Keleb
Otu n’ime ndị ahụ Moses zipụrụ inyocha ala Kenean n’ime afọ nke abụọ ọpụpụ gasịrị. Ya na Joshua nanị wetara mkpesa bụ ezi okwu banyere ala ahụ (Ọnọgụ. 13:6, 30; 14:6–38). Nanị ha n’ime ndị nile hapụrụ, Ijipt fọdụrụ ndụ n’ime Iri-afọ anọ ha nọrọ n’ime ọzara (Ọnọgụ. 26:65; 32:12; Deut. 1:36) ma wee baa na Kenean (Josh. 14:6–14; 15:13–19).