Kee, Okike Hụ kwa Jisus Kraịst; Mmalite; Mụọ okike; Ụbọchị izu-ike; Ụwa Ihazi: Chineke sitere n’Ọkpara ya Jisus Kraịst rụọ ọrụ ịhazi ihe nile eji eme ihe n’ụdị okike iji kpụọ ụwa. Nna nke Elu-igwe na Jisus Kraịst kere mmadụ n’onyonyo nke ha (Moses 2:26–27). Na mmalite Chineke kere elu-igwe na ụwa, Jen. 1:1. Ka anyị mee mmadụ n’onyinyo anyị, Jen. 1:26 (Moses 2:26–27; Abr. 4:26). E mere ihe nile site n’aka ya, Jọn 1:3, 10. Site n’aka ya ka e kere ihe nile n’elu-igwe, Ndị-Kọl. 1:16 (Mosa. 3:8; Hil. 14:12). Chineke mere ụwa nile site n’aka Ọkpara ya, Ndị-Hib. 1:2. E kere mmadụ na mmalite, Mosa. 7:27. Ọbụ m kere elu-igwe nile na ụwa, na ihe nile, 3 Nif. 9:15 (Mọm. 9:11, 17). Mmadụ nile ka e kere na mmalite n’onyinyo nke m, Ita 3:15. Jisus Kraịst kere elu-igwe nile na ụwa, OznỌd. 14:9. O kere mmadụ nwoke na nwanyị n’onyinyo nke ya, OznỌd. 20:18. Ụwa nile na-enweghị ọnụ ọgụgụ ka m keworo, Moses 1:33. Site n’Onye nke m Mụrụ Nanị ya ka m kere elu-igwe, Moses 2:1. Mụ, Onye-nwe Chineke, kere ihe nile na mụọ tutu ha adiri n’ụdị okike ya, n’elu iru nke ụwa, Moses 3:5. Nde nile nke ụwa nile dị otu a agaaraghị abụ mmalite nke ọnụ ọgụgụ nke ihe nile i keworo, Moses 7:30. Chi nile ahụ wee hazie na kpụọ elu-igwe nile, Abr. 4:1.