Ịkwado ndị ndu nile nke nzukọ Hụ kwa Nkwekọrịta zuru ọnụ Ikwe nkwa nkwado nye ndị ahụ na-eje ozi n’ọnọdụ ndị-isi nke ọha na nke mpaghara nta nke Nzukọ-nsọ. Guzo Joshua n’iru Nzukọ-nsọ ahụ nile, nyekwa ya iwu n’anya ha, Ọnọgụ. 27:18–19. Ndị mmadụ ahụ nile wee tie mkpụ, ma sị Chineke zọpụta eze ahụ, 1 Sam. 10:24. Kwere nụ na ndị amụma ya, ihe ga-agakwara unu nke-ọma, 2 Ihem. 20:20. Na-erube nụ isi nye ndị isi unu, Ndị-Hib. 13:17. Onye-nwe ga-agọzi gị n’ihi na ị tamughị, 1 Nif. 3:6. Ndị ahụ nabatara ndị amụma bụụrụ ndị e debere, 3 Nif. 10:12–13. Unu ga-an̄a ntị n’okwu nile nke Iri na Abụọ ndị a, 3 Nif. 12:1. Site n’olu nke m ma-ọbụ site n’olu nke ndị odibo m, ọ bụ otu ihe ahụ, OznỌd. 1:38. Okwu ya ka unu ga-anata dịka o si n’ọnụ nke m, OznỌd. 21:5. Onye ahụ nke nabatara ụmụ odibo m, nabatara m, OznỌd. 84:35–38. Onye ọbụla nabatara m, nabatara ndị ahụ bụ ndị m zipụworo, OznỌd. 112:20. Ọ bụrụ na ndị m egeghị ntị n’olu nke ndị nwoko ndị a ndị m họpụtara a gaghị a gọzi ha, OznỌd. 124:45–46.