ọmụma ikpe ruo ogo ahu.
Ahụhụ ga-adịrị unu ndị-iru abụọ, unu ga-enwe oke ọmụma ikpe ọkụ ala mụọ nke kacha nụ, Mat. 23:14 .
Onye ahụ nke ga-ekwuhie Chineke megide Mụọ Nsọ nọ n’ihe egwu nke ọmụma ikpe ọkụ ala-mụọ ebighi-ebi, Mak 3:29 .
Ndị mere ihe na-adịghị mma ga-apụta na mbilite n’ọnwụ nke ọmụma ikpe ọkụ ala-mụọ, Jọn 5:29 (3 Nif. 26:5 ).
Onye na-eri ma na-an̄ụ n’etozughị-oke, na-eri ma na-an̄ụ ọmụma ikpe nye onwe ya, 1 Ndị-Kọ 11:29 (3 Nif. 18:28–29 ).
Onye ahụ nke na-agaghị echegharị, mee baptism, ma nọgide ruo n’ọgwụgwụ ga-enwerịrị ọmụma ikpe, 2 Nif. 9:24 (Mak 16:16 ; Ita 4:18 ; OznỌd. 68:9 ; 84:74 ).
Ndị ajọ mmadụ ga-anọ ọnọdụ nhuju anya ibinyere Chineke karia nke ha ga-anọ ibinyere mkpuru obi nile a mara ikpe n’ala mụọ, Mọm. 9:4 .
Onye ahụ nke na-anaghị eme ihe ọbụla ma ọbụghị ma enyere ya iwu, onye ahụ bụ onye a mara ikpe, OznỌd. 58:29 .
Onye ahụ nke nwetara uju nke ọgbụgba-ndụ ọhụrụ na mgbe nile na-adigide ga anogideriri n’iwu ahụ ma-ọbụ ọ ga-enwe ọmụma ikpe, OznỌd. 132:6 .